Nations Bible

Atos 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Nzukọ dị mkpa na Jerusalem

1Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.” 2Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwuu. Nʼihi nke a, ha kpebiri ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndịisi ndị ọzọ soro gaa Jerusalem hụ ndị ozi na ndị okenye nke nzukọ maka okwu a. 3Nzukọ ahụ zipụrụ ha nʼụzọ ha, mgbe ha sitere Fonisia na Sameria na-agafe, ha kọrọ otu ndị mba ọzọ siri chegharịa. Nke a wetara ndị niile kwere ekwe oke ọṅụ dị ukwuu. 4Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.

5Ma ụfọdụ ndị kwere ekwe si nʼotu ndị Farisii biliri na-ekwu sị, “Na ọ dị mkpa ka e bie ha ugwu ma gwakwa ha ka ha dobe iwu Mosis.”

6Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye zukọtara itule okwu a. 7Mgbe ha nọ tulegide okwu ahụ ruo oge dị anya, Pita guzoro ọtọ sị ha, “Ụmụnna m, unu niile maara na site na mbụ Chineke họpụtara m site nʼetiti unu, ka m zisaa oziọma ahụ nye ndị mba ọzọ ka ha nụrụ, ma kwerekwa. 8Chineke a, onye maara obi mmadụ niile gbaara ha akaebe site nʼinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dịka anyị si nata ya na mbụ. 9O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe. 10Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ? 11Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”

12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ. 13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị. 14Saimọn akọọlara anyị otu Chineke si buru ụzọ lekọta ndị mba ọzọ site na isite nʼetiti ha họpụtara onwe ya ndị ga-ekwere na aha ya. 15Nke a na okwu ndị amụma dakọtara, dịka e dere ya,

16“ ‘Mgbe nke a gasịrị, aga m alọghachi,

aga m ewughachikwa ụlọ ikwu Devid nke dara ada.

Ebe ya niile dakpọsịrị adakpọsị ka m ga-ewugharịkwa,

aga m emekwa ka ọ guzozie,

17ka ndị fọdụrụ nʼetiti mmadụ nwe ike chọọ Onyenwe anyị,

ọ bụladị ndị mba ọzọ niile ndị a kpọkwasịrị aha m,

ka Onyenwe anyị kwuru, onye na-emekwa ihe ndị a.’

18Nke a amaara site na mgbe ochie.

19“Nʼihi nke a, mkpebi ikpe m bụ nke a, ka anyị ghara isogbu ndị mba ọzọ lọghachikwutere Chineke, 20kama o kwesiri ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri nri ọbụla e ji chụọrọ arụsị aja. Ka ha wezugakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. 21Site na mbụ, Mosis nwere ndị na-ekwusa iwu nʼobodo niile. A na-agụkwa ya nʼụlọ nzukọ nʼụbọchị izuike niile.”

Akwụkwọ e degaara ndị mba ọzọ

22Mgbe ahụ, ndị ozi na ndị okenye, ha na nzukọ niile, kpebiri ka a họpụta ndị ikom a ga-eziga Antiọk ha na Pọl na Banabas. Ha họpụtara Judas onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị ndu so nʼetiti ụmụnna. 23Ha nyekwara ha nʼakwụkwọ ozi dị otu a,

Akwụkwọ a sitere nʼaka ndị ozi, na ndị okenye ndị bụ ụmụnna unu.

A na-edetara ya unu ndị sitere na mba ọzọ kwere bụ ndị nọ nʼAntiọk, Siria na Silisia.

Ekele.

24E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị otu anyị ebuterela unu nsogbu na ọgbaaghara, mee ka obi lọọ unu mmiri, na-emebi mkpụrụobi unu. Ma nʼezie, ha anataghị ike nʼaka anyị ime nke a. 25Nʼihi nke a, anyị zukọrọ, sitekwa nʼotu obi kpebie ịhọpụta ụfọdụ ndị ikom na izitere unu ha, ha na ndị anyị hụrụ nʼanya, bụ Pọl na Banabas, 26ndị ikom werela ndụ ha tụnye nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 27Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas ndị ga-akọwara unu nʼihu nʼihu, ihe anyị dere nʼakwụkwọ a. 28Nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi nʼanya Mmụọ Nsọ na nʼanya anyị kwa, na o kwesighị ka anyị bokwasị unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa. 29Ma o kwesiri ka unu hapụ iri ihe ọbụla e jiri chụọ aja nye arụsị, ya na iri anụ ọbụla a nyagburu anyagbu, maọbụ ọbara. Kewapụkwanụ onwe unu site nʼịkwa iko. Ọ bụrụ na unu eme ihe ndị a, unu mere nke ọma. Nọọnụ nke ọma.

