2 Samuel 5
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Devid abụrụ eze ndị Izrel niile
1Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ. 2Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”
3Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.
4Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ. 5Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ,
Devid adọta Jerusalem nʼagha
6Eze na ndị ikom ya zọọrọ ije garuo Jerusalem ibuso ndị Jebus bi nʼebe ahụ agha. Ndị Jebus gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a, ọ bụladị ndị ìsì na ndị ngwụrọ nwere ike ịchụghachi gị azụ.” Ha na-eche sị, “Devid agaghị abata nʼebe a,” 7nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
8Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.”
9Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike, kpọọ ya obodo Devid. O wuru akụkụ ebe dị gburugburu ya, site na Milo baa ruo nʼime ya. 10Ma ọ gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere ya.
11Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze. 12Mgbe ahụ, Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel.
13Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị. 14Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn, 15Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia, 16Elishama, Eliada na Elifelet.
Devid emerie ndị Filistia
17Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike. 18Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile. 19Mgbe ahụ, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?”
Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”
20Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “ Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim. 21Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.
22Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim. 23Nʼihi nke a, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ. 24Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na Onyenwe anyị eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.” 25Devid mere dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza.

Você sabia?
Davi rei sobre todo o Israel e a conquista de Jerusalém
- Após reinar por sete anos e meio em Hebrom, Davi unificou Israel e conquistou a fortaleza montanhosa de Sião dos jebuseus. Ele renomeou a fortaleza como a Cidade de Davi e expandiu suas defesas a partir do Milo, ou terraços de sustentação.Fontes: o próprio texto bíblico · Zion · Millo · Hebron
- Hirão, rei da cidade costeira fenícia de Tiro, estabeleceu uma aliança com Davi enviando madeira de cedro, carpinteiros e pedreiros para construir um palácio real em Jerusalém.Fontes: o próprio texto bíblico · Hiram · Tyre
- Localizado a sudoeste de Jerusalém, o vale de Refaim serviu de base para as incursões filisteias assim que souberam que Davi havia sido ungido rei sobre todo o Israel.Fontes: o próprio texto bíblico · Valley of Rephaim
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Hebron · Hoje: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · versículos 1, 3, 5, 13
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 5, 6, 13, 14
- City of David · 31.774, 35.236 · versículos 7, 9
- Zion · Hoje: Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 7
- Tyre · 33.271, 35.196 · versículo 11
- Valley of Rephaim · 31.763, 35.219 · versículos 18, 22
- Gezer · Hoje: Tel Gezer · 31.859, 34.919 · versículo 25
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org