Juízes 6
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Gidiọn
1Ọzọkwa, ụmụ Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, nʼihi ya, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka ndị Midia afọ asaa. 2Nʼihi na ndị Midia mekpara ha ahụ nke ukwuu, ụmụ Izrel meere onwe ha ebe obibi nʼugwu, nʼime ọgba nkume, na nʼebe e wusiri ike dị iche iche. 3Mgbe ọbụla ndị Izrel ghasịrị mkpụrụ nʼubi ha, ndị Midia, ndị Amalek na ụfọdụ ndị ọzọ si nʼọwụwa anyanwụ na-abịa buso ha agha. 4Ha na-ebichi ala ahụ, bibie ihe niile a kụrụ nʼubi nʼala ahụ niile ruo na Gaza. O nweghị ihe ọbụla dị ndụ ndị Izrel nwere, ma atụrụ, ma ehi, ma ịnyịnya ibu, ha na-ahapụ. 5Dịka usuu igurube ka ha na-abịa, ha na anụ ụlọ ha niile, na ụlọ ikwu ha niile. Ọnụọgụgụ ha dị ukwuu ruo na-apụghị ịgụta ole ha dị, maọbụ ịnyịnya kamel ha. Ha na-abata nʼala ahụ nʼihi ibibicha ya. 6Site nʼomume ọjọọ ndị a, e mere ka ụmụ Izrel bụrụ ndị dara ụbịam nke ukwuu nʼihi ọchịchị ndị Midia. Nʼikpeazụ, ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị ka o nyere ha aka.
7Mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị nʼihi mkpagbu ndị Midia na-akpagbu ha, 8Onyenwe anyị zitere onye amụma, onye gwara ha okwu sị, “Ihe a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke nke Izrel kwuru, Esi m nʼala Ijipt, ala ahụ unu bụ ndị ohu nʼime ya, kpọpụta unu. 9Anapụtara m unu site nʼaka ike ndị Ijipt na site nʼaka ndị niile kpagburu unu, chụpụ ha site nʼihu unu, ma nye unu ala ha. 10Agwara m unu sị, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu. Unu efela chi niile nke ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha.’ Ma unu jụrụ ige m ntị.”
11Mmụọ ozi Onyenwe anyị bịara nọdụ ọdụ nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼOfra, nʼala ubi Joash, onye obodo Abieza, ebe nwa ya a na-akpọ Gidiọn nọ na-azọcha mkpụrụ ọka wiiti nʼime ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼihi na ọ na-ezo onwe ya ka ndị Midia hapụ ịhụ ya anya. 12Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.”
13Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka Onyenwe anyị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, Onyenwe anyị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.”
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.”
15Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.”
16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.”
17Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu. 18Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.”
Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.”
19Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ.
20Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a. 21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya. 22Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!”
23Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.”
24Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.
25Nʼabalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Were oke ehi nna gị, bụ oke ehi nke abụọ, nke gbara afọ asaa. Dọtuo ebe ịchụ aja nna gị wuru maka Baal, gbutukwaa ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya. 26Mgbe ahụ, wuoro Onyenwe anyị bụ Chineke gị ebe ịchụ aja, nʼelu ebe a dị oke elu. Jiri osisi Ashera ahụ nke ị gbuturu kwanye ọkụ, chụọ oke ehi nke abụọ ahụ dịka aja nsure ọkụ.”
27Ya mere, Gidiọn duuru mmadụ iri site na ndị na-ejere ya ozi, ndị nyeere ya aka imezu ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Kama, site nʼegwu maka ndị ikwu nna ya, na ndị bi nʼobodo ahụ, o mere ihe ndị a niile nʼime abalị.
28Mgbe chi bọrọ, mgbe ndị obodo ahụ malitere ijegharị, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụ aja Baal, hụkwa na e gbutuola ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya, ma werekwa oke ehi nke abụọ chụọ aja nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ ahụ!
29Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?”
Mgbe ha ji nwayọọ jụgharịa ajụjụ, a gwara ha sị, “Ọ bụ Gidiọn nwa Joash mere ya.”
30Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”
31Ma Joash tinyere ọnụ jụọ ha ajụjụ sị ha, “Baal, ọ gwara unu na ọ chọrọ ka unu nyere ya aka? Unu na-achọ ịzọpụta ya? Onye ọbụla wepụtara onwe ya maka ịlụrụ Baal ọgụ ga-anwụ tupu chi echi abọọ. Ọ bụrụ nʼezie na Baal bụ chi, hapụnụ ya ka o tigbuo onye ahụ mebiri ebe ịchụ aja ya.” 32Ya mere, nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịkpọ Gidiọn “Jerub-Baal.” Ha kwuru sị, “Ka Baal lụọrọ onwe ya ọgụ,” nʼihi na ọ kwadara ebe ịchụ aja Baal.
33Mgbe na-adịghị anya, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na obodo niile gbara ha gburugburu jikọtara onwe ha nʼotu, bịa ibu agha megide ụmụ Izrel. Ha niile gafere osimiri Jọdan, bịaruo na Ndagwurugwu Jezril ebe ha mara ụlọ ikwu. 34Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Gidiọn. Ọ fụrụ opi ike nke o ji kpọkọta ndị agha ka ha zukọọ. Ndị agha niile si nʼikwu Abieza pụkwutere ya. 35Otu aka ahụ, o zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru ndị agha ndị Manase, na nke ndị Asha, na nke ndị Zebụlọn, na nke ndị Naftalị, ịkpọ ha ka ha bịa soro ya gaa ibu agha. Ha niile kwenyere pụkwute ya maka agha ahụ.
36Gidiọn sịrị Chineke, “Ọ bụrụ nʼezie na ị ga-azọpụta Izrel site nʼaka m dịka i kwere na nkwa, 37lee, aga m edebe ajị anụ nʼebe ịzọcha ọka. Ọ bụrụ na igirigi adakwasị naanị nʼelu ajị anụ ahụ ma ala ebe ọ tọgbọ gbakọọ agbakọ, mgbe ahụ aga m amata na ị ga-anapụta Izrel site nʼaka m, dịka ị kwuru.” 38Ihe a mezukwara dịka Gidiọn si rịọọ ya. Mgbe chi bọrọ, ọ gara welite ajị anụ ahụ chọpụta na o jupụtara na mmiri. Mmiri o si na ya pịpụta juru otu efere miri emi.
39Mgbe ahụ, Gidiọn sịrị Chineke, “Ka iwe gị ghara ịdị ọkụ megide m. Ka m rịọkwuo naanị otu ihe ọzọ. Kwere ka m jiri ajị anụ a nwalee otu ugboro ọzọ, kama nʼoge a, mee ka mmiri ghara ịdị nʼajị anụ ahụ, ma ka igirigi jupụta nʼala ebe ọ tọgbọ.” 40Nʼabalị ahụ, Chineke mere otu a. Ala niile gbaa gburugburu dere mmiri site nʼigirigi, ma mmiri ọbụla adịghị nʼajị anụ ahụ.
Você sabia?
O chamado de Gideão e a opressão midianita
- Como os nômades midianitas e povos aliados saqueavam a terra e destruíam as colheitas por sete anos consecutivos, Gideão precisou malhar o trigo dentro de um lagar, em vez de numa eira aberta, para não ser visto pelos invasores.Fontes: o próprio texto bíblico · Gideon
- Depois que Gideão destruiu à noite o altar de Baal de seu pai Joás e cortou o poste sagrado, os moradores exigiram sua execução; Joás defendeu o filho argumentando que Baal deveria pleitear por si mesmo, o que deu a Gideão o nome de Jerubaal.Fontes: o próprio texto bíblico · Gideon · Joash
- Enquanto os invasores se reuniam no vale de Jezreel, Gideão convocou guerreiros de Manassés, Aser, Zebulom e Naftali, buscando confirmação de seu chamado por meio de sinais sucessivos com uma porção de lã na eira.Fontes: o próprio texto bíblico · Valley of Jezreel
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Midian · 28.495, 35.012 · versículos 1, 2, 3, 6, 7, 13, 14, 16, 33
- Amalek · 30.648, 34.422 · versículos 3, 33
- East · Hoje: region around Amman · 31.955, 35.934 · versículos 3, 33
- Gaza · Hoje: Tell Harube · 31.504, 34.464 · versículo 4
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 8, 9, 13
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 33
- Valley of Jezreel · Hoje: Jezreel Valley · 32.596, 35.242 · versículo 33
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org