Nations Bible

Ezequiel 34

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Onyenwe anyị ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ Izrel

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị ọzụzụ atụrụ Izrel niile, buo amụma sị ha, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ahụhụ na-adịrị unu ndị ọzụzụ atụrụ Izrel, ndị na-enyeju naanị onwe ha afọ. Ọ kwesighị ka onye ọzụzụ atụrụ lekọtazie igwe atụrụ e tinyere nʼaka ya anya? 3Unu na-eri abụba ha niile, unu na-eyi uwe ajị anụ, na-egbu anụ ndị mara abụba nʼagbanyeghị na unu adịghị elekọta igwe ewu na atụrụ m ndị a. 4Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha. 5Nʼihi ya, ha agbasasịala nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ anọghị ya. Ha aghọkwaarala anụ ọhịa niile ihe oriri. 6Igwe ewu na atụrụ nke m na-awagharị nʼugwu niile, na nʼelu ugwu nta niile. Ọ bụkwa nʼelu ụwa niile ka ha gbasara. Ọ dịkwaghị onye na-ajụ ajụjụ banyere ha. Ọ dịkwaghị onye na-elenye anya nʼebe ha nọ.

7“ ‘Nʼihi nke a, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị: 8Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe unu hapụrụ igwe atụrụ m na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, mee ka ha ghọọrọ anụ ọhịa ihe oriri, ebe unu na-achọgharịghị ha, kama unu nọ na-enyeju onwe unu afọ, ma hapụ igwe atụrụ m ka agụụ gbuo ha, 9nʼihi ya, unu ndị ọzụzụ atụrụ, nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị: 10Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ana m edo onwe m megide ndị ọzụzụ atụrụ niile. Ọ bụkwa nʼaka ha ka m ga-ajụta ihe banyere igwe ewu na atụrụ m. Aga m eme ka ha kwụsị ị bụ ndị na-azụ igwe ewu na atụrụ m, ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a ghara ịzụ onwe ha nri ọzọ. Aga m esite nʼọnụ ha napụta igwe ewu na atụrụ m, ha agaghị abụkwara ha nri ọzọ.

11“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha. 12Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ. 13Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma. 14Aga m azụ ha nʼebe ịta ahịhịa mara mma, na nʼelu ugwu niile nke Izrel. Nʼebe ahụ ka ha ga-amakpukwa nʼudo. Ha ga-ata nri nʼebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel. 15Ọ bụ mụ onwe m ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ nke atụrụ m niile. Aga m eme ka ha makpuru nʼudo, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 16Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.

17“ ‘Ma unu onwe unu, ụmụ igwe anụ ụlọ m, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m ekpe ikpe nʼetiti atụrụ na atụrụ, ebule na mkpi. 18Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ? 19Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ?

20“ ‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ. 21Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha. 22Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. 23Aga m edobe otu onye ọzụzụ atụrụ nke ga-elekọta ndị m, ọ bụladị ohu m Devid. Ya onwe ya ga-elekọta ha, bụrụkwa onye ọzụzụ atụrụ nye ha. 24Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-abụ Chineke ha, ma ohu m Devid ga-abụ onyeisi nʼetiti ndị m. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

25“ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu. 26Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri. 27Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha. 28Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu. 29Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche. 30Ha ga-amata na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke ha, na m na-anọnyere ha, na ha onwe ha kwa, bụ ụlọ Izrel, bụ ndị m, otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwupụtara. 31Unu bụ igwe ewu na atụrụ m, atụrụ nke ebe ịta nri m, mụ onwe m bụkwa Chineke unu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”

Você sabia?

Os Pastores e o Rebanho de Israel

  • Na linguagem bíblica antiga, líderes e governantes eram frequentemente descritos como pastores responsáveis por guiar e proteger o povo. Ezequiel condena as autoridades de Israel por se aproveitarem da lã e da carne das ovelhas em vez de curar, cuidar e buscar as mais vulneráveis.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O ministério profético de Ezequiel teve início por volta de 592 a.C., séculos depois de o rei Davi ter cuidado dos rebanhos nas terras altas de Judá. Nesta profecia, Deus promete estabelecer 'meu servo Davi' como único pastor e príncipe para apascentar o rebanho disperso.Fontes: David · Prophecies of Ezekiel · o próprio texto bíblico
  • O capítulo culmina na promessa de uma 'aliança de paz', na qual animais ferozes são afastados, chuvas na estação certa trazem fartura agrícola e o jugo da opressão é quebrado para que o povo viva em segurança.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.