Esdras 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Akwụkwọ ozi Tatenai dere
1Ugbu a, ndị amụma, bụ Hegai, na Zekaraya nwa Ido buru amụma nye ndị Juu nọ na Juda nakwa Jerusalem. Ọ bụ nʼaha Chineke nke Izrel, onye na-achị ha ka ha buru amụma ahụ. 2Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak malitekwara iwu ụlọnsọ Chineke nʼJerusalem. Ndị amụma Chineke ahụ nọnyeere ha na-enyekwara ha aka.
3Ma Tatenai, onye na-achị mba niile dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndị enyi ha, gara Jerusalem jụọ ndị Juu sị; “Onye nyere unu ike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem?” 4Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?” 5Ma anya Chineke ha dịkwasịrị nʼahụ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghị ha ọrụ ruo mgbe akwụkwọ ozi ruru Daraiọs, na mgbe ọsịsa ya bịara site nʼakwụkwọ ozi.
6Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs: 7Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee,
Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a,
Anyị ekelee gị.
8Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha.
9Anyị jụrụ ndị okenye ajụjụ sị: Onye nyere unu ikike ibido iwuzi ụlọnsọ a na mgbidi Jerusalem? 10Anyị jụkwara ha aha ha, ka anyị si otu a mee ka ị mata aha ndị ndu ha.
11Ma nke a bụ ihe ha zaghachiri anyị:
“Anyị onwe anyị bụ ndị ohu Chineke nke eluigwe na ụwa. Anyị na-ewugharị ụlọnsọ nke otu eze ukwu ndị Izrel wuru nʼoge gara aga. 12Ma nʼihi na nna nna anyị ha mere ka iwe wee Chineke nke eluigwe, o weere ha nyefee nʼaka Nebukadneza, onye Kaldịa, bụ eze Babilọn, onye bibiri ụlọnsọ a ma dọrọ ndị bi nʼala ahụ nʼagha laa Babilọn.
13“Ma otu ọ dị, nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Babilọn, eze Sairọs nyere iwu ka e wugharịa ụlọnsọ Chineke a. 14O sikwa nʼụlọnsọ dị na Babilọn wepụta ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo si nʼụlọnsọ Chineke nke Nebukadneza si nʼụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem bupụ bulaa nʼụlọnsọ dị na Babilọn. Mgbe ahụ eze Sairọs nyefere ha nʼaka otu nwoke a na-akpọ Sheshbaza, onye ọ họpụtara dịka gọvanọ. 15Ọ gwara ya sị, ‘buru ngwongwo ndị a bulaa ha nʼụlọnsọ dị na Jerusalem, wugharịakwa ụlọnsọ Chineke nʼọnọdụ ya mbụ.’
16“Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.”
17Ugbu a, ọ bụrụ na ọ dị eze mma nʼobi, ya nye iwu ka e nyochaa nʼụlọ a na-echebe akwụkwọ ochie nke ndị eze Babilọn, ịchọpụta maọbụ eziokwu na eze Sairọs nyere iwu dị otu a iwugharị ụlọnsọ Chineke dị na Jerusalem. Ka eze gwakwa anyị ihe bụ mkpebi ya banyere okwu a.

Você sabia?
O reinício do Templo e a investigação persa
- A construção do templo havia cessado por anos, mas o trabalho foi retomado sob a liderança de Zorobabel e Jesua após as exortações dos profetas Ageu e Zacarias em Jerusalém. Zacarias, descrito em Esdras como filho de Ido, ministrou ao lado de Ageu durante o reinado do rei Dario.Fontes: o próprio texto bíblico · Haggai · Zechariah · Zerubbabel
- Tatenai atuava como governador persa da província a oeste do rio Eufrates. Ao observar, juntamente com oficiais como Setar-Bozenai, a construção diligente com grandes pedras e vigas de madeira, ele interrogou os anciãos sobre sua autorização e enviou uma consulta formal ao rei Dario.Fontes: o próprio texto bíblico · Tatnai · Shethar-boznai
- Em sua resposta a Tatenai, os líderes judeus recorreram ao decreto de Ciro, que havia conquistado a Babilônia, permitido o retorno dos exilados e devolvido os utensílios de ouro e prata saqueados anteriormente por Nabucodonosor. Tatenai solicitou ao rei uma busca nos arquivos reais da Babilônia para verificar o decreto.Fontes: o próprio texto bíblico · Cyrus · Nebuchadnezzar
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 1, 2, 3, 14, 15, 16, 17
- Beyond the River · 31.777, 35.234 · versículos 3, 6
- Euphrates · Hoje: Euphrates River · 31.004, 47.442 · versículo 6
- Judea · Hoje: Judea 2 · 31.777, 35.234 · versículo 8
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 12, 13, 14, 17
- Babylonia · 32.543, 44.422 · versículo 12
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org