Lucas 20
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ajụjụ banyere ike Jisọs nwere
1Otu ụbọchị, ka ọ nọ nʼụlọnsọ ukwu na-ezi ndị mmadụ ihe na-ekwusakwa oziọma. Ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye bịakwutere ya. 2Ha sịrị ya, “Gwa anyị, olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Onye nyekwara gị ikike a?”
3Ọ zara ha sị, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Gwanụ m, 4baptizim nke Jọn, o si nʼeluigwe ka o si nʼaka mmadụ?”
5Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị na o sitere nʼeluigwe, ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 6Ọ bụrụkwanụ na anyị asị na, ‘o sitere nʼaka mmadụ,’ ndị mmadụ ga-atụ anyị nkume, nʼihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.”
7Ya mere, ha zara, “Anyị amaghị ebe o si bịa.”
8Jisọs sịrị ha, “Enwekwaghị m ike ịgwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
Ilu maka ndị ọrụ ubi
9Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge. 10Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zigara otu nʼime ndị ohu ya ka ọ bịakwute ndị ahụ na-elekọtara ya ubi, ka ha nyekwa ya ụfọdụ nʼime mkpụrụ ubi vaịnị ahụ. Ma ndị na-elekọtara ya ubi jidere ya, tie ya ihe, zilaga ya nʼaka efu. 11O zigakwara ohu ya ọzọ. Ma ha tikwara ya ihe mee ya ihe ihere, zilakwaa ya nʼaka efu. 12O zigakwara onye nke atọ, ma ha merụrụ ya ahụ, chụlaa ya.
13“Mgbe ahụ, onyenwe ubi vaịnị ahụ sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme? Aga m ezigara ha ọkpara m, nke m hụrụ nʼanya, ma eleghị anya ha ga-asọpụrụ ya.’
14“Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ya, ha kwurịtara nʼetiti onwe ha, sị, ‘Onye a bụ onye nketa ihe niile a, ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a bụrụzia nke anyị.’ 15Ya mere, ha kpụfere ya nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya.
“Gịnị ka onye nwe ubi ahụ ga-eme ha? 16Ọ ga-abịa, laa ndị ahụ na-elekọta ubi ahụ nʼiyi, were ubi vaịnị ahụ nye ndị ọzọ.”
Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, ha sịrị, “Chineke ekwela.”
17O legidere ha anya sị, “Gịnịkwa ka unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ pụtara,
“ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ
aghọọla nkume nke isi ntọala ụlọ’ ?
18Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume ahụ, ka a ga-etiwasị, ma onye ọbụla ọ dakwasịrị, ka ọ ga-egwepịa.”
19Ndị ozizi iwu na ndịisi nchụaja chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya nʼotu oge ahụ nʼihi na ha matara na ọ bụ ha ka o bu nʼobi tụọ ilu ahụ, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ.
Ilu banyere ụtụ isi nye Siza
20Ya mere, ha chere ya nche nke ọma, ma zipụ ndị nnyopụta, ndị mere onwe ha dịka ndị ezi omume, ka ha chọpụta ma o nwere ụzọ ha ga-esi jide ya site nʼihe ọ ga-ekwu, ka ha site na nke a nyefee ya nʼaka ọchịchị na ike onyeisi ala. 21Ya mere ndị nnyopụta ahụ jụrụ ya sị, “Onye ozizi, anyị mara na i na-ekwu ma na-ezikwa ihe ziri ezi, matakwa na i dịghị ele mmadụ anya nʼihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke dị ka eziokwu si dị. 22O ziri ezi nʼiwu ka anyị tụọ ụtụ isi nye Siza, ka ọ bụ na o zighị ezi?”
23Ma ọ matara na nke a bụ ajụjụ aghụghọ, ya mere ọ sịrị ha, 24“Gosinụ m otu mkpụrụ ego denarị. Isi onye ka e sere nʼelu ya, aha onye ka e dekwasịkwara ya?”
Ha sịrị, “Ọ bụ nke Siza.”
25Ọ sịrị ha, “Ya mere, nyenụ Siza ihe bụ nke Siza, nyekwanụ Chineke ihe bụ nke Chineke.”
26Ha enweghị ike ijide ya nʼihi ihe o kwuru nʼebe ahụ, nʼihu ọha mmadụ. Ọsịsa ya juru ha anya, ha mechikwara ọnụ.
