Nations Bible

Josué 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, 2“Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla, 3ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”

4Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla, 5Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị, 6ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’ 7Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”

8Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka Onyenwe anyị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ. 9Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

10Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan. 11Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya. 12Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu. 13Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.

14Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị, 16“Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”

17Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.”

18Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.

19Ihe ịrịbama a mere nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke mbụ. Nʼụbọchị ahụ ka ndị Izrel niile gafere osimiri Jọdan, gaa maa ụlọ ikwu ha na Gilgal, ebe dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko. 20Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal. 21Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’ 22Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’ 23Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ. 24O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Doze pedras memoriais e a travessia do Jordão

  • O capítulo descreve dois conjuntos distintos de doze pedras: um recolhido do leito do rio por doze representantes de cada tribo e erguido no acampamento em Gilgal, e outro colocado por Josué diretamente no meio do Jordão, onde os sacerdotes permaneceram. Esses monumentos foram concebidos como memoriais educativos permanentes para as futuras gerações.Fontes: o próprio texto bíblico · Gilgal
  • Cumprindo as instruções dadas originalmente por Moisés, cerca de 40.000 guerreiros armados das tribos de Rúben, Gade e da meia tribo de Manassés marcharam na vanguarda de Israel nas campinas de Jericó, embora suas próprias terras ficassem a leste do Jordão.Fontes: o próprio texto bíblico · Reuben · Gad · Manasseh (son of Joseph)
  • A travessia do Jordão é apresentada diretamente como equivalente à travessia do Mar Vermelho sob a liderança de Moisés. O povo chegou à margem ocidental no décimo dia do primeiro mês, estabelecendo seu acampamento em Gilgal, na fronteira leste de Jericó.Fontes: o próprio texto bíblico · Gilgal · Jericho · Red Sea

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 1, 3, 5, 7, 8, 9, 10, 12, 16, 17, 18, 19, 20, 22, 23
  • Jericho · Hoje: Tell es Sultan · 31.872, 35.445 · versículos 13, 19

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.