Nations Bible

Hebreus 12

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Kraịst bụ ihe nlere anya nye anyị

1Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. 2Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke. 3Tuleenụ nʼobi unu gbasara onye ahụ tachịrị obi na nkwụgide sitere nʼaka ndị mmehie, ka ike ghara ịgwụ unu maọbụ obi unu adaa mba.

Ụzọ Chineke si azụ ụmụ ya

4Nʼime ọgụ nke unu na-alụso mmehie, unu eguzogideghị ruo nʼọnọdụ nke iwufu ọbara unu. 5Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ,

“Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ

maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.

6Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.

Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.”

7Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. 8Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. 9Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ. 10Ha na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nʼuche ha. Ma ọ na-azụ anyị nʼihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nʼịdị nsọ ya. 11Mgbe ọbụla a na-ezi anyị ihe site nʼinye anyị ahụhụ, ọ na-abụrụ anyị ihe mwute nʼoge ahụ, ọ bụghịkwa ihe ọṅụ. Ma e mesịa, ọ na-eweta udo na ndụ ezi omume nye ndụ ahụ azụrụ nʼime ya.

12Ya mere, setịpụ aka gị ahụ ike gwụrụ. Guzosie ike nʼụkwụ gị ahụ na-ama jijiji. 13Debenụ ụkwụ unu nʼụzọ ziri ezi, ka ụkwụ na-adịghị ike ghara ịda ngwụrọ, kama ka o nwe ọgwụgwọ.

Ndụmọdụ na ịdọ aka na ntị

14Gbalịsie ike mee ka gị na mmadụ niile biri nʼudo ya na ndụ dị nsọ, e wepụ ya, o nweghị onye pụrụ ịhụ Onyenwe anyị. 15Hụkwanụ na o nweghị onye ga-ahapụ inweta amara Chineke, na o nwekwaghị onye ga-epupụta dịka mgbọrọgwụ ilu weta nsogbu a ga-esi nʼime ya merụọ ọtụtụ mmadụ. 16Hụnụ na o nweghị onye na-ebi ndụ ruru unyi maọbụ onye nke na-enweghị nsọpụrụ dịka Ịsọ, onye nke rere ọnọdụ ọmụmụ ya nʼihi otu efere nri. 17Dịka unu maara, o mechara chọọ ka o keta ngọzị ahụ, ma a jụrụ ya nʼihi na o nweghị ohere nchegharị. Ọ bụ ezie na o jiri anya mmiri chọsie ya ike.

Ugwu nke Ụjọ na Ugwu nke Ọnụ

18Unu abịarughị nʼugwu nke a pụrụ ịmetụ aka, nke na-ere ọkụ, na ọchịchịrị na itiri na oke ifufe, 19na ụda opi ike, maọbụ olu na-ekwu okwu, nke ndị nụrụ ya rịọrọ ka ọ kwụsị ịgwa ha. 20Nʼihi na ha enweghị ike ịnagide ihe e nyere nʼiwu, “A sịkwarị na anụmanụ ọbụla emetụ ugwu ahụ ahụ, a ga-eji nkume tugbuo ya.” 21Nʼezie, ihe ahụ anya hụrụ dị oke egwu na Mosis sịrị, “Ana m ama jijiji nʼihi ụjọ.”

22Ma unu abịaruola nʼugwu Zayọn, bụ obodo Chineke dị ndụ, Jerusalem nke eluigwe ahụ. Unu abịakwutela puku kwụrụ puku ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ zukọrọ nʼọṅụ. 23Unu abịala nʼụlọ nzukọ nke onye ahụ ebu ụzọ mụpụta bụ ndị e dere aha ha nʼeluigwe. Unu abịakwutela Chineke, onye ga-ekpe mmadụ niile ikpe, unu abịakwutela mmụọ ndị ezi omume e mere ka ha bụrụ ndị zuruoke. 24Unu abịakwutela Jisọs onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bịakwutekwa ọbara e fesara nke na-ekwu okwu dị mma karịa nke ọbara Ebel kwuru.

25Gbalịsienụ ike ihu na unu ajụghị onye ahụ na-ekwu okwu. Nʼihi na ọ bụrụ na ha agbanarịghị ya, bụ onye ahụ dọrọ ha aka na ntị nʼelu ụwa, anyị agaghị agbanarị onye ahụ si nʼeluigwe na-adọ anyị aka na ntị. 26Nʼoge ahụ, olu ya mere ka ụwa ma jijiji, ma ugbu a, ọ kwela nkwa, sị, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ, ọ bụghị naanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.” 27Okwu a bụ, “Otu mgbe ọzọ fọdụrụ,” na-egosi mwepụ nke ihe na-ama jijiji dịka ihe e kere eke, iji hụ na nke na-anaghị ama jijiji ga-adị.

28Ya mere, ebe anyị na-anata alaeze nke na-apụghị ịgbanwe, ka anyị jiri obi ekele, egwu na nsọpụrụ fee Chineke ofufe nʼụzọ ọ ga-anabata. 29Nʼihi na Chineke anyị bụ ọkụ na-erepịa erepịa.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A corrida, a disciplina e o monte Sião

  • Hebreus 12 adverte contra ser profano como Esaú, que vendeu a primogenitura por uma única refeição. Esaú, o gêmeo primogênito de Rebeca, era caçador; faminto ao voltar da caça, vendeu esse direito ao irmão Jacó por um cozido de lentilhas vermelhas, e daí também lhe veio o nome Edom, “vermelho”. Depois, diz o capítulo, ele buscou a bênção com lágrimas e foi rejeitado.Fontes: Esau (Edom) · o próprio texto bíblico
  • Hebreus 12 diz que seus leitores chegaram não a um monte que se pode tocar e que arde em fogo, em trevas, escuridão e tempestade — onde até Moisés disse: “Estou tremendo de medo” —, mas ao monte Sião e à Jerusalém celestial, a cidade do Deus vivo. O monte Sião era a colina do sudeste de Jerusalém; Davi a tomou dos jebuseus, construiu ali uma cidadela e um palácio, e ela se tornou a cidade de Davi. O nome Jerusalém é explicado como “posse da paz” ou “fundamento da paz”, e a cidade também era chamada de cidade santa.Fontes: o próprio texto bíblico · Mount Zion · Jerusalem
  • Hebreus 12 fala do “sangue aspergido, que fala uma palavra melhor do que o sangue de Abel”. Abel, o segundo filho de Adão e Eva, foi morto pelo irmão Caim, depois que o Senhor olhou com favor para Abel e para sua oferta, os primogênitos do rebanho, mas não para Caim e sua oferta, os frutos do campo.Fontes: o próprio texto bíblico · Abel

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 22
  • Mount Zion · 31.772, 35.229 · versículo 22

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.