Nations Bible

Ezequiel 17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ugo abụọ na otu osisi vaịnị

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, tụọ ilu kọwaara ụlọ Izrel akụkọ ihe ọmụma atụ. 3Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo. 4Ọ kubipụrụ ọnụ ọnụ alaka osisi a, buru ya gaa nʼala ebe ọtụtụ ndị na-azụ ahịa juru, kụọ ya nʼobodo ahụ.

5“ ‘O sitekwara nʼala ahụ were otu mkpụrụ kụọ ya nʼala mara nnọọ ezi mma. Ọ kụrụ ya dịka e si akụ osisi wilo nʼakụkụ ebe enwere ụba mmiri. 6Ọ dịghị anya, mkpụrụ osisi ahụ gbara mgbọrọgwụ, too, ghọọ osisi vaịnị dị mkpụmkpụ, nke na-awasa awasa, nke alaka ya niile chere ihu nʼebe ugo ahụ nọ. O nwekwara alaka siri ike, na akwụkwọ mara mma.

7“ ‘Ma e nwekwara ugo ọzọ, nke nwere nku sara mbara, nke jupụtara nʼabụba. Mgbe ugo a bịara, osisi vaịnị a gbasakwara mgbọrọgwụ ya na alaka ya, chee ugo ahụ ihu, ka ọ gbakwasị ya mmiri. 8A kụrụ ya nʼebe ala dị mma, nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ka o nwee ike wapụta ngalaba, mịa mkpụrụ, ghọọkwa ezigbo vaịnị mara mma.’

9“Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ ga-adịhụkwa? Ọ bụ na agaghị ehopu mgbọrọgwụ ya niile, bipụkwa mkpụrụ ya niile mee ka ọ kpọnwụọ? Ka akwụkwọ ndụ niile nke na-epute ọhụrụ kpọnwụọ. Ọ gaghị ewekwa ogwe aka dị ike maọbụ ọtụtụ ndị mmadụ ihopụta ya site na mgbọrọgwụ ya. 10A kụọla ya ma ọ ga-etokwa? Ọ gaghị akpọnwụ kpamkpam mgbe oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ feturu ya, kpọnwụchakwaa nʼala ebe ahụ ọ nọ puo?’ ”

11Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 12“Ugbu a, gwa ndị nnupu isi ahụ, ‘unu maara ihe ilu a pụtara?’ Sị ha, ‘Lee, Babilọn bịara na Jerusalem dọkpụrụ eze ya na ndị ọchịchị ya laa Babilọn. 13O were otu onye site nʼezinaụlọ eze, ya na ya gbara ndụ, bụ onye o mere ka ọ ṅụọ iyi. O sitekwara nʼala ahụ bupụ ndị ndu obodo ahụ niile. 14Nʼụzọ dị otu a, alaeze ahụ ghọrọ alaeze e wedara nʼala nke ukwuu, nke na-enweghịkwa ike ibili ọzọ. Ọganihu nke alaeze ahụ dabeere naanị na ndebe ha debere ọgbụgba ndụ ahụ. 15Ma o nupuru isi nʼokpuru ya site nʼiziga ndị ozi nʼIjipt ka ha nye ya ọtụtụ ịnyịnya na ndị agha. Ọ ga-enwetakwa ihe ọ chọrọ? Onye na-eme ihe dị otu a, ọ pụrụ ịgbanarị ntaramahụhụ? Ọ pụrụ imebi ọgbụgba ndụ ma gbalaga?

16“ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya. 17Nʼagbanyeghị igwe ndị agha ya siri ike, Fero agaghị enwe ike zọpụta ya nʼagha, mgbe ha ga-ewulite mgbidi agha, gwuokwa olulu nnọchibido iji gbuo ọtụtụ mmadụ. 18O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.

19“ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri. 20Aga m agbasa ụgbụ m nʼụzọ o si aga; ọnya m ga-amakwa ya. Aga m ewetakwa ya na Babilọn, nọdụkwa nʼebe ahụ taa ya ahụhụ nʼihi na ọ kwesighị ntụkwasị obi nye m. 21Mma agha ka a ga-eji gbuo ndị agha ya niile na-agbapụ ọsọ, ndị niile fọdụrụ ka a ga-achụsasị nʼakụkụ niile. Mgbe ahụ, ị ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

22“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu. 23Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile. 24Nʼoge ahụ, osisi ọhịa niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, bụ onye na-egbuda osisi niile dị elu, ma na-ewelikwa ndị dị nta elu. Na ọ bụ m na-eme ka osisi dị ndụ kpọnwụọ, ma na-emekwa ka nke nwụrụ anwụ dịrị ndụ.

“ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Aghakwaghị m ime ya.’ ”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A parábola das águias e do cedro

  • Ezequiel apresenta uma alegoria política em que a primeira grande águia representa o rei da Babilônia, que levou a liderança real de Jerusalém para o cativeiro e estabeleceu um rei vassalo sob uma aliança solene. A segunda águia representa o Egito e seu faraó, a quem o governante de Judá recorreu em busca de cavalos e auxílio militar, quebrando sua aliança.Fontes: o próprio texto bíblico · Babylon · Egypt · Pharaoh
  • Na mensagem profética, romper um juramento de vassalagem firmado com a Babilônia foi considerado não apenas uma rebelião diplomática, mas uma traição espiritual contra Deus, que considerava o juramento prestado como Sua própria aliança.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O capítulo se encerra revertendo os planos políticos humanos: o próprio Deus promete tirar um renovo tenro do topo do cedro e plantá-lo nas alturas montanhosas de Israel, onde ele se tornará uma árvore majestosa que dará abrigo a aves de todo tipo.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Lebanon · 33.540, 35.584 · versículo 3
  • Canaan · 32.767, 35.333 · versículo 4
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 12, 14, 15, 16, 17, 20
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 12, 17
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 15

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.