Ezequiel 22
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ikpe ọmụma nʼihi mmehie Jerusalem
1Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị:
2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere. 3‘Ị ga-asị, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gị obodo nke na-ewetara onwe gị mbibi nʼihi ọbara niile a na-awụsi nʼetiti gị, na arụsị niile i ji na-emerụ onwe gị. 4Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche. 5Ndị nọ gị nso na ndị nọ gị ebe dị anya ga-achị gị ọchị, gị obodo rụrụ arụ, na nke jupụtara nʼọgbaaghara.
6“ ‘Lee ka ndịisi Izrel nọ nʼime gị si e ji ike ha nwere na-awụsi ọbara. 7A na-elelị nne na nna nʼime gị. Ndị mbịarambịa ka e ji anya ike na-emegbu. Ndị na-enweghị nna na ndị inyom di ha nwụrụ ka a na-akpagbu, na-emejọkwa. 8I lelịala ihe nsọ m niile, merụọkwa ụbọchị izuike m niile. 9Ndị nkwutọ, ndị na-awụsi ọbara nọ nʼime gị. Ndị na-eri nri nʼihu arụsị niile dị nʼelu ugwu, na ndị na-eme omume rụrụ arụ nọkwa nʼime gị. 10Nʼime gị ka ndị na-akwaso nwunye nna ha iko dị, nʼime gị ka ndị na-awakpo ụmụ nwanyị mgbe ha nọ na nsọ ha, bụ mgbe ha nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha. 11Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ. 12E nwekwara ndị na-anara ego gbuo mmadụ ibe ha nʼime gị. Gị onwe gị na-anarakwa ndị i binyere ego ụma buru ibu, na-esitekwa nʼaka ike na-anara ndị mmadụ ihe ha. I chefuokwala m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
13“ ‘Lee, aghaghị m ịkụkọta ọbụ aka m abụọ nʼihi uru nke na-ezighị ezi ị na-eri, na ọbara niile nke ị wụsiri nʼetiti gị. 14Obi gị ọ ga-esikwa ike? Ị ga-eguzokwa nʼụbọchị m ga-ekpe gị ikpe? Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola. Aga m emezukwa ya. 15Aga m achụsa unu nʼetiti mba niile, fesaa unu nʼetiti mba niile. Aga m emekwa ka adịghị ọcha unu kwụsị. 16Mgbe e mere ka ị ghara ịdị nsọ nʼanya ndị mba dị iche iche, ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
17Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18“Nwa nke mmadụ, ụlọ Izrel aghọọlara m ihe efu. Ha niile aghọọla ọla, na gbamgbam, na igwe, na ọla opu a hapụrụ nʼọkụ. Ha bụ nnọọ ihe efu nke ọlaọcha. 19Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na unu niile aghọọla ihe efu, aga m achịkọta unu nʼime Jerusalem. 20Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu. 21Aga m achịkọta unu, fụkwasị unu ọkụ nke ọnụma m, mee ka unu gbazee nʼime ya. 22Dịka ọlaọcha si agbaze nʼọkụ, otu a ka unu ga-esi gbazee nʼime ya. Unu ga-amatakwa nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị awụkwasịla unu iwe m.’ ”
23Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 24“Nwa nke mmadụ, gwa ala ahụ okwu, ‘Ị bụ ala nke a na-emebeghị ka ọ dị ọcha, maọbụ mmiri izokwasị ya nʼụbọchị ọnụma.’ 25E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya. 26Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha. 27Ndịisi nọ nʼime gị dịka nkịta ọhịa na-adọgbu anụ o gbutara. Ha na-awụsi ọbara, ime ka mkpụrụobi mmadụ laa nʼiyi nʼihi uru akpa ha. 28Ndị amụma ha eteela nzu nʼọrụ ha niile site nʼọhụ ụgha nʼịgba afa ụgha mgbe ha na-ahụghị ọhụ ọbụla. Ha na-asị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,’ mgbe Onyenwe anyị na-ekwughị ihe ọbụla. 29Ndị ala a na-eji aka ike na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere na-ezukwa ohi. Ha na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, na-emegbukwa ndị ọbịa site nʼụzọ ekpeghị ikpe ziri ezi.
30“Achọrọ m otu onye nʼetiti ha bụ onye nke ga-ewuzi mgbidi ogige, guzokwa nʼihu m ikwuchite ọnụ ala a, ka m ghara ịla ala a nʼiyi, ma ọ dịghị onye m hụrụ. 31Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha ọnụma m, jirikwa iwe m dị ọkụ rechapụ ha. Aga m ebokwasịkwa ahụhụ niile nke mmehie ha, nʼisi ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
Você sabia?
Julgamento sobre os pecados de Jerusalém
- Ezequiel emprega imagens metalúrgicas ao comparar a casa de Israel a metais comuns e à escória—cobre, estanho, ferro e chumbo—separados durante o refino da prata. Jerusalém é retratada como uma fornalha de fundição onde essas impurezas serão reunidas e derretidas sob o fogo do julgamento divino.Fontes: o próprio texto bíblico
- O capítulo apresenta uma acusação contra todos os níveis de liderança e da sociedade de Jerusalém, mencionando especificamente seus príncipes, sacerdotes, autoridades, falsos profetas e o povo comum. Cada grupo é condenado por corrupção generalizada, opressão dos vulneráveis e desprezo pelas leis sagradas, não restando ninguém para ficar na brecha em favor da terra.Fontes: o próprio texto bíblico
- Embora Jerusalém fosse tradicionalmente reverenciada como a cidade santa e seu nome estivesse associado à paz, Ezequiel a chama abertamente de cidade sanguinária devido à violência desenfreada, à extorsão e à injustiça sistêmica dentro de seus muros.Fontes: Jerusalem · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org