Nations Bible

Deuteronômio 13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ikpere chi ndị ọzọ

1Ọ bụrụ na onye amụma, maọbụ onye na-akọwa nrọ apụta nʼetiti gị kwee nkwa na ihe ịrịbama maọbụ ihe dị ebube na-aga ime, 2ọ bụrụkwa na ihe ịrịbama ahụ maọbụ ihe ebube ahụ e kwuru maka ya emezuo, emesịa onye amụma ahụ na-asị, “Ka anyị gbaso chi ndị ọzọ dị iche, ka anyị feekwa ha,” bụ chi ndị ị na-amaghị, 3egela okwu onye amụma maọbụ ọrọ nrọ ahụ ntị. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu na-ele unu ule ịmata ma unu jikwa obi unu, na uche unu hụ ya nʼanya. 4Ọ bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu ka unu ga-eso, naanị ya ka unu ga-atụ egwu. Debenụ iwu ya niile na-erubekwara ya isi, na-ejere ya ozi, jidesiekwa ya ike. 5A ga-egbu onye amụma ahụ maọbụ onye ọrọ nrọ ahụ nke chọrọ iduhie unu, nʼihi na ọ chọrọ iweta nnupu isi megide Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, onye gbapụtara unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu. Ihe ọ chọrọ ime bụ iduhie gị, ka ị ghara ibi ụdị ndụ ahụ Onyenwe anyị Chineke gị chọrọ ka i bie. Ọnwụ ya ga-eme ka i wezuga ihe ọjọọ site nʼetiti gị.

6Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị, 7chi nke ndị ala ahụ gbara unu gburugburu, ma ha bụ ndị bi gị nso ma ha bụ ndị bi nʼebe dị anya, site nʼotu nsọtụ nke ala ahụ ruo nsọtụ nke ọzọ), 8ekwenyekwala maọbụ ṅaa ntị nʼihe ọ na-ekwu. Enwekwala obi ebere nʼebe ọ nọ, ekpuchikwala atụmatụ ọjọọ ya niile. 9Ị ghaghị igbu ha. Buru ụzọ setịpụ aka gị tụọ ya nkume, ka ndị ọzọ soro gị tugbuo ya. 10Jiri nkume tugbuo ya, nʼihi na ọ chọrọ ime ka i site nʼiso Onyenwe anyị Chineke, wezuga onwe gị, ka ị pụọ, ma chigharịa site nʼiso ya, bụ Onyenwe anyị, onye mere ka i site nʼala Ijipt pụta, ala ebe ị nọ nʼime ya dịka ohu. 11Izrel niile ga-anụkwa banyere ihe ọjọọ o mere, ha ga-atụkwa ihe ọjọọ dị otu a egwu, ọ dịkwaghị onye ọbụla nʼetiti gị ga-achọkwa ime ihe ọjọọ dị otu ahụ.

12Mgbe i bi nʼobodo ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, ọ bụrụ na akụkọ esite nʼotu obodo ndị a ruo gị ntị sị, 13na ụfọdụ ndị mmadụ jọgburu onwe ha eduhiela ndị obodo ha, na-asị, “Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị na mbụ), 14tupu i mee ihe ọbụla, ị ga-eburu ụzọ jụọ ase, jụpụta nke ọma, ma nyochapụta ma okwu ahụ ọ bụ eziokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na-achọpụtakwara nʼihe arụ dị otu a mere nʼetiti unu, 15ị ghaghị ibuso obodo ahụ agha jiri mma agha gbuo ndị mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ. Ị ghaghị ibibi ya kpamkpam, ma ndị mmadụ ma anụ ụlọ ha. 16Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ. 17Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ Onyenwe anyị dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa. 18Onyenwe anyị Chineke gị ga-eme ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, na-edebezukwa iwu ya niile, nke m na-enye gị taa, ma na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Preservação da Lealdade e o Alerta contra a Apostasia

  • Deuteronômio especifica que o cumprimento de um sinal ou prodígio não autentica automaticamente um profeta. Se o profeta incitar a seguir outros deuses, a mensagem é considerada um teste da lealdade da comunidade, e não uma orientação divina genuína.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Ao tratar da sedução secreta à idolatria praticada por familiares ou amigos próximos, a lei exigia que a própria testemunha lançasse a primeira pedra. Essa exigência colocava uma responsabilidade pessoal direta sobre o acusador e desestimulava falsos testemunhos.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Antes de tomar qualquer medida coletiva contra uma cidade inteira acusada de apostasia, a comunidade era rigorosamente obrigada a realizar uma investigação minuciosa para confirmar os fatos com certeza.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 5, 10

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.