João 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Jisọs na ụmụnne ya
1Mgbe nke a gasịrị, Jisọs gagharịrị na Galili, ma ọ kpachapụrụ anya hapụ ịga Judịa nʼihi na ndị Juu na-achọ ụzọ igbu ya. 2Mmemme Ụlọ ikwu ndị Juu dị nso, 3ya mere, ụmụnne ya ndị nwoke sịrị ya, “Si nʼebe a pụọ, gaa Judịa, ka ndị na-eso ụzọ gị nwe ike ịhụ ọrụ ị na-arụ. 4Nʼihi na o nweghị onye ọbụla chọrọ ịbụ onye ọha mmadụ ma, nke na-eme ihe na nzuzo. Ebe ọ bụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, gosi ụwa onwe gị.” 5Nʼihi na ọ bụladị ụmụnne ya ekwenyeghị na ya.
6Jisọs sịrị ha, “Oge nke m erubeghị, ma oge nke unu nọ nʼebe a mgbe niile. 7Ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, ma ọ kpọrọ m asị nʼihi na ana m agba ama megide ya nʼọrụ ya jọrọ njọ. 8Unu onwe unu gaanụ na mmemme ahụ, agaghị m aga mmemme a nʼihi na oge m erubeghị.” 9Mgbe o kwusiri nke a, ọ nọgidere na Galili.
10Ma otu ọ dị, mgbe ụmụnne ya gawara mmemme ahụ ya onwe ya gakwara. Ọ gaghị ebe mmadụ niile ga-ahụ ya kama ọ gara na nzuzo. 11Na mmemme ahụ ndị Juu nọ na-ele anya ma na-ajụgharị sị, “Olee ebe ọ nọ?”
12E nwere oke ntamu nʼetiti igwe mmadụ ahụ banyere ya. Ndị ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezigbo mmadụ.”
Ndị ọzọ na-asị, “Mba, ọ na-eduhie igwe mmadụ.” 13Ma o nweghị onye ọbụla kwulitere okwu maka ya nʼihu ọha nʼihi egwu ndị Juu.
Jisọs a kuzie ihe na mmemme ahụ
14Mgbe o ruru nʼetiti mmemme ahụ, Jisọs banyere nʼime ụlọnsọ ukwu ma bido ikuzi ihe. 15Site nʼoke mgbagwoju anya, ndị Juu jụrịtara onwe ha sị, “Olee otu nwoke a sịrị nweta amamihe dị otu a ebe ọ bụ na o nwebeghị onye kuziri ya ihe ọbụla?”
16Jisọs zara ha, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye ahụ zitere m. 17Onye ọbụla na-achọ ime uche Chineke, ọ ga-achọpụta ma ozizi m ọ bụ nke m ma o sikwanụ na Chineke. 18Ndị ahụ na-ekwu nke onwe ha na-eme nke a iji wetara onwe ha ugwu, ma onye ahụ na-achọ ugwu nke onye zitere ya bụ onye eziokwu; o nwekwaghị ihe ọbụla bụ ụgha banyere ya. 19Mosis o nyeghị unu iwu? Ma o nweghị onye ọbụla nʼime unu na-edebe iwu ahụ. Gịnị mere unu ji achọ igbu m?”
20Igwe mmadụ ahụ zara, “Mmụọ ọjọọ bi nʼime gị, onye chọrọ igbu gị?”
21Jisọs zara sị ha, “Arụrụ m otu ọrụ, ma unu niile nọ na mgbagwoju anya. 22Mosis nyere unu iwu ibi ugwu (nʼagbanyeghị na o siteghị na Mosis, kama na nna nna anyị ha), nʼụbọchị izuike unu na-ebikwa mmadụ ugwu. 23Ọ bụrụ na e nwere ike bie mmadụ ugwu nʼụbọchị izuike ka a ghara imebi iwu Mosis, gịnị mere o ji na-ewute unu na m mere ka ahụ mmadụ zuo oke nʼụbọchị izuike? 24Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”
Ọ bụ Jisọs bụ Kraịst?
25Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị Jerusalem bidoro na-asị, “Onye a ọ bụghị nwoke ahụ ha chọrọ igbu? 26Lee ka ọ nọ na-ekwu okwu nʼihu mmadụ niile ma o nwekwaghị onye na-agwa ya ihe ọbụla. Ọ pụtara na ndịisi amatala nʼeziokwu na ọ bụ Kraịst? 27Ma anyị matara ebe nwoke a siri pụta, mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, o nweghị onye ga-amata ebe o siri pụta.”
28Ma dị ka Jisọs na-ezi ihe nʼime ụlọnsọ ukwuu ahụ, o tiri mkpu sị, “Nʼezie, unu maara m, matakwa ebe m siri pụta. Anọghị m nʼebe a na nke onwe m, ma onye ahụ zitere m bụ eziokwu. Unu amaghị ya. 29Ma amara m ya, nʼihi na esitere m na ya bịa. Ọ bụkwa ya zitere m.”
