Nations Bible

Daniel 11

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Daraiọs onye Midia, ọ bụ m guzoro inyere ya aka na ichekwa ya.)

Ndị eze alaeze nke ugwu na ndịda

2“Ugbu a, aga m agwa gị eziokwu. A ga-enwe ndị eze Peshịa atọ ọzọ ndị ga-achịkwa. A ga-enwe eze nke anọ onye ga-aba ụba karịa ndị ọzọ niile. Mgbe ọ ga-adị ike site akụnụba ya, ọ ga-akpalị onye ọbụla imegide eze Griis. 3Ma mgbe ahụ, a ga-enwe eze dị ike nke ga-eji oke ike chịa. Ọ ga na-eme ihe masịrị ya. 4Ma mgbe ọ rịgotachara nʼọchịchị, a ga-ekposa alaeze ya kesaa ya nʼakụkụ anọ nke ụwa ma ọ bụghị ụmụ ya ga na-achị. Ọ bụghịkwa nʼusoro dịka ike ọchịchị ya si dị, nʼihi na a ga-ehopu alaeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ọzọ na-abụghị ndị agbụrụ ya.

5“Eze nke ndịda ga-adị ike, ma otu onye nʼime ndịisi agha ya ga-adị ike karịa ya, chịakwa alaeze dị ukwu karịa nke ya 6Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna ya na onye ahụ dịnyeere ya.

7“Nʼoge ahụ, otu onye ga-esi nʼagbụrụ ụlọ nwanyị ahụ kulite i were ọnọdụ ya ịchị dịka eze, ọ ga-ebuso ndị agha eze mpaghara ugwu agha, bata nʼebe ya e wusiri ike, ọ ga-alụso ha agha ghọọ onye mmeri. 8Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole. 9Otu a kwa, eze mpaghara ugwu ga-ebuso eze ndịda agha, ma ọ gaghị anọ ọdụ lọghachikwa nʼala nke ya. 10Ma ụmụ ya ndị ikom ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha siri ike, ndị ga-enupu dịka oke idee mmiri, buru agha ruo nʼebe ya e wusiri ike.

11“Mgbe ahụ, eze ndịda, onye iwe ga-eju obi, ga-achịkọtakwa ndị agha nke ya buso eze ugwu agha, onye nke ga-achịkọta ọtụtụ ndị agha, ma ndị a ka ndị iro ya ga-alụgbu. 12Ma mgbe o merichara ndị agha ahụ, ọ ga-enwe ọṅụ dị ukwu, ọ ga-egbukwa imerime puku ndị mmadụ, ma ọ gaghị emeri na-aga nʼihu. 13Mgbe afọ ole na ole gafere, eze ndị mpaghara ugwu ga-eduru ndị agha ji ezi ngwa agha, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ karịa ndị nke e meriri nʼagha na mbụ pụọ ibu agha.

14“Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị ga-ebili imegide eze ndịda, Ụfọdụ ndị ọkpa aghara nʼetiti unu ga-enupukwa isi, ha ga-esi otu a mezuo ihe a ị hụrụ nʼọhụ, ma a ga-emeri ha. 15Mgbe ahụ, eze ndị mpaghara ugwu ga-abịa buo agha megide obodo ndị ndịda e wusiri ike, lụgbukwaa ya. Ndị agha agaghị enwe ike iguzogide ha ọ bụladị ndị ha bụ ọka ibe nʼagha. 16Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya. 17Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru. 18Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere. 19Ọ ga-echigharị azụ chee ihu ya ebe niile e wusiri ike nke ala nke ya, ọ ga-asọ ngọngọ daa, a gaghị ahụkwa ya ọzọ.

20“Otu onye ga-abịa nọchie ọnọdụ ya, ọ ga-ezipụ onye ga-ekegbu ndị mmadụ nʼụtụ iji mee ka otuto nke alaeze ahụ daa, ma nʼime ụbọchị ole na ole, a ga-egbu ya, ma ọ gaghị abụ nʼagha maọbụ nʼihu mmadụ.

21“Nʼọnọdụ ya, otu onye ọjọọ e ledara anya ga-ebilite, onye na-ekwesighị iwere nsọpụrụ nke ya bụ ọchịchị. Ọ ga-abata nʼike nʼalaeze ahụ mgbe ndị ya nọ nʼudo, ọ ga-eji nwayọọ ma were ire ụtọ na aghụghọ nweta alaeze ahụ. 22Mgbe ahụ, ọ ga-achụsasị igwe ndị agha niile, bibiekwa ha na onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ. 23Mgbe ọ banyesịrị nʼọgbụgba ndụ, ọ ga-eji aghụghọ na-eme mpu, ọ ga na-esiwanye ike nʼagbanyeghị nʼọnụọgụgụ ndị mmadụ dị ole na ole. 24Ọ ga-abanye nʼakụkụ ala ahụ niile a maara ndị bara ụba bi, mee nʼebe ahụ ihe ndị buru ya ụzọ na-emebeghị. Ọ ga-ekesara ndị mmadụ akụnụba na ihe nkwata ndị ọzọ ọ lụtara nʼagha. Ọ ga-atụpụta aro iji lụso obodo siri ike ọgụ, ma nke ahụ ga-adị nwa mgbe nta.

