Nations Bible

Deuteronômio 22

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ atụrụ nwanna gị ka ọ na-akpafu, emela dịka a ga-asị na ị hụghị ya, jide ya, kpụlaara ya onye nwe ya. 2Ọ bụrụ na ị maghị onye nwe ya, maọbụ na nwanna gị ebighị nso, were ya laa nʼụlọ gị, hapụ ya nʼebe ahụ tutu onye nwe ya achọwa ya, mgbe ahụ ka ị ga-ewere ya nyeghachi ya. 3Otu a kwa ka ị ga-eme ma ị hụ ịnyịnya ibu nwanna gị, maọbụ uwe, maọbụ ihe ọbụla ị ga-atụtụta. Were ya debere onye nwe ya.

4Ọ bụrụ na ị hụ ịnyịnya ibu, maọbụ ehi nwanna gị ka ha dara nʼụzọ, elela anya nʼebe ọzọ, gaa nyere ya aka bulie ya.

5Nwanyị ekwesighị iyi uwe ndị ikom, nwoke agaghị eyikwa uwe ndị inyom. Nʼihi na ihe arụ ka ọ bụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.

6Ọ bụrụ na ị hụ akwụ nnụnụ tọgbọ nʼala, maọbụ nke dị nʼelu osisi, ọ bụrụkwa na ọ bụ nnụnụ nke nọ nʼelu ụmụ ya, maọbụ nʼelu akwa ya, ewerela nne na ụmụ nnụnụ ya. 7Hapụ nne nnụnụ ka ọ laa, ma were naanị ụmụ ya. Ihe ga-agakwara gị nke ọma nʼihi ya, ị ga-enwekwa ndụ ogologo.

8Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.

9Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi vaịnị gị. Ọ bụrụ na i mee otu a, ihe ọkụkụ ndị a, na mkpụrụ ha mịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ.

10Ejikọla ehi na ịnyịnya ibu maka ịdọ ihe e ji akọ ala ubi.

11Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ kpaa, dịka uwe ajị anụ na ogho ọcha kpaa.

12Ị ga-akpanyere onwe gị ihe ogho akpara akpa, nʼakụkụ anọ nke uwe mgbokwasị gị.

Mmekọrịta nwoke na nwanyị

13Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na ọ chọkwaghị ịlụ ya ọzọ, 14ọ bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ, 15nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama. 16Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, “Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, ọ chọkwaghị ịlụ ya. 17Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, ‘Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na ọ maghị nwoke.’ Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke.” Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ. 18Ndị okenye obodo ahụ ga-akpọrọ nwoke nyekwa ya ahụhụ. 19Ha ga-emekwa ya ka ọ kwụọ nna nwaagbọghọ ahụ narị shekel ọlaọcha, nʼihi na o boro nwaagbọghọ Izrel na-amaghị nwoke ebubo ụgha. Nwaagbọghọ ahụ ga-anọgide bụrụ nwunye nwoke ahụ. Nwoke ahụ agaghị achụpụkwa ya ụbọchị ndụ ya niile.

20Ma ọ bụrụ na ebubo nwoke ahụ bụ eziokwu, na achọpụtaghị ihe gosiri na nwaagbọghọ ahụ amaghị nwoke. 21A ga-eduru nwaagbọghọ ahụ pụta nʼọnụ ụzọ ụlọ nna ya, nʼebe ahụ ka ndị ikom obodo ya ga-anọ were nkume tugbuo ya. Nʼihi na o mere ihe ihere jọgburu onwe ya nʼIzrel, site nʼibi ndụ akwụna mgbe ọ ka nọ nʼụlọ nne ya na nna ya. Ị ghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ ahụ site nʼetiti unu.

22Ọ bụrụ na e jide nwoke ebe ya na nwunye onye ọzọ dina, ma nwoke ahụ dinara ya ma nwanyị ahụ o dinara aghaghị ịnwụ. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.

23Ma ọ bụrụ na nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ na nwoke ọzọ edinakọọ nʼime obodo, 24ya na nwoke ahụ ka a ga-eduru gaa nʼọnụ ụzọ ama obodo, were nkume tugbuo ha nʼebe ahụ, ka ha nwụọ, nwaagbọghọ ahụ ga-anwụ nʼihi na o tighị mkpu, ma nwoke ahụ ga-anwụ nʼihi na o mebiela nwunye nwoke ibe ya na-achọ ịlụ. Unu aghaghị ikpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti unu.

25Ma ọ bụrụ na nwoke ezute nwaagbọghọ na-amaghị nwoke a na-alụ alụ nʼọhịa, were ike mee ka ha abụọ dina, ọ bụ naanị nwoke ahụ ga-anwụ. 26Aka nwaagbọghọ ahụ dị ọcha, ọ dịghị mmehie o mere nke ikpe ọnwụ ji adịrị ya, nʼihi na ọnọdụ ya dị ka ọnọdụ mmadụ ahụ onye iro ya bịakwasịrị na mberede gbuo ya. 27A pụrụ ị sị na nwaagbọghọ ahụ tiri mkpu ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.

28Ọ bụrụ na nwoke ọbụla ejiri ike jide nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-ekwebeghị nkwa ịlụ, mee ka ha abụọ dinaa, 29nwoke ahụ ga-akwụ nna nwaagbọghọ ahụ iri shekel ọlaọcha ise. Ọ ga-alụkwa nwaagbọghọ ahụ nʼihi na o mebiela ya. Ọ gakwaghị achụpụ ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

30Nwoke ọbụla agaghị alụ nwunye nna ya, nʼihi na ọ bụ nwunye nna ya. Ime ihe dị otu a bụ imerụ ihe ndina nna ya.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Responsabilidade comunitária e conduta social

  • Deuteronômio 22 exige que os israelitas cuidem dos animais perdidos ou caídos de seus irmãos em vez de ignorá-los. Também determina a construção de um parapeito no telhado de uma casa nova para evitar quedas acidentais e afastar a culpa de sangue da família.Fontes: o próprio texto bíblico
  • O capítulo inclui várias proibições específicas contra a mistura de diferentes categorias, como plantar uma vinha com dois tipos de semente, arar com um boi e um jumento juntos e vestir roupas tecidas com lã e linho combinados.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Disputas legais e acusações matrimoniais eram levadas ao julgamento dos anciãos junto à porta da cidade. Na avaliação de casos de agressão, a lei diferenciava ocorrências na cidade, onde a vítima podia gritar por socorro, e no campo aberto, onde não havia socorrista por perto.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.