Isaías 19
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Amụma e buru banyere Ijipt
1Nke a bụ amụma megide Ijipt:
Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt,
ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ.
Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya.
Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
2“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.
Nwanne ga-emegide nwanne ya,
onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya;
obodo ga-emegide isi obodo;
otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.
3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,
aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu,
ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase,
jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.
4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,
Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,
nke na-adịghị eme ebere,
ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”
5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;
ọ ga-atakwa takọrọkwa.
6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị
ga-atalata bido nʼisi isi.
Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
ifufe ga-efesakwa ha.
Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,
ihe niile ga-anwụ.
8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,
ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri
ga-ata ahụ.
9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,
na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,
ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.
Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,
“Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,
onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?
Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,
ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
zubere megide Ijipt.
13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;
ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile
eduhiela ndị Ijipt ụzọ.
14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;
nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme
dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,
isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.
19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt. A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha. 20Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya. 22Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
23Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe. 24Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa. 25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”

Você sabia?
A profecia a respeito do Egito
- Zoã (conhecida pelos gregos como Tânis), no delta do Nilo, e Mênfis (chamada Nofe em hebraico) foram capitais administrativas e centros de liderança no antigo Egito. Isaías destaca os conselheiros dessas cidades reais para enfatizar o colapso da sabedoria egípcia.Fontes: Zoan · Memphis · o próprio texto bíblico
- O julgamento econômico descrito no capítulo atinge diretamente o Nilo, o rio essencial para a sobrevivência do Egito. A seca de suas águas e canais ameaçava a agricultura, a pesca e ofícios vitais como o cultivo do linho e a tecelagem de tecidos finos.Fontes: Nile · o próprio texto bíblico
- O oráculo termina prevendo uma estrada que ligaria os grandes rivais imperiais, Egito e Assíria, ao lado de Israel. Em vez de guerra perpétua, esses antigos impérios são descritos prestando adoração juntos e compartilhando a bênção divina.Fontes: Assyria · Egypt · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 1, 2, 3, 4, 6, 10, 11, 12, 13, 14, 15, 16, 17, 18, 19, 20, 21, 22, 23, 24, 25
- Nile · Hoje: Nile River · 31.465, 30.367 · versículos 5, 6, 7, 8
- Zoan · Hoje: Tanis · 30.977, 31.880 · versículos 11, 13
- Memphis · 29.849, 31.253 · versículo 13
- Canaan · 32.767, 35.333 · versículo 18
- Assyria · 36.359, 43.153 · versículos 23, 24, 25
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org