Nations Bible

Jeremias 21

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Chineke ajụ arịrịọ Zedekaya

1Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya ntị mgbe eze Zedekaya zigara Pashua nwa Malkija, na onye nchụaja bụ Zefanaya nwa Maaseia, 2sị, “Jụtara anyị ase site nʼaka Onyenwe anyị, nʼihi na Nebukadneza eze Babilọn na-ebuso anyị agha. Eleghị anya Onyenwe anyị ga-emere anyị ihe ịtụnanya dịka oge gara aga, nke ga-eme ka o si nʼebe anyị nọ wezuga onwe ya.”

3Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya, 4‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a. 5Mụ onwe m ga-eji aka e setịpụrụ nke ọma, na aka dị ike, nke iwe na ọnụma dị ukwuu, buo agha megide unu. 6Aga m etida ndị niile bi nʼobodo a, ma mmadụ ma anụ ọhịa. Ha ga-anwụkwa site nʼoke ihe otiti, nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ha. 7Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’

8“Tinyere nke a, gwanụ ndị mmadụ niile, ‘na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Lee, ana m eche nʼihu unu ụzọ abụọ, ụzọ na-eduba na ndụ, na ụzọ na-eduba nʼọnwụ. 9Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. 10Ekpebiela m imesi obodo a ike; o nweghị ihe ọma ọbụla ga-esi nʼaka m rute ha, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A ga-enyefe obodo a nʼaka eze Babilọn, onye ga-eji ọkụ laa ya nʼiyi.’

11“Karịchasịa, gwa ndị ezinaụlọ eze Juda sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. 12Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile;

napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha.

Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a.

Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu,

dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu,

ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.

13Edoola m onwe m megide gị, Jerusalem,

gị onye bi nʼebe dị elu karịa ndagwurugwu a,

onye bi nʼebe dị elu nke dị larịị, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Gị onye na-asị “Onye pụrụ ibuso anyị agha?

Onye kwa pụrụ ịbata nʼebe anyị e wusiri ike?”

14Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị,

otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile,

nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ ”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Consulta de Zedequias e o Cerco Iminente

  • Diante da invasão do rei Nabucodonosor da Babilônia, o rei Zedequias de Judá enviou uma delegação a Jeremias na esperança de que Deus realizasse um livramento milagroso como no passado. Zedequias havia sido colocado no trono pelo próprio Nabucodonosor e se tornou o último rei de Judá.Fontes: Zedekiah · Nebuchadnezzar · o próprio texto bíblico
  • Entre os emissários reais estava Sofonias, filho de Maaseias, que servia como segundo sacerdote durante o reinado de Zedequias. Sofonias foi enviado repetidas vezes pelo rei a Jeremias para consultar sobre os desastres iminentes e buscar a intercessão do profeta.Fontes: Zephaniah · Maaseiah · o próprio texto bíblico
  • Em vez de prometer livramento, Jeremias pôs diante do povo o caminho da vida e o da morte. Aqueles que permanecessem dentro de Jerusalém morreriam pela espada, pela fome e pela peste, enquanto os que se rendessem aos caldeus sitiantes preservariam suas vidas.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 2, 4, 7, 10
  • Chaldea · 30.962, 46.104 · versículos 4, 9
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 6, 8, 9, 13

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.