Nations Bible

Ezequiel 46

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ. 2Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị. 3Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee Onyenwe anyị ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ. 4Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ. 5Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya. 6Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla. 7Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa. 8Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.

9“ ‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu Onyenwe anyị nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ. 10Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ. 11Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla.

12“ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara.

13“ ‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya. 14Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 15Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile.

16“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi. 17Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ. 18Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’ ”

19Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ. 20Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.”

21Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla. 22Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu. 23Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ. 24Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Adoração, Deveres Reais e Cozinhas do Templo

  • A porta oriental do átrio interior permanecia fechada durante os seis dias de trabalho, sendo aberta apenas no sábado e no dia da lua nova. O príncipe devia permanecer junto ao batente da porta e adorar no limiar enquanto os sacerdotes ofereciam os seus sacrifícios, e a porta ficava aberta até a tarde.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Durante as festas fixas, os adoradores que entravam pela porta norte deviam sair pela porta sul, e os que entravam pelo sul deviam sair pelo norte. Além disso, as leis de propriedade proibiam expressamente que o príncipe tomasse as terras do povo, devendo dar herança a seus filhos apenas de seus próprios bens.Fontes: o próprio texto bíblico
  • A visão detalha áreas de cozinha distintas no templo: câmaras especiais a oeste para os sacerdotes cozinharem as ofertas pelo pecado e pela culpa, e quatro átrios menores nos cantos do pátio externo, onde os ministros do templo preparavam os sacrifícios oferecidos pelo povo.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.