Nations Bible

João 14

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Jisọs akasịe ha obi

1“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke; kwerekwanụ na m. 2Nʼụlọ Nna m, e nwere ọtụtụ ebe obibi. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu na m na-aga kwadoro unu ebe obibi? 3Ọ bụrụ na m agaa dozichara unu ebe obibi, aga m alọghachi bịa kpọrọ unu, ka ebe m nọ bụrụkwa ebe unu ga-anọ. 4Unu maara ụzọ ebe m na-aga.”

Jisọs bụ ụzọ

5Tọmọs sịrị ya, “Onyenwe anyị, anyị amaghị ebe ị na-aga, olee otu anyị ga-esi mata ụzọ ya?”

6Jisọs sịrị ya, “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ. O nweghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ bụghị site na m. 7Ọ bụrụ na unu maara onye m bụ, unu gaara amatakwa Nna m. Site ugbu a, unu amatala ya. Ma hụkwa ya.”

8Filip sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị Nna ahụ, afọ ga-ejukwa anyị.”

9Jisọs sịrị ya, “Ọtụtụ oge ndị a mụ na unu nọrọ ọ bụ na ị matabeghị onye m bụ, Filip? Onye ọbụla hụrụ m ahụla Nna. Olee otu i si asị, ‘zi anyị Nna ahụ?’ 10Ọ bụ na i kweghị na m nọ nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m? Okwu niile m na-agwa unu esitekwaghị nʼebe m nọ pụta, kama ọ bụ Nna bi nʼime m na-arụ ọrụ ya. 11Kwere ihe m kwuru na anọ m nʼime Nna, na Nna nọkwa nʼime m. Ma ọ bụghị otu a, kwerenụ nʼihi ọrụ ebube ndị a. 12Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla kwere na m ga-arụ ọrụ ndị m rụrụ, rụọkwa ọrụ karịrị ndị a, nʼihi na m na-alakwuru Nna m. 13Ihe ọbụla unu ga-arịọ site nʼaha m, aga m enye unu ya, ka e nwe ike nye Nna ahụ otuto site nʼỌkpara ya. 14Ihe ọbụla unu rịọrọ nʼaha m, aga m eme ya.

Nkwa izite Mmụọ Nsọ

15“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya unu ga-edebe iwu m niile. 16Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. 17Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. 18Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu. 19Mgbe na-adịghị anya, ụwa agaghị ahụkwa m anya. Ma unu ga-ahụ m anya. Nʼihi na m dị ndụ, unu ga-adịkwa ndụ. 20Nʼụbọchị ahụ, unu ga-amata na m nọ nʼime Nna m na unu nọ nʼime m, na mụ onwe m nọkwa nʼime unu. 21Onye ọbụla nabatara iwu m ma na-edebekwa ha bụ onye hụrụ m nʼanya. Onye hụrụ m nʼanya ka Nna m ga-ahụ nʼanya. Aga m ahụkwa ya nʼanya gosikwa ya onwe m.”

22Judas (ọ bụghị Iskarịọt) sịrị ya, “Onyenwe anyị, olee otu ị ga-esi gosi anyị onwe gị ma hapụ igosi ụwa onwe gị?”

23Jisọs zara sị ya, “Onye ọbụla hụrụ m nʼanya, ga-edebe okwu m. Nna m ga-ahụkwa ya nʼanya. Mụ na Nna m ga-abịakwa nʼebe onye ahụ nọ soro ya biri. 24Onye na-ahụghị m nʼanya agaghị edebe okwu m. Okwu ndị a niile unu nụrụ abụghị nke m. Ha bụ nke Nna ahụ, onye zitere m.

25“Agwala m unu ihe ndị a niile ugbu a mụ na unu nọ. 26Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu. 27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.

28“Unu anụla na m gwara unu, ‘Ana m ala, ma lọghachikwutekwa unu.’ Ọ bụrụ na unu hụrụ m nʼanya, unu gaara aṅụrị ọṅụ na m na-alakwuru Nna, nʼihi na Nna dị ukwuu karịa m. 29Ugbu a, agwala m unu ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru, unu enwee ike kwere. 30Agaghị m agwa unu ọtụtụ okwu ọzọ nʼihi na eze na-achị ụwa a na-abịa. O nwekwaghị ike ọbụla nʼebe m nọ. 31Ana m eme dịka Nna m nyere m nʼiwu, ka ụwa mara na m hụrụ Nna m nʼanya.

“Bilienụ ugbu a ka anyị si ebe a pụọ.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Jesus, o Caminho para o Pai

  • Tomé, um dos doze, diz a Jesus que os discípulos não sabem para onde ele vai e, por isso, não podem conhecer o caminho. Também era chamado Dídimo, o equivalente grego de seu nome hebraico, que significa "gêmeo". O Easton's Bible Dictionary (1897) observa que o que se conhece dele está registrado no quarto Evangelho, inclusive nesse diálogo.Fontes: o próprio texto bíblico · Thomas
  • Filipe, também um dos doze e natural de Betsaida, a cidade de André e Pedro, pede a Jesus que lhes mostre o Pai. Jesus responde que tem estado com eles todo esse tempo e que quem o viu viu o Pai. O Easton's Bible Dictionary (1897) cita esse diálogo entre as passagens que sugerem que Filipe ocupava um lugar de destaque entre os apóstolos.Fontes: o próprio texto bíblico · Phillip the Apostle
  • O discípulo que pergunta por que Jesus vai se revelar aos discípulos e não ao mundo é chamado Judas, não o Iscariotes, para distingui-lo de Judas Iscariotes, filho de Simão, homem de Queriot, que traiu Jesus. O Easton's Bible Dictionary (1897) diz que João provavelmente se refere ao mesmo apóstolo chamado Lebeu em Mateus, Tadeu em Marcos e Judas, irmão de Tiago, em Lucas, e o identifica como Judas, autor da epístola.Fontes: o próprio texto bíblico · Lebbaeus Thaddaeus · Judas Iscariot

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.