Nations Bible

Ezequiel 6

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Mbibi dịrị ugwu Izrel niile

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee iru gị nʼugwu niile nke nʼIzrel, buo amụma megide ha, 3sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja. 4A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu. 5Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu. 6Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa. 7Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

8“ ‘Ma aga m eme ka ụfọdụ nʼime ndị m fọdụ. Ndị ahụ fọdụrụ ga-esi nʼihu mma agha gbapụ, gbasasịa nʼala niile, na mba niile nke ụwa. 9Mgbe ha nọ dịka ndị a dọtara nʼagha na mba ọzọ, ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ga-echeta m. Ha ga-echeta otu ha si jiri obi nke ịkwa iko jupụtara nʼime ya, nke si nʼebe m nọ wezuga onwe ya, na anya nke na-agbaso arụsị ha, mee ka obi jọọ m njọ. Ha ga-akpọ onwe ha asị nʼihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere, ya na ọchụchụ aja rụrụ arụ ha chụrụ. 10Ha ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, matakwa na mgbe m gwara ha na ihe ndị a niile gaje ịbịakwasị ha, na ọ bụghị okwu efu ka m kwuru.

11“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, kụkọọ ọbọ aka gị abụọ ọnụ, zọkwaa ụkwụ gị nʼala, ma tisikwaa mkpu akwa ike site nʼobi mwute, nʼihi ihe ọjọọ niile na omume rụrụ arụ ndị Izrel mere. Nʼihi na ha ga ịla nʼiyi site nʼoke ụnwụ, na site nʼagha, na site nʼọrịa na-efe efe. 12Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m. 13Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha. 14E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Julgamento da Idolatria nos Montes de Israel

  • Ezequiel direciona sua profecia especificamente contra os montes, colinas, ravinas e vales de Israel porque esses locais naturais elevados e isolados eram os principais pontos onde altares pagãos e incensários floresciam sob carvalhos frondosos e árvores verdes.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O profeta é instruído a acompanhar sua mensagem com gestos físicos expressivos, como bater as palmas e bater os pés no chão, para dramatizar o choque, a dor e a solenidade do juízo iminente por espada, fome e peste.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Apesar de anunciar uma desolação generalizada por toda a terra, o texto promete que um remanescente sobreviverá à espada e refletirá sobre seus atos enquanto estiver disperso em cativeiro entre as nações.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Riblah · Hoje: Rableh · 34.460, 36.573 · versículo 14

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.