Nations Bible

Gálatas 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Okwukwe ka ọ bụ ọrụ nke iwu?

1Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galeshịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere Jisọs Kraịst. 2Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe? 3Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ? 4Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu? 5Mmụọ nsọ ahụ Chineke nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma? 6Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.

7Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham. 8Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” 9Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị.

Ọbụbụ ọnụ nke iwu na-eweta

10Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” 11Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke, nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” 12Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.” 13Ma Kraịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.” 14Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere Ebraham bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na Kraịst Jisọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ.

Iwu na Nkwa

15Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a. 16Ọ bụ Ebraham ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ Kraịst. 17Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ Chineke mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. 18Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma Chineke sitere nʼamara nye Ebraham ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya.

19Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire. 20Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma Chineke bụ otu.

21Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu. 22Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst.

Ụmụ Chineke

23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.

26Unu niile bụ ụmụ Chineke site nʼokwukwe nʼime Kraịst Jisọs. 27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst. 28E nwekwaghị onye Juu, maọbụ onye Griik, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime Kraịst Jisọs. 29Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke Kraịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ Ebraham, ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A fé, a promessa e a lei

  • Este capítulo diz que Abraão creu em Deus e que isso lhe foi creditado como justiça, e que os que têm fé são filhos de Abraão e herdeiros segundo a promessa. Um verbete de dicionário o chama de herdeiro das promessas e diz que ele foi nomeado antes dos irmãos mais velhos, Naor e Harã, porque ocupava esse lugar.Fontes: o próprio texto bíblico · Abraham
  • O capítulo ensina que uma aliança humana, uma vez ratificada, não pode ser anulada nem alterada, e que a lei, vinda 430 anos depois, não revoga a promessa que Deus já havia concedido a Abraão. Uma cronologia data a peregrinação em Canaã e no Egito como iniciada em 1920 a.C. e com duração de 430 anos.Fontes: o próprio texto bíblico · Sojourn in Canaan and Egypt
  • O capítulo diz que a Escritura previu que Deus justificaria os gentios pela fé e anunciou de antemão a Abraão o evangelho de que todas as nações seriam abençoadas por meio dele. Chamado pai de uma multidão, ele viveu na Caldeia até os setenta anos, depois deixou Ur por causa de um chamado de Deus e ficou quinze anos em Harã, cerca de 300 milhas ao norte.Fontes: o próprio texto bíblico · Abraham

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.