Jeremias 34
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ịdọ aka na ntị a dọrọ Zedekaya
1Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị, 2“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, Jekwuru Zedekaya bụ eze Juda, gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze Babilọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ. 3Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze Babilọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa Babilọn.
4“ ‘Ma nụrụkwa nkwa Onyenwe anyị na-ekwe gị, gị Zedekaya eze Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha; 5ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”
6Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa Zedekaya eze Juda ihe ndị a niile na Jerusalem. 7Nʼoge a, ndị agha eze Babilọn na-ebuso Jerusalem agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo Lakish na Azeka. Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala Juda nke ndị agha Babilọn na-emeribeghị.
Inwe onwe nke ndị ohu
8Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị mgbe Zedekaya bụ eze, na ndị Izrel niile gbachara ndụ na Jerusalem ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha. 9Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye Hibru ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye Juu ọbụla dịka ohu ọzọ. 10Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo. 11Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.
12Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya, 13“Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala Ijipt, bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị, 14‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye Hibru ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha. 15Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. 16Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ.
17“Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘Inwere onwe’ nye unu, ka Onyenwe anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa. 18Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike. 19Ndị ndu Juda na Jerusalem na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga 20ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa.
21“Aga m enyefe Zedekaya eze Juda na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze Babilọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha. 22Aga m enye iwu, ka Onyenwe anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo Juda niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”
Você sabia?
A Aliança Quebrada e as Últimas Fortalezas de Judá
- Enquanto as tropas de Nabucodonosor avançavam contra Jerusalém, Laquis e Azeca eram as únicas outras cidades fortificadas que restavam em Judá. Ambas eram importantes fortalezas defensivas localizadas na Sefelá, a região de colinas baixas a oeste de Judá.Fontes: o próprio texto bíblico · Lachish · Azekah · Nebuchadnezzar
- O capítulo descreve um antigo ritual de aliança no qual os participantes cortavam um bezerro em duas partes e passavam entre as metades divididas. Essa cerimônia simbolizava que quem violasse o juramento sofreria o mesmo destino do animal sacrificado.Fontes: o próprio texto bíblico
- Sob cerco, o rei Zedequias e os líderes de Jerusalém concordaram em libertar seus servos hebreus de acordo com a antiga lei. No entanto, assim que o exército babilônico se retirou temporariamente, os proprietários voltaram atrás em seu juramento e forçaram os libertos a retornar à servidão.Fontes: o próprio texto bíblico · Zedekiah
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 1, 2, 3, 7, 21
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 6, 7, 8, 19, 21
- Lachish · Hoje: Tell ed Duweir · 31.565, 34.849 · versículo 7
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 13
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org