Nations Bible

Ezequiel 38

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Mmeri dị ukwuu nke Onyenwe anyị meriri ọtụtụ mba

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼala Magog, bukwaa amụma megide Gog, bụ onyeisi nke Meshek na Tubal. Buo amụma megide ya, 3sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ana m edo onwe m imegide gị, Gog, eze ukwu ndị Meshek na Tubal. 4Aga m echigharị gị, tinye gị nko nʼagba gị abụọ, jiri ya kpụpụta gị na usuu ndị agha gị niile, na ịnyịnya gị, na ndị na-agba ịnyịnya gị na ihe agha ha, na usuu ndị agha gị niile, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ndị niile na-ejide mma agha ha. 5Peshịa na Itiopia, na Put, ga-esonyere ha, ha niile ga-ejikwa ọta ha na okpu agha ha. 6Goma na usuu ndị agha ya niile, na ndị agha Bet Togama ndị si nʼakụkụ ugwu, dị ebe dị anya na ọtụtụ ndị mba ọzọ ga-eso gị.

7“ ‘Jikere! Jikere onwe gị, gị onwe gị na usuu ndị agha ahụ nọ gị gburugburu, gị Gog, bụrụkwa onyendu ha. 8Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, a ga-akpọlite gị ibu agha. Nʼogologo oge dị nʼihu, ị ga-ebuso ala ahụ agha bụ ala ahụ na-enwetaghachi onwe ya site na mbibi nke ibu agha; ala ahụ e si na mba dị iche iche chịkọtaa ndị bi nʼime ya, mee ka ha birikwa nʼugwu niile nke Izrel ahụ naara atọgbọ nʼefu. E bulatara ha site na mba dị iche iche, ma ugbu a, ha anọrọla nʼudo. 9Gị onwe gị, na ndị agha gị niile, na ọtụtụ ndị mba ahụ dị iche iche ndị na-eso gị, jiri ọsọ, dịka ikuku siri ike, rigoo, kpuchie ala ahụ dịka igwe ojii.

10“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị. 11Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. 12Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.” 13Ndị Sheba na Dedan, na ndị ahịa Tashish niile, na ụmụ ọdụm ya niile ga-ajụ gị, “Ị bịara ịkwata ihe nkwata? Ị chịkọtara usuu ndị agha gị nʼihi ịkwara ihe nlụta, na iburu ọlaọcha na ọlaedo, na ịchịrị igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha, na ịkwakọrọ ihe ha nwere nʼike?” ’

Amụma megide Gog

14“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma sị Gog, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ mgbe ndị m bụ Izrel na-ebi nʼudo nʼala ha, ọ bụ na ị gaghị ahụta ya? 15Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike. 16Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’

17“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m. 18Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 19Nʼihi na esitere m nʼịnụ ọkụ nke obi m, na oke iwe m kwupụta sị, na ala ọma jijiji dị ukwuu ga-adị nʼIzrel nʼụbọchị ahụ. 20Azụ niile dị nʼoke osimiri, na anụ ufe nke eluigwe, na anụ ọhịa, na ihe niile na-akpụ akpụ, na mmadụ niile nọ nʼelu ụwa ga-ama jijiji nʼihu m. A ga-akwatu ugwu niile, ebe niile dị mkputamkpu ga-adarukwa ala. 21Aga m akpọlite mma agha ka o megide Gog nʼugwu m niile. Onye ọbụla ga-ejikwa mma agha ya megide nwanne ya nwoke. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 22Aga m eji ọrịa na-efe efe na iwusi ọbara kpee ya ikpe. Aga m awụkwasị ya na ndị agha ya na ọtụtụ mba dị iche iche ndị ahụ so ya, oke mmiri ozuzo na akụmmiri, na nkume ọkụ. 23Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Gogue e a Coalizão contra Israel

  • Muitas das nações mencionadas nesta profecia — incluindo Magogue, Meseque, Tubal e Gômer — remontam aos descendentes de Jafé em Gênesis 10. Escritores posteriores, como o pai latino da igreja Jerônimo, identificaram Magogue com tribos citas ferozes que habitavam as regiões ao norte do Cáucaso e do Mar Cáspio.Fontes: Magog · Meshech · Gomer (son of Japheth) · o próprio texto bíblico
  • A coalizão reunida sob Gogue inclui povos de extremos opostos do mundo antigo. Ao lado das tribos do norte estão a Pérsia, a leste, e Cuxe, ao extremo sul, representando as regiões ao sul do Egito.Fontes: Persia · Cush · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Meshech · Hoje: about 200 km around Gordion · 39.655, 31.994 · versículos 2, 3
  • Tubal · Hoje: Tabal · 37.296, 36.254 · versículos 2, 3
  • Cush · Hoje: Cush 1 · 16.935, 33.751 · versículo 5
  • Persia · 34.806, 48.516 · versículo 5
  • Gomer · Hoje: Asia Minor · 39.000, 32.000 · versículo 6
  • Sheba · 15.348, 44.206 · versículo 13

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.