Lucas 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Chegharịa maọbụ laa nʼiyi
1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ. 2Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile? 3Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi. 4Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem? 5Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.”
6Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla. 7Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’
8“Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu. 9Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ”
Ọgwụgwọ onye ọrịa nʼụbọchị izuike
10Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. 11Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. 12Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” 13Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke.
14Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.”
15Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? 16O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?”
17Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ.
Ilu mkpụrụ mọstaadị na ihe na-eko achịcha
18Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
20Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? 21Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.”
Ụzọ dị warawara
22O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. 23Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?”
Ọ sịrị ha, 24“Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. 25Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’
“Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’
26“Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’
27“Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’
28“Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. 29Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke. 30Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.”
Mwute Jisọs nwere nʼihi Jerusalem
31Nʼoge awa ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya sị ya, “Si nʼebe a pụọ, nʼihi na Herọd na-achọ igbu gị.”
32Ọ sịrị ha, “Gaa gwaranụ m nkịta ọhịa ahụ, lee, ana m achụpụ mmụọ ọjọọ, gwọọkwa ndị ọrịa taa na echi, ma nʼụbọchị nke atọ ka m ga-arụcha ọrụ m. 33Ma otu ọ dị, aga m aga nʼihu nʼụzọ m taa, na echi na nwanne echi, nʼihi na nʼezie, ọ dịghị onye amụma ga-anwụ nʼebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.
34“O Jerusalem! Jerusalem! Gị onye na-egbu ndị amụma ma na-ejikwa nkume atụgbu ndị e ziteere gị. Ọtụtụ mgbe ka m gbalịrị ịchịkọta ụmụ gị dị ka nne ọkụkụ sị achịkọta ụmụ ya nʼokpuru nku ya, ma unu ekweghị. 35Lee, a hapụrụla unu ụlọ unu. Ma agwa m unu, unu agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe oge ahụ ga-abịa, mgbe unu ga-asị, ‘Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.’ ”

Você sabia?
Arrependimento no caminho de Jerusalém
- Pôncio Pilatos foi o sexto procurador romano da Judeia, de 26 a 36 d.C. Sua sede ficava em Cesareia, embora ele subisse com frequência a Jerusalém. Lucas 13 começa com a notícia de que ele havia misturado o sangue de alguns galileus com os sacrifícios deles; Jesus responde que isso não mostra que fossem piores pecadores do que os outros galileus e que, se os ouvintes não se arrependerem, também todos perecerão.Fontes: Pontius Pilate · o próprio texto bíblico
- Jesus pergunta também se os dezoito que morreram quando a torre de Siloé desabou eram mais pecadores do que todos os outros habitantes de Jerusalém, e de novo diz que, se os ouvintes não se arrependerem, também todos perecerão. Siloé, que significa “enviado” ou “envio”, tem sido identificado com o Birket Silwan, no baixo vale do Tiropeão, a sudeste da colina de Sião. A água chega a esse tanque de forma intermitente por um canal subterrâneo sinuoso que vem da Fonte da Virgem, e o Evangelho de João registra que Jesus deu a visão a um cego ali.Fontes: Siloam · o próprio texto bíblico
- Enquanto percorre as cidades e aldeias em direção a Jerusalém, Jesus lamenta a cidade que mata os profetas e apedreja os que lhe são enviados. Ela é descrita como uma cidade de montanha assentada numa fortaleza; seu nome, na forma dual, significa “possessão de paz” ou “fundação de paz”, referindo-se provavelmente a Sião e Moriá, os dois montes sobre os quais foi construída, ou, como alguns supõem, à cidade alta e à cidade baixa. Ele diz que muitas vezes quis reunir os filhos dela como a galinha reúne os pintinhos debaixo das asas, e o Easton's Bible Dictionary (1897) observa que essa ave familiar só é mencionada nesse lamento e em Mateus 23:37.Fontes: o próprio texto bíblico · Jerusalem · Josiah
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículos 1, 2
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 4, 22, 33, 34
- Siloam · Hoje: Pool of Siloam · 31.771, 35.235 · versículo 4
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org