Josué 9
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Aghụghọ ndị Gibiọn
1Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, 2ha niile zukọtara ibu agha megide Joshua na ụmụ Izrel.
3Ma mgbe ndị Gibiọn nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai, 4ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha. 5Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu. 6Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”
7Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?”
8Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.”
Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?”
9Ha zara ya sị, “Ala anyị, ebe ndị ohu gị si bịa dị anya nke ukwuu. Anyị bịara nʼihi na anyị anụla akụkọ banyere Onyenwe anyị Chineke unu, na ihe niile o mere nʼIjipt. 10Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọrait, ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, Saịhọn eze Heshbọn, na Ọg eze Bashan, onye chịrị nʼAshtarọt. 11Ndị okenye anyị na ndị niile bi nʼala anyị sịrị anyị, ‘Werenụ ihe unu ji aga njem, jekwurunụ ndị Izrel sị ha, “Anyị bụ ndị ohu unu, kwerenụ ka anyị na unu gbaa ndụ.” ’ 12Lee achịcha ndị a bụ nke anyị ji mgbe anyị hapụrụ ala anyị. Ha dị ọkụ mgbe anyị hapụrụ ụlọ anyị ịbịa njem a, nʼihi na e si nʼebe a na-eghe ya wepụta ya, ma ugbu a, dịka unu hụrụ, ha akpọọla nkụ, bidokwa ịma ebu. 13A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”
14Ndị ikom Izrel ritụrụ ụfọdụ nʼime ihe oriri ha ji bịa, ma ha ajụtaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị. 15Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.
16Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso. 17Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim. 18Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ.
Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a. 19Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla. 20Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.” 21Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ.
22Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso? 23Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.”
24Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na Onyenwe anyị Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị. 25Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.”
26Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha. 27Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.

Você sabia?
O tratado dos gibeonitas
- Os habitantes de Gibeão eram heveus cujo território incluía quatro cidades: Gibeão, Quefira, Beerote e Quiriate-Jearim. Situada a poucos quilômetros a noroeste de Jerusalém, Gibeão era uma importante cidade nas colinas que optou pela diplomacia em vez de se unir à aliança militar dos reis cananeus vizinhos.Fontes: o próprio texto bíblico · Gibeon · Hivite
- Para forjar a evidência de uma longa viagem, os gibeonitas levaram odres rachados, sandálias gastas, roupas esfarrapadas e pão seco e mofado. Os líderes de Israel examinaram as provisões físicas, mas não buscaram o conselho do Senhor, o que os levou a firmar um pacto de paz.Fontes: o próprio texto bíblico
- No antigo Israel, um juramento feito em nome do Senhor era irrevogável, mesmo quando obtido por engano. Como os líderes haviam jurado por Deus, os israelitas pouparam a vida dos gibeonitas e os designaram para servir como cortadores de lenha e carregadores de água para a comunidade e o altar.Fontes: o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Great Sea · Hoje: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · versículo 1
- Jericho · Hoje: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · versículos 1, 3
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 1, 10
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículo 1
- Shephelah · 31.692, 34.875 · versículo 1
- Gibeon · Hoje: El Jib · 31.847, 35.183 · versículos 3, 17
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 9
- Bashan · 32.781, 35.935 · versículo 10
- Kiriath-jearim · Hoje: Deir el Azar · 31.809, 35.104 · versículo 17
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org