Atos 7
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Stivin agọrọ onwe ya
1Onyeisi nchụaja sịrị ya, “Ị nụrụ ihe ndị a, ọ bụ eziokwu?”
2Ọ sịrị, “Ụmụnna m na ndị nna, geenụ m ntị. Chineke onye dị ebube gosiri nna nna anyị Ebraham onwe ya mgbe ọ nọ na Mesopotamịa, tupu ọ gaa biri na Haran. 3Ọ gwara ya, ‘Site nʼobodo gị na nʼetiti ndị ikwu gị pụọ, gaa nʼala m ga-egosi gị.’
4“Ya mere, o sitere nʼobodo ndị Kaldịa pụọ, gaa biri na Haran. Mgbe nna ya nwụrụ, Chineke zitere ya nʼala a ebe unu bi ugbu a. 5O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa. 6Ma Chineke gwara ya otu a, na, ‘Ụmụ ụmụ ya ga-ebi dịka ndị ọbịa nʼala na-abụghị nke ha, ndị ga-eji ha mere ohu, ma mejọọkwa ha narị afọ anọ. 7Mana aga m ata mba ahụ ha na-efe dịka ohu ahụhụ.’ Chineke kwukwara sị, ‘Mgbe nke a gasịrị, ha ga-esi na mba ahụ pụta, bịa fee m ofufe nʼebe a.’ 8O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.
9“Nʼihi na ndị nna ochie ahụ nwere ekworo nʼebe Josef nọ. Ha resi ya ndị Ijipt dịka ohu. Ma Chineke nọnyeere ya, 10zọpụta ya na mkpagbu ya niile, mee ka o nwee ihuọma na amamihe nʼihu Fero eze Ijipt. Onye mere ya onye ọchịchị nʼala Ijipt na onye nlekọta nke ezinaụlọ ya niile.
11“Nʼoge ahụ, ụnwụ dara nʼala Ijipt na nʼala Kenan. Ụnwụ a wetara ahụhụ dị ukwuu. Nna nna anyị ha enwekwaghị ike ịchọta nri. 12Ma mgbe Jekọb nụrụ na nri ọka dị nʼala Ijipt, o zipụrụ nna nna anyị ha ka ha gaa njem mbụ ha nʼIjipt. Nke a bụ oge nke mbụ ha na-aga Ijipt. 13Mgbe ha gara Ijipt nke ugboro abụọ, Josef mere ka ụmụnne ya mata ya, Fero matakwara ụmụnne Josef. 14Mgbe ahụ, Josef ziri ozi ka a kpọta nna ya bụ Jekọb na ndị ikwu ya, ndị dị iri mmadụ asaa na ise ka ha bịakwute ya. 15Jekọb gara Ijipt. Ebe ahụ ka ya na nna nna anyị ha nọkwa nwụọ. 16E budatara ozu ha na Shekem, ebe e liri ha nʼili nke Ebraham jiri ego ọlaọcha zụta nʼaka ụmụ Hamọ nʼala Shekem.
17“Ma mgbe oge ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa na-abịaru nso, ndị Izrel nọ nʼIjipt mụbara nke ukwuu, 18ruo mgbe eze ọzọ nke na-amaghị Josef, bidoro ịchị ọchịchị nʼala Ijipt. 19O megburu ndị agbụrụ anyị, kpagbukwaa ha. Manye ndị nna nna anyị ha ka ha tufuo ụmụ ọhụrụ ha, ka ha ghara ịdị ndụ.
20“Ọ bụ nʼoge a ka a mụrụ Mosis, ọ mara mma nke ukwuu nʼanya Chineke. A zụrụ ya naanị ọnwa atọ nʼụlọ nna ya. 21Mgbe e tufuru ya, ada Fero kpọọrọ ya, zụọ ya dị ka nwa nwoke nke aka ya. 22A zụrụ Mosis nʼamamihe niile nke ndị Ijipt, ọ bụrụ dike nʼokwu na nʼọrụ ịtụnanya.
23“Mgbe ọ gbara iri afọ anọ, ọ batara ya nʼuche ịga ileta ụmụnna ya ndị Izrel. 24Mgbe ọ hụrụ otu onye nʼime ha nke onye Ijipt na-emegide ya, ọ lụtara ya ọgụ, bọtakwara ya ọbọ site nʼigbu onye Ijipt ahụ. 25Mosis chere na ụmụnna ya ga-aghọta na Chineke akpọlitela ya isite nʼaka ya napụta ha. Ma ha aghọtaghị. 26Nʼụbọchị ọzọ sonụ, Mosis hụrụ ụmụnna ya ndị Izrel abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nʼetiti ha, sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emejọrịta onwe unu?’
27“Ma nwoke ahụ nke na-emegbu nwanna ya nupuru ya sị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe nʼetiti anyị? 28Ị na-achọ igbu m dị ka i si gbuo onye Ijipt ụnyaahụ?’ 29Mgbe ọ nụrụ nke a, Mosis gbara ọsọ, gaa biri dị ka ọbịa nʼala Midia. Nʼebe ahụ ka ọ nọ mụta ụmụ nwoke abụọ.
30“Mgbe iri afọ anọ gafere, e mere ka Mosis hụ mmụọ ozi nʼọkụ na-ere ọhịa dị nʼọzara, nʼakụkụ Ugwu Saịnaị. 31Ma mgbe ọ hụrụ nke a, o juru ya anya. Dị ka ọ na-agaru nso ka o leruo ya anya, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka ọ dara, sị, 32‘Abụ m Chineke nna nna gị ha. Chineke nke Ebraham, nke Aịzik na nke Jekọb.’ Ụjọ mere ka Mosis maa jijiji, na o nweghị ike ilegide ya anya.