30Ya mere, e zipụrụ ha, ha jeruokwa Antiọk. Mgbe ha kpọkọrọ nzukọ ahụ, ha nyere ha akwụkwọ ozi ahụ. 31Mgbe ndị otu ọgbakọ ahụ gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu nʼihi agbamume ha natara. 32Judas na Saịlas, ndị ha onwe ha bụ ndị amụma, kwuru ọtụtụ okwu, iji gbaa ha ume na ime ka okwukwe ndị kwere ekwe guzosie ike. 33Mgbe ha nọnyesịrị ha nwa oge nta, ndị kwere ekwe ji ngọzị nke udo zilaga ha ka ha laghachikwuru ndị zitere ha. 34Ma ọ masịrị Saịlas ịnọtukwu nʼebe ahụ. 35Pọl na Banabas nọgidere nʼAntiọk, ebe ha na ndị ọzọ kuziri ihe ma kwusakwa okwu Onyenwe anyị.

Nkewa nke dị nʼetiti Pọl na Banabas

36Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Pọl gwara Banabas, “Ka anyị gaghachi nʼobodo niile anyị kwusara okwu Onyenwe anyị nʼotu nʼotu, mata ka ndị kwere ekwe si agbalị nʼebe ahụ.” 37Banabas chọrọ ka ha na Jọn onye a na-akpọ Mak soro gaa. 38Ma Pọl echeghị na o ziri ezi iduru ya nʼihi na ọ hapụrụ ha na Pamfilia. O sokwaghị ha jezuo ozi ha. 39Ịrụ ụka dapụtara nʼetiti ha siri ike nke mere na ha kewara. Banabas kpọrọ Jọn Mak banye nʼụgbọ gawa Saiprọs. 40Ma Pọl họọrọ Saịlas, kpọrọ ya gawa njem, mgbe ụmụnna kpesịrị ha ekpere raara ha nye nʼamara Onyenwe anyị. 41O jegharịrị nʼime obodo Siria na Silisia na-agba nzukọ nọ nʼebe ahụ ume.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

O concílio sobre os crentes gentios

  • A controvérsia começou em Antioquia, às margens do Orontes, cerca de trezentas milhas ao norte de Jerusalém, cidade que então ocupava o terceiro lugar entre as cidades do Império Romano, depois de Roma e Alexandria. A caminho do concílio, Paulo e Barnabé passaram pela Fenícia, uma faixa litorânea de cerca de cento e vinte milhas, e pela Samaria. Uma nota cronológica data o Concílio de Jerusalém em 46 d.C.Fontes: Antioch (Syria) · Phenicia · o próprio texto bíblico · Jerusalem Council
  • O Easton's Bible Dictionary (1897) afirma que Tiago, a quem chama de irmão ou parente próximo de Jesus, dirigia a igreja em Jerusalém e presidiu o concílio sobre os gentios. A carta que se seguiu foi endereçada aos crentes gentios em Antioquia, na Síria e na Cilícia. A Cilícia, província de origem de Paulo e província marítima romana no sudeste da Ásia Menor desde 67 a.C., incluía sua cidade natal, Tarso.Fontes: James (Brother of Jesus) · o próprio texto bíblico · Cilicia · Paul
  • Judas, chamado Barsabás, e Silas, também conhecido como Silvano, eram profetas e homens de destaque da igreja de Jerusalém, enviados para confirmar pessoalmente a decisão do concílio. Um desentendimento posterior e acirrado por causa de João Marcos, primo de Barnabé, separou os dois missionários: Barnabé levou Marcos e embarcou para Chipre, enquanto Paulo escolheu Silas. Uma nota cronológica data essa separação em 47 d.C.Fontes: o próprio texto bíblico · Silas · John Mark · Paul and Barnabas part ways

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Antioch · Hoje: Antioch on the Orontes · 36.227, 36.172 · versículos 1, 22, 23, 30, 35
  • Judea · Hoje: Judea 1 · 31.777, 35.234 · versículo 1
  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 3, 4, 22, 23, 33
  • Phoenicia · 33.271, 35.196 · versículo 3
  • Samaria · Hoje: Samaria 2 · 32.276, 35.195 · versículo 3
  • Cilicia · 36.913, 34.892 · versículos 23, 41
  • Syria · Hoje: Syria 2 · 33.511, 36.306 · versículos 23, 41
  • Pamphylia · 37.000, 31.000 · versículo 38
  • Cyprus · 35.000, 33.000 · versículo 39

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.