25“Mgbe ahụ, ọ ga-emesi onwe ya obi ike, chịkọtaa ọtụtụ ndị agha ibuso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-achịkọtakwa ndị agha dị ọtụtụ dịkwa ike lụso ya ọgọ ma ọ gaghị enwe ike guzogide ya nʼihi izuzu nzuzo a gbara megide ya. 26Nʼihi na ndị na-eri ihe ọma eze ga-etipịa ya. A ga-achụsa ndị agha ya, ma gbukwaa ọtụtụ nʼọgbọ agha. 27Ndị eze abụọ a, ndị obi ha jupụtara nʼihe ọjọọ ga-anọkọta nʼotu tebul na-agwarịta ibe ha okwu ụgha, ma nzukọ ha agaghị enwe isi, nʼihi ọgwụgwụ ahụ ga-adị mgbe a kara aka ruru. 28Ọ ga-eji akụnụba dị ukwuu laghachi nʼobodo nke ya ma obi ya ga-adị imegide ọgbụgba ndụ nsọ ahụ. Ọ ga-ebili imegide ya ma mesịa laghachi nʼobodo nke aka ya.

29“Ma mgbe oge ahụ a kara aka ruru, ọ ga-achịrịkwa ndị agha ya laghachi na ndịda, ma ihe agaghị adị otu ọ dị na mbụ. 30Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado.

31“Ndị agha ya ga-ebili imerụ ebe ahụ e wusiri ike nke ụlọnsọ ukwu ahụ, kwụsịkwa aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị. Ha ga-ewuli ihe arụ nke na-eweta mbibi. 32Ọ ga-eji ire ụtọ merụọ ndị ahụ mebiri iwu nke ọgbụgba ndụ. Ma ndị ahụ maara Chineke ha ga-adị ike guzogide ya.

33“Ndị niile nwere uche ga-ezi ọtụtụ mmadụ ihe, ma na nwa oge nta, ụfọdụ ga-anwụ site na mma agha, ụfọdụ ka a ga-akpọ ọkụ, ụfọdụ ka a ga-adọta nʼagha, ụfọdụ kwa ka a ga-apụnara ihe ha nwere. 34Mgbe ha ga-ada, inyeaka ntakịrị ga-abịara ha, ọtụtụ ndị mmadụ ga-ejikwa ụzọ aghụghọ bịa dịnyere ha. 35Nʼoge ahụ, ụfọdụ nʼime ndị maara ihe ga-asọ ngọngọ, ka ha nwe ike bụrụ ndị a nụchara anụcha, na ndị a sachapụrụ ọcha na ndị emere ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ tutu ruo nʼọgwụgwụ ihe ndị a, nʼihi nʼoge ahụ ga-abịa mgbe akara aka.

Eze nke na-ebuli onwe ya elu

36“Eze ahụ ga-eme ihe ọbụla ọ chọrọ. Ọ ga-agụkwa onwe ya dịka onye dị ukwuu karịa chi niile. Nʼezie, ọ ga-ekwu okwu nkwulu megide Chineke kachasị chi niile. Ma ihe ga-agakwara ya nke ọma tutu mgbe oge ya zuru. Nʼihi na ihe niile ekwuru ga-emezucha. 37Ọ gaghị akpọ chi nke nna ha maọbụ nke ahụ ụmụ nwanyị na-achọsi ike ihe ọbụla, o nweghị chi ọbụla ọ ga-akpọ ihe nʼihi na ọ ga-ebuli onwe ya elu karịa ha niile. 38Kama chi nke ọ ga-asọpụrụ bụ chi nke ebe e wusiri ike, chi nke nna ya ha na-amaghị. Ọ ga-eji ọlaedo na ọlaọcha, na nkume dị oke ọnụahịa na onyinye dara oke ọnụahịa fee chi a. 39Ọ ga-emegide ebe niile e wusiri ike, nke siri ike site nʼinyeaka chi nke mba ọzọ. Ndị niile nabatara ya ka ọ ga-eme ka nsọpụrụ bara ụba. Ọ ga-eme ha ndị ọchịchị ọtụtụ mmadụ, kenyekwa ha ala dịka ụgwọ ọrụ ha.

40“Ma nʼoge ikpeazụ, eze ndịda ga-ebuso ya agha, ma eze nke ugwu ga-eji iwe chịkọta ndị agha na-agba ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ji ụgbọ mmiri megide ya. Ọ ga-ebuso ọtụtụ mba agha, kpochapụ ha dịka idee mmiri si ekpochapụ ihe. 41Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya. 42Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya. 43Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya. 44Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi. 45Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Os Reis do Norte e do Sul

  • O capítulo começa com a previsão de governantes persas promovendo conflitos contra o reino da Grécia, seguidos por um monarca poderoso cujo vasto império é rapidamente dividido em quatro reinos distintos, em vez de ser herdado por seus descendentes.Fontes: o próprio texto bíblico · Persia · Greece
  • A profecia delineia gerações de guerras, tratados e casamentos dinásticos entre os reinos do Norte e do Sul, culminando em um governante traiçoeiro que profana a fortaleza do templo e abole o sacrifício diário.Fontes: o próprio texto bíblico · Egypt
  • Em meio a extensas campanhas militares pela região e em direção ao Egito, os territórios vizinhos identificados como Edom e Moabe são destacados como poupados do alcance do invasor.Fontes: o próprio texto bíblico · Edom · Moab

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Greece · 37.972, 23.727 · versículo 2
  • Persia · 34.806, 48.516 · versículo 2
  • South · Hoje: South 3 · 31.183, 29.896 · versículos 5, 6, 7, 9, 11, 12, 14, 15, 17, 25, 29, 40
  • North · 36.227, 36.172 · versículos 6, 7, 8, 9, 11, 13, 15, 16, 28, 40
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 8, 42, 43
  • Canaan · 32.767, 35.333 · versículos 16, 41
  • Kittim · Hoje: Cyprus · 35.000, 33.000 · versículo 30
  • Ammon · 31.955, 35.934 · versículo 41
  • Edom · 30.746, 35.604 · versículo 41
  • Moab · Hoje: Moab 1 · 31.181, 35.701 · versículo 41

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.