Nations Bible

Tiago 5

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ịdọ aka na ntị nye ndị ọgaranya

1Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. 2Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu. 3Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a. 4Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 5Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya. 6Unu amala ndị aka ha dị ọcha ikpe, gbukwaa ha, ọ bụladị mgbe ha na-egbochighị unu.

Ndidi nʼime ahụhụ

7Nweenụ ntachiobi, ụmụnna m, cherenụ ọbịbịa Onyenwe anyị. Lee otu onye ọrụ ubi si eji ndidi na-eche mkpụrụ ọ kụrụ nʼala ubi ka ọ mịa. O ji ndidi na-eche ka mmiri ozuzo nke mbụ na nke ikpeazụ zokwasị ubi ya. 8Unu onwe unu kwesikwara inwe ndidi guzosiekwa ike nʼihi na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. 9Ụmụnna m, unu atamula ntamu megide ibe unu, ka a hapụ ikpe unu ikpe! Lee, onye ikpe ahụ guzo nʼọnụ ụzọ.

10Ụmụnna m, dị ka ihe ilere anya banyere inwe ndidi na ahụhụ, mụtanụ ihe site nʼaka ndị amụma bụ ndị kwuru okwu nʼaha Onyenwe anyị. 11Anyị na-agụ ha ugbu a dịka ndị a gọziri agọzi nʼihi iguzosike ha. Unu anụla maka ogologo ntachiobi nke Job nwere, unu ahụkwala nzube Onyenwe anyị nʼihi na Onyenwe anyị jupụtara nʼebere na ọmịiko.

12Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma.

Ekpere nke sitere nʼokwukwe

13Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto. 14Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 15Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya. 16Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.

17Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii. 18Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, eluigwe nyere mmiri ozuzo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.

19Ụmụnna m, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼetiti unu esite nʼeziokwu ahụ jehie, ma otu onye nʼime unu akpọghachi ya azụ, 20chetanụ nke a na onye ọbụla kpọghachitere onye mmehie azụ site na njehie ya, ga-azọpụta ha nʼaka ọnwụ ma kpuchiekwa ọtụtụ mmehie.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Riqueza, paciência e oração

  • O capítulo 5 de Tiago lembra a perseverança de Jó e o desfecho que o Senhor lhe deu. O Easton's Bible Dictionary (1897) descreve-o como um patriarca árabe que vivia na terra de Uz e manteve a integridade em meio a provações repentinas. O verbete diz que Deus depois lhe concedeu uma prosperidade ainda maior do que a anterior, que ele viveu cento e quarenta anos após o período de prova e que é exemplo de paciência sob uma calamidade severa.Fontes: o próprio texto bíblico · Job
  • Tiago diz que Elias era um homem igual a nós. Ele orou com fervor para que não chovesse, e não choveu sobre a terra durante três anos e meio; orou outra vez, os céus deram chuva, e a terra produziu suas colheitas. O Easton's Bible Dictionary (1897) chama-o de tesbita, o “Elias” do Novo Testamento, e observa que ele entregou uma mensagem do Senhor a Acabe.Fontes: o próprio texto bíblico · Elijah
  • Para encorajar a paciência até a vinda do Senhor, Tiago aponta o lavrador que espera o precioso fruto da terra e as chuvas de outono e de primavera, e diz que o Juiz está em pé à porta. O mesmo capítulo adverte que os salários retidos dos trabalhadores que ceifaram os campos estão clamando, e que o clamor dos ceifeiros chegou aos ouvidos do Senhor dos Exércitos.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.