Nations Bible

Jeremias 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja, 2jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị. 3Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru. 4Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze Juda, na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a. 5Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi Baal. Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye Baal, bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi. 6Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a Tofet ma ọ bụkwanụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom, kama a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Ogbugbu.

7“ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri. 8Aga m ebibi obodo a mee ka ọ ghọọ ihe iju anya na ihe ịma ọsụ. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. 9Aga m emekwa ka ha rie anụ ahụ nke ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ha ga-erikwa anụ ahụ ibe ha, nʼihi na ndị iro ha ga-agba ha gburugburu nọchibido ha nʼime oke mkpagbu ka ha bibie ndụ ha.’

10“Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya. 11Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga-eli ndị nwụrụ anwụ na Tofet tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ. 12Ihe dị otu a ka m ga-eme nʼebe a, meekwa ndị bi na ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m eme obodo a ka ọ dịrị ka Tofet. 13Ụlọ niile dị na Jerusalem na ụlọ niile nke ndị eze Juda ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ Tofet, otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ”

14Mgbe Jeremaya si na Tofet, ebe ahụ Onyenwe anyị zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha, 15“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

O cântaro quebrado e o vale de Ben-Hinom

  • Deus instruiu Jeremias a levar anciãos e sacerdotes pela Porta dos Cacos—que dava acesso ao campo do oleiro—até o vale de Ben-Hinom, também chamado de Tofete. Ali, o povo de Judá havia praticado sacrifícios de crianças e edificado altos a Baal, levando Deus a declarar que o local passaria a se chamar Vale da Matança.Fontes: o próprio texto bíblico · East Gate · Baal
  • Jeremias realizou um ato profético ao quebrar um cântaro de barro diante dos líderes que o acompanhavam. Essa destruição irreversível serviu como símbolo visual de que Jerusalém e suas casas seriam despedaçadas de forma irreparável por causa de suas práticas idólatras, incluindo a queima de incenso a outros deuses sobre os terraços.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Valley of Hinnom · Hoje: Hinnom Valley · 31.769, 35.228 · versículos 2, 6
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 3, 7, 8, 11, 13
  • Topheth · Hoje: in the Hinnom Valley · 31.769, 35.228 · versículos 6, 11, 12, 13, 14

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.