Nations Bible

João 17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ekpere Jisọs kpeere Onyenwe ya

1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị,

“Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto. 2I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. 3Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. 4Enyere m gị otuto nʼụwa site nʼịrụzu ọrụ niile ị nyere m ka m rụọ. 5Ma ugbu a, Nna, nye m otuto nʼihu gị, ụdị otuto ahụ m nwere nʼihu gị tupu e kee ụwa.

Ekpere Jisọs kpeere ndị na-eso ụzọ ya

6“Emere m ka ndị ahụ i siri nʼụwa kponye m mara aha gị. Ha bụ ndị nke gị, i nyere m ha, ha debekwara okwu gị. 7Ugbu a, ha amarala na ihe niile i nyere m si nʼaka gị bịa. 8Ma ugbu a, enyela m ha okwu ahụ i nyere m, ha nabatakwara ya, marakwa nʼeziokwu na-esi m nʼebe ị nọ bịa. Ha kwenyekwara na ọ bụ gị zitere m. 9Ana m ekpere ha ekpere, ọ bụghị nʼihi ụwa ka m na-ekpe ekpere. Kama ana m ekpe ekpere banyere ndị ahụ i nyere m, nʼihi na ha bụkwa ndị nke gị. 10Ihe niile m nwere bụ nke gị, ihe niile i nwere bụkwa nke m. E sitere na ha mee ka otuto m pụta ìhè. 11Ugbu a, anọghịkwa nʼime ụwa, ma ha ka nọ nʼime ụwa, ana m alaghachikwute gị. Ya mere, Nna dị nsọ, chebe ha nke ọma site nʼike nke aha gị, bụ aha nke ahụ i nyere m, ka ha bụrụ otu dịka anyị onwe anyị si bụrụ otu. 12Mgbe mụ na ha nọ nʼụwa, echebere m ha site nʼaha gị nke i nyere m. Echebekwara m ha, o nwekwaghị onye ọbụla nʼime ha lara nʼiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa nke ịla nʼiyi, ka e mezuo ihe akwụkwọ nsọ kwuru.

13“Ma ugbu a, ana m alọghachikwute gị, ma ana m ekwu ihe ndị a nʼụwa ugbu a ka ha nwee nʼọṅụ m, nʼebe o zuruoke nʼime ha. 14Enyela m ha okwu gị. Ma nʼihi ya, ụwa akpọọla ha asị. Nʼihi na ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụghị onye nke ụwa. 15Ekpeghị m ekpere ka iwepụ ha nʼụwa, kama ka ịnapụta ha site nʼaka ajọ onye ahụ. 16Ha onwe ha abụghị ndị nke ụwa dị ka mụ onwe m na-abụkwaghị onye nke ụwa. 17Were eziokwu doo ha nsọ, okwu gị bụ eziokwu. 18Dị ka i siri zite m nʼụwa, otu a ka m na-ezipụkwa ha nʼụwa. 19Ọ bụkwa nʼihi ha ka m jiri debe onwe m nsọ, ka ha onwe ha bụrụkwa ndị e doro nsọ nʼeziokwu.

Ekpere Jisọs maka ndị niile kwere ekwe

20“Ekpeghị m ekpere a nʼihi ndị a naanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nʼihi ndị niile ga-ekwere na mụ, site nʼokwu ha. 21Ka ha niile bụrụ otu, Nna, dị ka ị nọ nʼime m mụ a nọrọ nʼime gị. Ka ha nọrọkwa nʼime anyị ka ụwa kwere na ọ bụ gị zitere m. 22Enyere m ha otuto nke i nyere m, ka ha bụrụ otu dị ka anyị onwe anyị si bụrụ otu; 23Mụ onwe m nʼime ha, gị onwe gị nʼime m. Ka e mee ka ha bụrụ otu nʼụzọ zuruoke, ka ụwa matakwa na ọ bụ gị zitere m, na ị hụkwara ha nʼanya dị ka ị si hụ m nʼanya.

24“Nna, achọrọ m ka ndị niile i nyere m soro m nọrọ ebe m nọ. Ka ha hụ otuto m nke i nyere m nʼihi na ị hụrụ m nʼanya tupu atọọ ntọala nke ụwa.

25“Nna onye ezi omume, ụwa amaghị gị. Ma amaara m gị. Ndị a matakwara na ọ bụ gị zitere m. 26Emekwara m ka ha mara aha gị. Aga m agakwa nʼihu ime ka ha mara ya. Ka ịhụnanya ahụ i nwere nʼebe m nọ dịgide nʼime ha, ka mụ onwe m nọgidekwa nʼime ha.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

João 17: a hora chegou

  • A oração começa quando Jesus, depois de ter dito essas coisas, ergue os olhos ao céu e diz que a hora chegou. Ela está associada ao Discurso do Cenáculo, indicado como um dia, e à Semana Santa, indicada como oito dias.Fontes: o próprio texto bíblico · Upper Room Discourse · Holy Week
  • Aqui a vida eterna é conhecer o único Deus verdadeiro e Jesus Cristo, a quem o Pai enviou. Jesus também fala da glória que tinha com o Pai antes de o mundo existir e do amor do Pai por ele antes da fundação do mundo.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Ele ora por aqueles que o Pai lhe deu do mundo, os que guardaram a palavra, e também por quem crerá por meio da mensagem deles, pedindo que sejam um. Não pede que sejam tirados do mundo, mas que sejam guardados do maligno e santificados pela verdade, que ele identifica como a palavra do Pai.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.