Atos 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ọbịbịa nke Mmụọ Nsọ
1Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe. 2Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. 3Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. 4Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike.
5Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe. 6Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche. 7Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili? 8Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche? 9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa, 10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa 11(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.” 12O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụ?”
13Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.”
Okwu Pita banyere Kraịst
14Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. 15Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ. 16Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru,
17“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma,
ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ,
ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha,
ka m ga-awụkwasị Mmụọ m.
Ha ga-ebukwa amụma.
19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe,
gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa,
ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ.
20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị,
ọnwa ga-aghọkwa ọbara,
tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube.
21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku
aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
22“Ndị Izrel, geenụ ntị nʼokwu a, Jisọs onye Nazaret bụ nwoke Chineke gosiri unu, site nʼọrụ dị ike, nʼọrụ ebube nakwa ihe ịrịbama niile nke Chineke rụrụ nʼetiti unu site nʼaka ya, dịka unu ji anya unu hụ. 23Onye a ka e weere nyefee unu nʼaka site na nzube nke Chineke buru ụzọ tụọ atụmatụ ya, na dịka o siri mara na mbụ, ọ bụ ya ka unu gburu ma kpọgidekwa nʼobe site nʼaka ndị na-amaghị iwu. 24Ma Chineke emela ka o site nʼọnwụ bilie mgbe ọ tọpụchara ihe mgbu nke ọnwụ, nʼihi na ọnwụ enweghị ike ijide ya. 25Devid kwuru banyere ya,
“ ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgide nʼihu m mgbe niile.
Nʼihi na ọ nọ nʼaka nri m.
Agaghị m ama jijiji.
26Ya mere, ọṅụ jupụtara m obi, ire m na-aṅụrịkwa ọṅụ;
anụ ahụ m ga-ezukwa ike nʼolileanya,
27nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ,
ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure.
28I mere ka m mara ụzọ nke ndụ;
ị ga-emekwa ka m jupụta nʼọṅụ nʼihu gị.’
29“Ụmụnna m, eji m nkwuwa okwu na-agwa unu banyere nna nna anyị Devid, bụ onye nwụrụ anwụ e lie ya. Ili ya dịkwa nʼetiti anyị taa. 30Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya. 31Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure. 32Ọ bụ Jisọs a ka Chineke mere ka ọ dị ndụ ọzọ. Anyị niile bụkwa ndị akaebe banyere ya. 33Ebe ọ bụ na e buliela ya elu nʼaka nri Chineke. Ọ natala Mmụọ Nsọ dịka Nna ya kwere na nkwa. Ihe a unu na-ahụ na nke unu na-anụ bụ onyinye ya ọ wụkwasịrị anyị. 34Ọ dịghị oge Devid jiri rigoro nʼeluigwe, ma ya onwe ya sịrị,
“ ‘Onyenwe anyị gwara Onyenwe m sị,
“Nọdụ ala nʼaka nri m,
35ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị
ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị.” ’
36“Ya mere, ana m eme ka ezinaụlọ Izrel niile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs a onye unu kpọgidere nʼobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Kraịst.”
37Mgbe ha nụrụ ihe ndị a, akọnuche ha mara ha ikpe. Ha sịrị Pita na ndị ozi ndị ọzọ, “Ụmụnna, gịnị ka anyị ga-eme?”
38Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ. 39Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”
40O jiri ọtụtụ okwu ndị ọzọ gbaa ama, ma dụọkwa ha ọdụ sị, “Sitenụ nʼetiti ọgbọ a jọrọ njọ zọpụta onwe unu.” 41E mere ndị nabatara okwu ya baptizim, ha dị ihe ruru puku mmadụ atọ, a gụnyere nʼọnụọgụgụ ha.
Nnọkọ nke ndị kwere ekwe
42Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere. 43Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche. 44Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ. 45Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị. 46Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele. 47Dịka ha gara nʼihu na-eto Chineke, ha nwetara ihuọma nʼaka ndị mmadụ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha ndị a na-azọpụta kwa ụbọchị.

Você sabia?
O Espírito vem no Pentecostes
- Judeus tementes a Deus, de todas as nações debaixo do céu, já moravam em Jerusalém quando um som como o de um vento forte e impetuoso veio do céu e encheu a casa, e os que falavam começaram a anunciar as maravilhas de Deus em outras línguas. Neste capítulo, “Ásia” é a província romana da Ásia Proconsular, na parte ocidental da Ásia Menor, cuja capital era Éfeso — e não o continente com esse nome. O Ponto, ao longo da costa sul do mar Euxino, era uma província romana no tempo dos apóstolos e um lugar frequentado por muitos judeus da Dispersão; a Capadócia era a província mais oriental e a maior da Ásia Menor.Fontes: o próprio texto bíblico · Asia · Pontus · Cappadocia
- A multidão ficou espantada de que os que falavam fossem galileus. Quem se levantou com os Onze e lhes falou foi Simão Pedro, chamado antes Simão — isto é, Simeão, que significa “ouvir” —, um pescador de Betsaida, na costa ocidental do mar da Galileia, a quem seu irmão mais novo, André, levou primeiro a Jesus.Fontes: o próprio texto bíblico · Simon Peter
- Pedro disse que aquilo era o que havia falado o profeta Joel. Joel, o segundo dos doze profetas menores, era filho de Petuel, e sua história pessoal só é conhecida pelo seu livro. Pedro também citou Davi, o oitavo e o mais novo dos filhos de Jessé, de Belém, e disse à multidão que esse patriarca havia morrido e fora sepultado, e que seu túmulo ainda estava com eles em Jerusalém.Fontes: o próprio texto bíblico · Joel · David
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 5, 14
- Galilee · 32.760, 35.527 · versículo 7
- Asia · 38.400, 28.300 · versículo 9
- Cappadocia · 38.671, 34.839 · versículo 9
- Judea · Hoje: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículos 9, 14
- Mesopotamia · Hoje: Aram-naharaim · 36.864, 39.033 · versículo 9
- Pontus · 40.680, 37.830 · versículo 9
- Cyrene · 32.821, 21.851 · versículo 10
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 10
- Libya · 32.821, 21.851 · versículo 10
- Pamphylia · 37.000, 31.000 · versículo 10
- Phrygia · 39.000, 31.000 · versículo 10
- Rome · 41.892, 12.485 · versículo 10
- Nazareth · 32.702, 35.298 · versículo 22
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org