Deuteronômio 1
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Sobre este livro
Sobre Deuteronômio
- O dicionário bíblico de Easton (1897) explica que o nome grego Deuteronomion, a segunda lei, deu origem a Deuteronômio: uma segunda exposição de leis já promulgadas. Afirma que a divisão do Pentateuco em cinco livros foi provavelmente feita primeiro pelos tradutores gregos, seguidos pela Vulgata. Os judeus designam o livro pelas palavras hebraicas iniciais, 'Elle haddabharim, Estas são as palavras.Fontes: Easton: Deuteronomy
- O dicionário bíblico de Easton (1897) apresenta Deuteronômio sobretudo como três discursos proferidos por Moisés pouco antes de sua morte, dirigidos a todo o Israel no décimo primeiro mês do último ano das peregrinações no deserto. Diz que o relato de sua morte e sepultura foi escrito por outra mão, provavelmente a de Josué, que lhe sucedeu como líder de Israel.Fontes: Easton: Deuteronomy · Joshua
- Os discursos de Deuteronômio se passam nas planícies de Moabe, a leste do Jordão e defronte de Jericó, o último acampamento de Israel antes de entrar em Canaã, região então em poder dos amorreus. A leste do Jordão, os israelitas haviam derrotado Seom, rei dos amorreus, cujo país ia do Arnom ao Jaboque, e Ogue, rei de Basã, cujo reino foi dado a Rúben, Gade e à meia tribo de Manassés.Fontes: Easton: Deuteronomy · Moab · Sihon · Og
- O dicionário bíblico de Easton (1897) descreve três discursos: o primeiro (1-4:40) recapitula quarenta anos no deserto, exorta à obediência às ordenanças divinas e adverte contra abandonar o Deus de seus pais; o segundo (5-26:19), o corpo do livro, retoma a lei dada no monte Sinai e instrui Israel para a vida em Canaã; o terceiro (capítulos 27-30) apresenta bênçãos aos obedientes e a maldição sobre os rebeldes, exortando à fidelidade à aliança.Fontes: Easton: Deuteronomy
- O dicionário bíblico de Easton (1897) acrescenta três apêndices após os discursos: um cântico que Deus ordenou a Moisés escrever (32:1-47), bênçãos pronunciadas sobre as tribos (capítulo 33) e o relato de sua morte (32:48-52) e sepultura (capítulo 34). Nos manuscritos hebraicos o Pentateuco forma um só rolo; os judeus dividiram este livro em onze parshioth, e a Bíblia em inglês contém trinta e quatro capítulos.Fontes: Easton: Deuteronomy
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Ụmụ Izrel ebuliekwa ije
1Ndị a bụ okwu ahụ Mosis gwara Izrel niile mgbe ha nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼọzara nʼAraba, ebe chere ihu nʼobodo Suf, nʼetiti Paran na Tofel na Leban, na Hazerọt, na Dizahab. 2Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia.
3Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu banyere ha. 4Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt.
5Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha,
6Onyenwe anyị Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a. 7Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis. 8Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.”
Nhọpụta ndị ndu
9Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10Onyenwe anyị Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. 11Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa. 12Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile? 13Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.”
14Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.”
15Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche. 16Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa. 17Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya. 18Nʼoge ahụ, agwara m unu ihe niile unu na-aghaghị ime.
Nzipụ ndị Nnyopụta
19Emesịa, dịka iwu Onyenwe anyị Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea. 20Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-enye anyị. 21Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”
22Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.”
23Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla. 24Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ. 25Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ Onyenwe anyị Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.”
Nnupu isi ụmụ Izrel
26Ma unu jụrụ ịga nʼala ahụ, si otu a nupu isi megide iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere. 27Unu nọ nʼụlọ ikwu unu tamuo ntamu na-asị, “Nʼezie Onyenwe anyị ahụghị anyị nʼanya. Lee ka o si site nʼala Ijipt dupụta anyị were anyị nyefee nʼaka ndị Amọrait ka ha laa anyị nʼiyi! 28Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak nʼebe ahụ.’ ”
29Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu. 30Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt, 31nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu Onyenwe anyị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”
32Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke unu, 33bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso.
34Ma otu o si dị, mgbe Onyenwe anyị nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị, 35“O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu, 36karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”
37Ọ bụkwa nʼihi unu ka Onyenwe anyị ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ! 38Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha. 39Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa. 40Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.”
41Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide Onyenwe anyị. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka Onyenwe anyị Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu.
42Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’ ”
43Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu. 44Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa. 45Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị. 46Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh.

Você sabia?
Moisés Recorda a Jornada de Israel
- Moisés discursa a Israel nas planícies de Moabe, a leste do Jordão, no quadragésimo ano após o Êxodo, pouco depois de derrotar os reis amorreus Seom e Ogue. O relato observa que a viagem do monte Horebe até Cades-Barneia levava normalmente apenas onze dias, contrastando a curta distância com as décadas de peregrinação causadas pela desobediência.Fontes: o próprio texto bíblico · Sihon · Og · Kadesh-barnea
- Para administrar as disputas à medida que o povo crescia, Moisés estabeleceu um sistema judicial organizado, nomeando líderes respeitados sobre grupos de milhares, centenas, cinquenta e dezenas. Ele ordenou que esses juízes agissem com estrita imparcialidade, ouvindo tanto os pequenos quanto os grandes e julgando com justiça tanto israelitas quanto estrangeiros residentes.Fontes: o próprio texto bíblico
- Ao relembrar a crise em Cades-Barneia, Moisés relata que doze espias exploraram Canaã e retornaram trazendo os frutos férteis da terra. Contudo, o medo generalizado das cidades fortificadas e dos guerreiros altos levou a congregação à rebeldia, provocando o juramento de Deus de que ninguém daquela geração, exceto Calebe e Josué, entraria na terra prometida.Fontes: o próprio texto bíblico · Caleb · Joshua · Kadesh-barnea
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Arabah · 30.417, 35.151 · versículos 1, 7
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículos 1, 5
- Paran · 30.303, 34.777 · versículo 1
- Mount Horeb · Hoje: Jebel Musa · 28.540, 33.973 · versículos 2, 6, 19
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 3, 27, 30
- Bashan · 32.781, 35.935 · versículo 4
- Moab · Hoje: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 5
- Canaan · 32.767, 35.333 · versículo 7
- Euphrates · Hoje: Euphrates River · 31.004, 47.442 · versículo 7
- Lebanon · 33.540, 35.584 · versículo 7
- Negeb · 31.245, 34.841 · versículo 7
- Shephelah · 31.692, 34.875 · versículo 7
- Way of the Red Sea · Hoje: road between the Dead Sea and the Gulf of Aqaba · 29.727, 34.998 · versículo 40
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org