33“Ma Onyenwe anyị gwara ya, ‘Yipụ akpụkpọụkwụ gị. Nʼihi na ebe ahụ i guzo bụ ala dị nsọ. 34Ahụla m otu e si akpagbu ndị m nọ nʼala Ijipt. Anụla m ịsụ ude ha bịakwa ịzọpụta ha. Ugbu a bịa, aga m ezighachi gị nʼIjipt.’
35“Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ. 36O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.
37“Onye a bụ Mosis ahụ gwara ụmụ Izrel, sị, ‘Chineke ga-eme ka onye amụma nke dị ka m, biliere unu site nʼetiti ụmụnne unu.’ 38Ya onwe ya nọ nʼọgbakọ nʼọzara, ya na mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nʼUgwu Saịnaị, na nna nna anyị ha; ebe ọ natakwara okwu dị ndụ inye anyị.
39“Ma nna nna anyị ha jụrụ irubere ya isi. Kama ha nupuru ya nʼakụkụ, ma tụgharịa laghachi azụ nʼIjipt nʼobi ha, 40na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’ 41Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha. 42Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma,
“ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m
iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
43Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk
na kpakpando nke chi unu bụ Refan,
bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha.
Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
44“Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis. 45Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid. 46Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi. 47Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48“Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49“ ‘Eluigwe bụ ocheeze m.
Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.
Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m?
Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị?
Ka Onyenwe anyị kwuru.
50Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile?’
51“Unu ndị isiike! Ndị obi ha, na ntị ha kpọchiri akpọchi ịnụ ihe. Ndị na-ajụ ịnabata Mmụọ Nsọ dịka nna nna unu ha mere. 52Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya. 53Unu bụ ndị natara iwu Chineke dịka e nyere ya site nʼaka ndị mmụọ ozi, ma unu edebeghị ya.”
Ọnwụ Stivin
54Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, iwe were ha nke ukwu. Ha tara ikikere eze nʼiwe na nʼọnụma nʼebe ọ nọ. 55Ma ebe o jupụtara na Mmụọ Nsọ, o lere anya nʼeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nʼaka nri Chineke. 56Ọ sịrị, “Lee, ana m ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa Nwa nke Mmadụ ka ọ na-eguzo nʼaka nri Chineke.”
57Ha mere ụzụ dị ukwuu, were mkpịsịaka ha rụchie ntị ha. Ha niile gbara ọsọ gaa nụkwasị ya, 58dọkpụrụ ya pụọ nʼazụ obodo malite ịtụ ya nkume. Nʼoge a, ndị akaebe wụsara uwe ha nʼụkwụ otu nwokorobịa a na-akpọ Sọl.
59Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.” 60O gburu ikpere nʼala werekwa oke olu tie mkpu, “Onyenwe anyị, biko agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusiri nke a, ọ dara nʼala nwụọ.

Você sabia?
Estêvão reconta a história de Israel
- Estêvão abre o discurso com Abraão ainda na Mesopotâmia, antes de se estabelecer em Harã, quando recebeu a ordem de deixar sua terra e seus parentes. Mesopotâmia — em hebraico Aram-naharaim, “Síria dos dois rios” — era o nome que gregos e romanos davam à região entre o Eufrates e o Tigre; no Antigo Testamento ela também se chama Padan-aram, “a planície de Arã”, e o norte desse planalto foi o lar antigo dos antepassados dos hebreus. O Easton's Bible Dictionary (1897) observa que esse primeiro chamado não aparece no Antigo Testamento, embora Gênesis 12 o deixe implícito, e que Abraão saiu de Ur, na Caldeia, e percorreu cerca de 300 milhas ao norte, até Harã.Fontes: o próprio texto bíblico · Mesopotamia · Abraham
- Estêvão afirma que os ossos de Jacó e dos pais foram levados de volta a Siquém e depositados no túmulo que Abraão comprara aos filhos de Hamor. O Easton's Bible Dictionary (1897) identifica Hamor como um heveu cujo nome significa “jumento”, nota que em Atos 7:16 ele é chamado Emmor e diz que Jacó lhe comprou o terreno de Siquém em que José foi sepultado mais tarde. O verbete acrescenta que Siquém, filho de Hamor, fundou a cidade que recebeu o seu nome.Fontes: o próprio texto bíblico · Hamor
- Estêvão localiza a sarça ardente no deserto, perto do monte Sinai, e diz que Moisés recebeu ali palavras vivas da parte do anjo que lhe falou no monte. O Easton's Bible Dictionary (1897) trata Sinai — nome ligado a Sin, um deus da lua — como o mesmo distrito montanhoso também chamado Horebe. Segundo o verbete, os hebreus chegaram a essa região no terceiro mês após o Êxodo, depois de uma viagem de cerca de 150 milhas desde o mar Vermelho, com todas as voltas do caminho, e ficaram acampados cerca de um ano.Fontes: o próprio texto bíblico · Mount Sinai
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Haran · Hoje: Harran · 36.864, 39.033 · versículos 2, 4
- Mesopotamia · Hoje: Aram-naharaim · 36.864, 39.033 · versículo 2
- Chaldea · 30.962, 46.104 · versículo 4
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 9, 10, 11, 12, 14, 15, 17, 18, 34, 36, 39, 40
- Canaan · 32.767, 35.333 · versículo 11
- Shechem · Hoje: Tell Balatah · 32.214, 35.282 · versículo 16
- Nile · Hoje: Nile River · 31.465, 30.367 · versículo 19
- Midian · 28.495, 35.012 · versículo 29
- Babylon · 32.543, 44.422 · versículo 43
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org