Nations Bible

Jeremias 44

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Mbibi na-abịa nʼihi ikpere arụsị

1Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha. 3Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị. 4Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’ 5Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ. 6Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.

7“Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda. 8Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa. 9Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem? 10Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya.

11“Nʼihi ihe ndị a niile, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ekpebiela m ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu; ekpebiela m ibibi Juda. 12Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha. 13Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ. 14O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”

15Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya, 16“Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị 17Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị. 18Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.”

19Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?”

20Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha, 21“ Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile. 22Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa. 23Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”

24Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt. 25Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’

“Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ. 26Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.” 27Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum. 28Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.

29“ ‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’ 30Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’ ”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A advertência de Jeremias aos judeus no Egito

  • Os refugiados de Judá haviam se estabelecido por todo o Egito, desde localidades ao norte como Migdol, Tafnes e Mênfis no Baixo Egito, até a região meridional de Patros no Alto Egito.Fontes: o próprio texto bíblico · Pathros · Memphis · Migdol
  • A comunidade reunida recusou abertamente a advertência de Jeremias e insistiu em queimar incenso e preparar bolos com a imagem da Rainha dos Céus, alegando que eram prósperos em Jerusalém quando realizavam esses rituais.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Como sinal do julgamento iminente, Jeremias profetizou que o faraó Hofra do Egito seria entregue nas mãos de seus inimigos, assim como o rei Zedequias de Judá fora entregue a Nabucodonosor da Babilônia.Fontes: o próprio texto bíblico · Zedekiah · Nebuchadnezzar

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 1, 8, 12, 13, 14, 15, 24, 26, 27, 28, 30
  • Memphis · 29.849, 31.253 · versículo 1
  • Pathros · Hoje: Upper Egypt · 24.100, 32.700 · versículos 1, 15
  • Tahpanhes · Hoje: Tell Defenneh · 30.861, 32.171 · versículo 1
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 5, 6, 9, 13, 17, 21
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 30

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.