30Mgbe ahụ ha chọrọ ijide ya, ma o nweghị onye ọbụla metụrụ ya aka nʼihi na oge ya erubeghị. 31Ma otu ọ dị, ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ kweere na ya. Ha sịrị, “Mgbe Kraịst ahụ ga-abịa, ọ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị ndị a nwoke a rụrụla?”
32Ndị Farisii nụrụ ka igwe mmadụ ahụ na-atamu ntamu nʼolu nta banyere ya. Mgbe ahụ ndịisi nchụaja na ndị Farisii zigara ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwuu ahụ ka ha gaa jide ya.
33Jisọs sịrị, “Naanị nwa oge ka mụ na unu ga-anọ, aga m alakwurukwa onye zitere m. 34Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m. Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru ya.”
35Ndị Juu sịrịtara onwe ha, “Olee ebe nwoke a chọrọ ịga anyị na-agaghị achọta ya? Ọ ga-eje ebe ndị nke anyị a chụsasịrị achụsasị bi nʼetiti ndị Griik, ka ọ ga kuziere ndị Griik ihe? 36Kedụ ụdị okwu bụ nke a ọ na-ekwu sị, ‘Unu ga-achọ m ma unu agaghị achọta m,’ na ‘Ebe m na-agakwa unu enweghị ike ịbịaru’?”
Isi iyi mmiri nke ndụ
37Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri. 38Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.” 39O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
40Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.”
41Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.”
Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta? 42Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?” 43Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya. 44Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.
Ekweghị ekwe nke ndị ndu ndị Juu
45Mgbe ahụ, ndị nche ụlọnsọ ukwu lọghachiri nʼebe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nọ, ndị sịrị ha, “Gịnị mere unu akpụtaghị ya?”
46Ha zara, “Anyị ahụbeghị onye kwuru okwu dị ka nwoke a.”
47Ndị Farisii zara ha, “Unu esorola bụrụ ndị a ghọgburu? 48Ọ dị onye ọbụla nʼime ndịisi maọbụ nʼime ndị Farisii tụkwasịrị ya obi? 49E e! Kama igwe mmadụ ndị a na-amaghị iwu bụ ndị a bụrụ ọnụ.”
50Nikọdimọs, otu nʼime ha bụ onye bịakwutere ya na mbụ sịrị ha, 51“Iwu anyị ọ na-ama mmadụ ikpe, ma ọ bụrụ na o bụghị ụzọ nụta okwu nʼọnụ ya, ịchọpụta ihe onye ahụ na-eme?”
52Ha zaghachiri ya sị, “Gị onwe gị, i sokwa na ndị si Galili pụta? Nyochaa nke ọma, ị ga-achọpụta na onye amụma ọbụla agaghị esi na Galili pụta.” [Akwụkwọ ndị mbụ na ọtụtụ ndị ochie gbara akaebe enweghị amaokwu nke iri ise na atọ nʼakwụkwọ Jọn isi nke asaa ruo Jọn isi asatọ amaokwu nke iri na otu Jọn 7:53–8:11. Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye amaokwu ndị a, nʼebe o zuruoke maọbụ ụfọdụ nʼime ya, ma o bụrụ na ha edechaa Jọn isi asaa amaokwu nke iri atọ na isii, Jọn 7:36, Jọn 21:25, Luk 21:38 maọbụ Luk 24:53.]
53Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime ha lara nʼụlọ ya.

Você sabia?
Jesus na Festa dos Tabernáculos
- Quando se aproximava a Festa judaica dos Tabernáculos, uma festa de sete dias, Jesus permaneceu na Galileia e evitou a Judeia, onde queriam matá-lo. Naquele tempo, a Judeia era a mais meridional das três divisões romanas da Palestina, distinta da Galileia e da Samaria; mais tarde ele subiu à festa em segredo e ensinou nos pátios do templo.Fontes: o próprio texto bíblico · Feast of Tabernacles · Judea
- A multidão estava dividida sobre o lugar de onde viria o Cristo. Alguns diziam que as Escrituras o colocam na linhagem de Davi e em Belém, a aldeia onde viveu Davi, oitavo e mais novo filho de Jessé; outros objetavam que ele não podia vir da Galileia, região há muito chamada Galileia dos gentios, e os fariseus insistiam que nenhum profeta vem de lá.Fontes: o próprio texto bíblico · David · Galilee
- Nicodemos, fariseu e membro do Sinédrio, já tinha ido a Jesus de noite. Quando os guardas enviados para prender Jesus voltaram sem ele, Nicodemos protestou e perguntou se a lei deles condenava um homem antes de ouvi-lo e de apurar o que ele tinha feito.Fontes: o próprio texto bíblico · Nicodemus
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículos 1, 3, 9, 41, 52
- Judea · Hoje: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículos 1, 3
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 25
- Bethlehem · 31.704, 35.208 · versículo 42
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org