Nations Bible

Daniel 7

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Nrọ Daniel banyere anụ ọhịa anọ

1Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ.

2“Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri. 3Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya.

4“Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere.

5“Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’

6“Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị.

7“Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri.

8“Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi.

9“Anọkwa m na-ele anya

“hụ ka e doziri ocheeze,

ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ.

Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo,

agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha.

Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ,

ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ.

10Iyi na-asọ ka ọkụ

si nʼihu ya na-asọpụta.

Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi.

Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya.

Ndị ikpe nọdụrụ ala,

asaghekwara akwụkwọ dị iche iche.

11“Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. 12(Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge).

13“Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. 14E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.

Nkọwa nrọ ahụ

15“Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji. 16Ejekwuuru m otu nʼime ndị guzo nʼebe ahụ nso jụọ ya ihe ihe ndị a niile pụtara.

“Ọ gwara m ma kọwakwara m ihe ihe ndị a pụtara. 17‘Anụ ọhịa anọ ndị a bụ alaeze anọ nke ga-ebili nʼụwa. 18Ma ọ bụ ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ga-anara alaeze. Ọ ga-abụkwa nke ha ruo mgbe ebighị ebi.’

19“Mgbe ahụ, achọrọ m ịmata ihe banyere anụ ọhịa nke anọ ahụ, nke ahụ gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, na-eyikwa oke egwu, nke nwere eze dịka igwe, na mbọ yiri nke e ji bronz kpụọ. Nke ahụ na-adọwasị ndị mmadụ, na nke na-azọgbukwa ndị fọdụrụ. 20Asịkwa m ya kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya nʼisi pụtara, na ihe banyere mpi nke ọzọ puputara, na ihe mere e ji nyakapụ mpi atọ ahụ nʼihi ya. Asị m ya kọwakwara m ihe banyere mpi ahụ, nke nwere anya, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi, ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndị ọzọ. 21Mgbe m na-ele anya, ahụrụ m ka mpi a na-alụso ndị nsọ ọgụ na-emerikwa. 22Tutu ruo mgbe onye ahụ na-adị site na mbụ bịara kpee ikpe nke gaara ndị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu, ma oge bịakwara mgbe ha natara alaeze ahụ.

23“Nke a bụ ihe o kwuru: ‘Anụ ọhịa nke anọ a bụ alaeze nke ga-apụta nʼụwa. Ọ ga-adị iche site nʼalaeze ndị ọzọ. Ọ ga-azọpịa, kụrie, ma bibiekwa ụwa niile. 24Mpi iri ahụ nọchiri anya ndị eze iri ga-esi nʼalaeze ya pụta. Mgbe ndị eze a ga na-achị, eze ọzọ, nke dị iche site na ndị bụrụ ya ụzọ ga-ebilikwa, ma merie ndị eze atọ ndị ọzọ ahụ ma laa ha nʼiyi. 25Ọ ga-ekwu okwu kwugide Onye kachasị ihe niile elu. O ga-emekpa ndị nsọ ahụ. Ọ ga-agbalịkwa ịgbanwe iwu niile na omenaala niile. A ga-enyefe ndị nsọ nʼaka ya afọ atọ na ọkara.

26“ ‘Ma a ga-emeghe ụlọ ikpe, napụkwa ya ike niile, kpochapụ ya ma laakwa ya nʼiyi kpamkpam. 27Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’

28“Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Visão de Daniel dos Quatro Animais

  • Daniel recebeu esta visão durante o primeiro ano de Belsazar, o último rei da Babilônia. A antiga capital imperial ficava localizada às margens do rio Eufrates, na Mesopotâmia.Fontes: o próprio texto bíblico · Belshazzar · Babylon
  • O capítulo descreve quatro animais monstruosos que surgem de um mar agitado pelos ventos, interpretados a Daniel como quatro reinos terrenos sucessivos que surgiriam antes do estabelecimento de um reino divino eterno.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Após presenciar a visão dos animais e a cena do tribunal onde alguém semelhante a um Filho do Homem recebe domínio eterno, Daniel registrou o sonho, sentindo-se profundamente perturbado e visivelmente pálido.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 1
  • Great Sea · Hoje: Mediterranean Sea · 31.805, 34.170 · versículo 2

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.