Nations Bible

Ezequiel 24

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Izrel dịka ite e sikwasịrị nʼọkụ

1O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu. 3Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru:

“ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya

kunyekwanụ mmiri nʼime ya.

4Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya.

Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya.

Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya.

5Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ,

kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ,

mee ya ka ọ gbọọ nke ọma,

sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya.

6“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,

“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya.

E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya,

nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya.

Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu.

Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.

7“ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya.

Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya.

Ọ bụghị nʼelu ala efu,

ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya.

8Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ

ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume,

ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya.

9“ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,

“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara.

Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ.

10Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu,

mụnyekwanụ ọkụ.

Jirinụ ụda dị iche iche

sizie anụ ahụ nke ọma;

surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ.

11Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ,

tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa,

gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị,

nchara ya ga-agwụsịkwa.

12Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ.

Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya

emeghị ka ọ gbazee.

13“ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke.

14“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”

Ọnwụ nwunye Izikiel

15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 16“Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta. 17I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”

18Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu.

19Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”

20Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 21Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha. 22Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri. 23Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu. 24Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’

25“Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, 26nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere. 27Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

O Cerco de Jerusalém e o Luto de Ezequiel

  • Ezequiel recebeu a ordem de registrar a data exata — o décimo dia do décimo mês no nono ano —, pois naquele mesmo dia o rei da Babilônia iniciou o cerco contra Jerusalém.Fontes: o próprio texto bíblico · Ezekiel
  • Quando a esposa de Ezequiel faleceu de forma repentina no nono ano de seu exílio, ele foi proibido de seguir os costumes tradicionais de luto, como chorar abertamente, retirar o turbante, andar descalço, cobrir os lábios ou comer o pão dos pranteadores.Fontes: o próprio texto bíblico · Ezekiel · Wife of Ezekiel
  • A reação contida do profeta diante de sua perda pessoal serviu como sinal aos exilados, prefigurando o choque e o atordoamento que sentiriam ao receber a notícia da queda de Jerusalém e de seu santuário.Fontes: o próprio texto bíblico · Jerusalem

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 2, 26
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 6, 9, 26

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.