Nations Bible

Ezequiel 29

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Amụma megide Ijipt

Ikpe ọmụma dịrị Fero

1Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile. 3Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:

“ ‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt,

gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi.

Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl,

ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”

4Ma aga m etinye nko nʼagba gị,

mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị.

Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile,

mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.

5Aga m ahapụ gị

na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara,

ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi,

a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu,

nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri

nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.

6Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

“ ‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ. 7Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.

8“ ‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị. 9Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.

“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.” 10Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush. 11Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị. 12Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.

13“ ‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara. 14Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ. 15Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ. 16Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’ ”

Ụgwọ ọrụ Nebukadneza

17Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18“Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa. 19Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya. 20Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”

21“Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Profecias contra o Egito e o Faraó

  • A expressão "desde Migdol até Sevene" abrangia toda a extensão territorial do Egito, partindo da cidade fortificada de Migdol no nordeste até Sevene (atual Assuã) na fronteira sul com Cuxe.Fontes: Migdol · Syene · Cush · o próprio texto bíblico
  • O capítulo faz referência ao prolongado esforço militar realizado por Nabucodonosor, rei da Babilônia, contra a cidade de Tiro, profetizando que seu exército tomaria as riquezas do Egito como pagamento por seu trabalho.Fontes: Nebuchadnezzar · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 2, 3, 6, 8, 9, 10, 12, 13, 14, 15, 16, 19, 20
  • Nile · Hoje: Nile River · 31.465, 30.367 · versículos 3, 4, 5, 9, 10
  • Cush · Hoje: Cush 1 · 16.935, 33.751 · versículo 10
  • Syene · Hoje: Aswan · 24.089, 32.900 · versículo 10
  • Pathros · Hoje: Upper Egypt · 24.100, 32.700 · versículo 14
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 18, 19
  • Tyre · 33.271, 35.196 · versículos 18, 20

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.