Lucas 4
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ọnwụnwa Jisọs
1Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọdan lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara. 2Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya.
3Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.”
4Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ”
5Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya. 6Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha. 7Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.”
8Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”
9Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala. 10Nʼihi na e dere ya,
“ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,
ichekwa gị nke ọma;
11ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha,
ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’”
12Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ”
13Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara.
Jisọs agaa Nazaret
14Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. 15O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya.
16Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. 17E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị,
18“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m,
nʼihi na o teela m mmanụ
ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye.
O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ,
ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì,
ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha.
19Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.”
20O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. 21Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.”
22Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?”
23Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ”
24Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. 25Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. 26Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. 27Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.”
28Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. 29Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. 30Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.
Jisọs achụpụ mmụọ ọjọọ
31O sitere nʼebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe. 32Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike.
33Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, 34“Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye Nazaret? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke Chineke!”
35Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ.
36Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!” 37Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu.
Jisọs agwọọ ọtụtụ ndị ọrịa
38Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ Saimọn. Nne nwunye Saimọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. 39O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa.
40Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute Jisọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha. 41Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke.” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ Kraịst.
42Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha. 43Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze Chineke nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.” 44Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na Judịa.
Você sabia?
Tentação e o Início do Ministério de Jesus
- Na sinagoga de Nazaré, sua cidade de criação, Jesus recebeu o rolo do profeta Isaías. Após desenrolá-lo e ler a passagem sobre anunciar boas-novas aos pobres e proclamar libertação aos cativos, enrolou-o de volta, entregou-o ao assistente e sentou-se para ensinar.Fontes: o próprio texto bíblico · Isaiah · Nazareth
- Para explicar a falta de fé dos habitantes de sua terra natal, Jesus lembrou que Elias fora enviado para socorrer uma viúva em Sarepta de Sidom em vez de viúvas em Israel, e que Eliseu curou Naamã, o sírio, em vez de leprosos israelitas.Fontes: o próprio texto bíblico · Elijah · Elisha · Naaman
- Após ser rejeitado e quase lançado do cume da colina em Nazaré, Jesus mudou-se para Cafarnaum, na Galileia, onde ensinava com autoridade no sábado, expulsava demônios e curou a sogra de Simão de uma febre alta.Fontes: o próprio texto bíblico · Capernaum · Galilee
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 1
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 9
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículos 14, 31
- Nazareth · 32.702, 35.298 · versículos 16, 34
- Sidon · Hoje: Sandikli archaeological site in Sidon · 33.561, 35.372 · versículo 26
- Zarephath · Hoje: Sarepta · 33.464, 35.295 · versículo 26
- Judea · Hoje: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículo 44
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org