Lucas 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ọmụmụ Jisọs
1Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum. 2(Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) 3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ.
4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha. 6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. 7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije.
Ndị ọzụzụ atụrụ na ndị Mmụọ Ozi
8Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. 9Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. 10Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. 11Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị. 12Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.”
13Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị,
14“Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe.
Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.”
15Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.”
16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri. 17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a. 18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya. 19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya. 20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.
21Mgbe ụbọchị asatọ gasịrị, mgbe oge ruru ibi nwata ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi nyere tupu a dị ime ya.
I kubata Jisọs nʼime ụlọnsọ
22Mgbe oge zuru maka mmemme nke ịdị ọcha dị ka iwu Mosis siri dị, ha kutere ya na Jerusalem iche ya nʼihu Onyenwe anyị 23(dịka e dere ya nʼiwu nke Onyenwe anyị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ nwoke ka a ga-edo nsọ nye Onyenwe anyị”), 24ha chụrụ aja dị ka e nyere nʼiwu Onyenwe anyị: “Ụmụ kpalakwukwu abụọ maọbụ ụmụ nduru abụọ.”
25Ma lee, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onye ezi omume bụrụkwa onye ji obi ya niile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya maka nkasiobi nke ndị Izrel. 26Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka ọ mata na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst nke Onyenwe anyị. 27Site nʼodudu nke Mmụọ Nsọ, ọ batara nʼụlọnsọ ukwu, ma mgbe nne na nna nwata ahụ bụ Jisọs kubatara ya dị ka omenaala iwu si dị, 28Simiọn kuuru ya nʼaka, kelee Chineke sị,
29“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa,
ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo.
30Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị,
31nke i kwadoro nʼihu mba niile.
32Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ,
na ebube nke ndị gị Izrel.”
33O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. 34Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. 35Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
36O nwekwara onye amụma nwanyị, aha ya bụ Ana, ada Fanuel nke si nʼebo Asha. Ọ bụ ezigbo agadi nwanyị na-enweghị di, nʼihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri naanị afọ asaa. 37Ọ nọọla dị ka nwanyị na-enweghị dị iri afọ asatọ na anọ. Ọ hapụghị ụlọnsọ, kama ọ nọgidere nʼefe ofufe ehihie na abalị, na-ibu ọnụ na-ekpe ekpere. 38Nʼoge ahụ ọ bịarutere nʼebe ha nọ, nye Chineke ekele, kwuo okwu banyere nwantakịrị ahụ nye ndị niile na-ele anya maka mgbapụta Jerusalem.
39Mgbe ha mesịrị ihe niile otu ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị, ha laghachiri obodo ha bụ Nazaret nke dị nʼime Galili. 40Ma nwata ahụ toro bụrụ onye dị ike; o jupụtara nʼamamihe, amara Chineke dịnyekwaara ya.
Jisọs agaa nʼụlọnsọ ukwuu
41Nʼafọ niile, ndị mụrụ ya na-aga Jerusalem nʼihi Mmemme Ngabiga. 42Mgbe o ruru afọ iri na abụọ, ha gara maka mmemme dị ka omenaala si dị. 43Mgbe e mesịrị mmemme ahụ, ka ndị mụrụ ya na-alaghachi, nwata ahụ bụ Jisọs nọdụrụ na Jerusalem. Ndị ha amataghị na o soghị ha na-alọta. 44Ha chere na o sonyere nʼetiti njem. Ha gara ije otu ụbọchị tupu ha a malite ịchọ ya nʼetiti ndị ikwu na ibe, na ndị enyi ha. 45Ma mgbe ha na-ahụghị ya, ha laghachiri Jerusalem na-achọkwa ya. 46Ka ụbọchị atọ gasịrị, ha hụrụ ya nʼụlọnsọ ukwu ebe ọ nọdụrụ nʼetiti ndị ode akwụkwọ, na-ege ha ntị na-ajụkwa ha ajụjụ. 47Nghọta na ọsịsa ya juru ndị niile nụrụ okwu ya anya. 48Mgbe ndị mụrụ ya hụrụ ya, ọ tụrụ ha nʼanya, ma nne ya sịrị ya, “Nwa m, gịnị mere i ji mesoo anyị mmeso dị otu a? Mụ na nna gị nọ na-achọgharị gị?”
49Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-achọ m? Unu amaghị na aghaghị m ịnọ nʼụlọ Nna m?” 50Ma ha aghọtaghị ihe ọ gwara ha.
51Mgbe ahụ, o sooro ha laghachi Nazaret ma na-erubekwara ha isi. Ma nne ya dobere ihe ndị a niile nʼobi ya. 52Jisọs na-aga nʼihu nʼamamihe na ogologo, ya na ihuọma nʼebe Chineke na nke mmadụ nọ.

Você sabia?
O nascimento e os primeiros anos de Jesus
- Lucas situa o nascimento de Jesus na época de um decreto de César Augusto para que se fizesse um recenseamento de todo o império. Augusto era o cognome do primeiro imperador romano, C. Júlio César Otaviano; o título, que significa “majestade” ou “venerável”, foi dado primeiro pelo senado. Lucas chama esse o primeiro recenseamento feito enquanto Quirino era governador da Síria — Cirênio é a forma grega de Públio Sulpício Quirino.Fontes: o próprio texto bíblico · Augustus · Cyrenius
- José morava em Nazaré, na Galileia, e de lá subiu à Judeia, a Belém, a cidade de Davi, porque pertencia à casa e à linhagem de Davi. Belém fica na região montanhosa de Judá e era a própria cidade de Davi: Davi, o oitavo e mais novo filho de Jessé, era cidadão de Belém. Maria, prometida em casamento a José e à espera de um filho, viajou com ele para se registrar.Fontes: o próprio texto bíblico · Joseph (Mary's Husband) · Bethlehem · David
- Quando se completou o tempo da purificação exigido pela Lei de Moisés, os pais levaram o menino a Jerusalém para apresentá-lo ao Senhor, oferecendo um par de rolas ou dois pombinhos. No templo encontraram Simeão e Ana, uma profetisa, filha de Fanuel, da tribo de Aser. Ela tinha sido casada durante sete anos e depois ficou viúva até os oitenta e quatro anos, e nunca deixava o templo, adorando noite e dia, em jejum e oração.Fontes: o próprio texto bíblico · Anna
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Syria · Hoje: Syria 2 · 33.511, 36.306 · versículo 2
- Bethlehem · 31.704, 35.208 · versículos 4, 11, 15
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículos 4, 39
- Judea · Hoje: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículo 4
- Nazareth · 32.702, 35.298 · versículos 4, 39, 43, 51
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 22, 25, 38, 41, 42, 43, 45
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org