Mbilite nʼọnwụ na ọlụlụ di na nwunye
27Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị sị na mbilite nʼọnwụ adịghị, bịakwutere ya 28ma jụọ ya sị, “Onye ozizi, Mosis deere anyị na ọ bụrụ na nwanne nwoke mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwoke dị otu a ga-alụrụ nwunye nwanne ya nwoke ahụ, sị otu a, mụtara nwanne ya ụmụ. 29Ugbu a, e nwere ụmụnne nwoke asaa, onye nke mbụ lụrụ nwanyị, nwụọ na-amụtaghị nwa. 30Nke abụọ kwa 31na onye nke atọ lụrụkwara ya. Nʼotu aka ahụ ha asaa lụchara ya ma nwụọ na-amụtaghị nwa. 32Nʼikpeazụ nwanyị ahụ nʼonwe ya nwụkwara. 33Ya mere, nʼoge mbilite nʼọnwụ nwunye onye ka ọ ga-abụ? Nʼihi na ha asaa lụchara ya?”
34Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. 35Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. 36Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ. 37Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ 38Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.”
39Ụfọdụ ndị ozizi iwu zara ya sị, “Onye ozizi, ị kwuru nke ọma.” 40O nwekwaghị onye ọbụla jụrụ ya ajụjụ ọzọ.
Nwa onye ka Kraịst bụ?
41Ma ọ sịrị ha, “Olee otu ha si kwuo na Kraịst ahụ bụ nwa Devid? 42Devid nʼonwe ya kwupụtara nʼakwụkwọ Abụ Ọma, sị:
“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m,
“Nọdụ ala nʼaka nri m
43ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị
ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’
44Devid nʼonwe ya kpọrọ ya ‘Onyenwe anyị.’ Oleekwanụ otu o si bụrụ nwa ya?”
Ịdọ aka na ntị banyere ndị ozizi iwu
45Mgbe ndị mmadụ na-ege ntị, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya, 46“Kpacharanụ anya nʼebe ndị ozizi iwu nọ. Ndị iyi uwe mwụda na-ejegharị ebe niile na-amasị, ndị hụrụ ekele pụrụ iche bụ nke a na-ekele ha nʼọma ahịa nʼanya. Ndị ọ na-amasịkwa ịnọkwasị nʼoche kachasị elu nʼụlọ ekpere nakwa nʼoche pụrụ iche na mmemme oriri ọbụla. 47Ha na-eripịa ihe niile dị nʼụlọ ndị inyom ndị di ha nwụrụ anwụ, nʼekpe ogologo ekpere ka a hụta ha. Ndị dị otu a ka a ga-ata ahụhụ dị ukwuu.”

Você sabia?
Debates nos pátios do templo
- Quando lhe perguntam com que autoridade age, Jesus pergunta se o batismo de João vinha do céu ou dos homens. Os líderes não respondem: se disserem que vinha do céu, ele pode perguntar por que não creram nele; se disserem que vinha dos homens, temem que o povo os apedreje, pois a multidão está convencida de que João era profeta. O Easton's Bible Dictionary (1897) descreve João Batista como de linhagem sacerdotal — seu pai, Zacarias, sacerdote do turno de Abias, e sua mãe, Isabel, das filhas de Arão — e observa que a missão dele foi objeto de profecia.Fontes: o próprio texto bíblico · John the Baptist
- Alguns saduceus, que dizem não haver ressurreição, perguntam de quem seria esposa uma mulher se, como Moisés escreveu, sete irmãos a tivessem desposado, um após o outro, para suscitar descendência. Jesus aponta a passagem da sarça ardente, em que Moisés chama o Senhor de Deus de Abraão, Deus de Isaque e Deus de Jacó, e afirma que Deus é Deus dos vivos. O Easton's Bible Dictionary chama Abraão, filho de Terá, de pai de uma multidão; Isaque, de único filho de Abraão com Sara; e Jacó, também chamado Israel, de segundo gêmeo de Isaque e Rebeca, aquele que segue nos calcanhares de outro.Fontes: o próprio texto bíblico · Abraham · Isaac · Jacob (Israel)
- Jesus pergunta como o Cristo pode ser filho de Davi se o próprio Davi, no livro dos Salmos, o chama de Senhor. O Easton's Bible Dictionary identifica Davi como o oitavo e mais novo filho de Jessé, cidadão de Belém, que no início apascentava as ovelhas do pai nas terras altas de Judá.Fontes: o próprio texto bíblico · David
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org