2 Samuel 2
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Devid abụrụ eze ndị Juda
1Dịka oge na-aga, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase sị, “M ga-ebili gbagoo nʼotu obodo dị na Juda?”
Onyenwe anyị sịrị, “Gbagoo.”
Devid jụkwara, “Olee ebe m ga-agbago?”
Onyenwe anyị zara, “Hebrọn.”
2Devid na nwunye ya abụọ, Ahinoam onye Jezril, na Abigel nwunye ochie Nebal onye Kamel gara nʼebe ahụ. 3Devid kpọkwaara ndị ikom ahụ ya na ha so, onye ọbụla nʼime ha durukwaara ezinaụlọ ya, ga biri na Hebrọn na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu. 4Ndị ikom Juda bịakwutere Devid na Hebrọn. Tee ya mmanụ ịbụ eze ebo Juda niile.
Mgbe Devid nụrụ na ọ bụ ndị ikom Jebesh Gilead liri Sọl, 5o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi. 6Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere. 7Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”
Agha dara nʼetiti ezinaụlọ Devid na Sọl
8Ma Abna nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim. 9Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.
10Ishboshet nwa Sọl gbara iri afọ anọ mgbe ọ ghọrọ eze ndị Izrel. Ọ chịkwara afọ abụọ. Ma otu ọ dị, ndị Juda niile nọgidere nʼokpuru Devid. 11Ogologo oge niile Devid chịrị dịka eze ndị Juda na Hebrọn bụ afọ asaa na ọnwa isii.
12Otu ụbọchị, Abna nwa Nea, duuru ndị agha Ishboshet nwa Sọl site na Mahanaim jee Gibiọn. 13Ma Joab, nwa Zeruaya dukwaara ndị agha Devid pụọ izute ha nʼọdọ mmiri Gibiọn. Otu ndị nọdụrụ ala nʼotu akụkụ ọdọ mmiri, ndị nke ọzọ nʼakụkụ ọzọ nke ọdọ mmiri ahụ. Ha cherịtara onwe ha ihu.
14Abna gwara Joab sị, “Ka ụfọdụ ụmụ okorobịa pụta nʼihu anyị maa aka mgba.”
Joab sịrị, “Ka ha pụta.”
15Ha pụtara ka a gụpụtachara ha. Ha dị mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Benjamin na Ishboshet nwa Sọl, mmadụ iri na abụọ site nʼetiti ndị agha Devid. 16Nwoke ọbụla jidere ibe ya nʼisi were mma agha ya manye ya nʼakụkụ, si otu a wetara onwe ha ọnwụ. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ dị na Gibiọn, Helkat Hazurim, nke pụtara Ala mma agha.
17Agha siri ike dara nʼụbọchị ahụ. Ma ndị agha Devid lụgburu Abna na ndị agha Izrel.
18Ụmụ Zeruaya atọ nọ nʼebe ahụ, ya bụ, Joab, na Abishai na Asahel. Asahel bụ nwoke na-agba ọsọ dịka mgbada. 19Ọ chụwara Abna ọsọ, ọ dịghị mgbe ọ tụgharịrị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe mgbe ọ nọ na-achụ ya ọsọ. 20Mgbe Abna lere anya nʼazụ hụ ya ka ọ na-abịa, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Ọ bụ gị Asahel?”
Asahel zara sị, “Ọ bụ m.”
21Abna gwara ya okwu sị ya, “Tụgharịa nʼakụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, jide otu nʼime ụmụ okorobịa ndị a. Napụ ya ngwa agha ya niile.” Ma Asahel akwụsịghị ịchụ ya ọsọ.
22Abna gwara Asahel ọzọ sị, “Laghachi azụ. Kwụsị ịchụ m ọsọ! Gịnị mere m ga-eji tigbuo gị? Olee otu m ga-esi lekwasị nwanne gị Joab anya nʼihu ma m gbuo gị?”
23Ma Asahel jụrụ ịlaghachi azụ. Nʼihi ya, Abna weere isi ùbe ya mapuo ya afọ. Ùbe ahụ sikwa ya nʼazụ pụta. Ọ dara nʼala, nwụọ otu mgbe ahụ. Ndị niile bịaruru ebe ahụ ọ dara nwụọ kwụsịrị. Ha agakwaghị nʼihu ịchụ ndị ọzọ.
24Ma Joab na Abishai chụgidere Abna ọsọ. Anwụ adaala mgbe ha bịarutere nʼugwu nta Ama, nke dị Gịa nso, nʼụzọ e si aga nʼọzara Gibiọn. 25Ndị ikom Benjamin chịkọtara onwe ha ọnụ dịnyere Abna. Ha niile guzooro nʼelu otu ugwu dịka otu usuu ndị agha.
26Mgbe ahụ, Abna kpọrọ Joab oku sị ya, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka anyị ga na-eji mma agha na-egburita onwe anyị? Olee mgbe ị ga-akpọghachi ndị gị ka ha hapụ ịchụ na igbu ụmụnne ha? Ị maghị na ihe dị otu a ga-eweta obi ilu?”
27Joab zara sị, “Eji m aha Chineke ṅụọ iyi na-asị na ọ bụrụ na i gbara nkịtị, ndị a gaara achụso ụmụnna ha ọsọ na-akwụsịghị ruo nʼụtụtụ echi.”
28Mgbe ahụ, Joab fụrụ opi ike ya. Nke a mere ka ndị ya kwụsị ịchụ ndị Izrel. Ha kwụsịkwara ibu agha.
29Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim.
30Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha. 31Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna. 32Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ.

Você sabia?
Dois reis e o confronto em Gibeão
- Após a morte de Saul, a nação se dividiu em dois reinos rivais. A tribo de Judá ungiu Davi como rei na cidade de Hebrom, ao sul, enquanto Abner, general de Saul, estabeleceu Isbosete, filho sobrevivente de Saul, para governar as tribos do norte a partir de Maanaim, a leste do rio Jordão.Fontes: o próprio texto bíblico · Abner · Ish-bosheth · Mahanaim
- Os principais comandantes militares de Davi — Joabe, Abisai e Asael — eram filhos de Zeruia, irmã de Davi. Esse estreito vínculo familiar colocou os sobrinhos de Davi no comando das forças de Judá durante as hostilidades contra a casa de Saul.Fontes: o próprio texto bíblico · Joab · Zeruiah · Asahel
- O conflito civil se intensificou junto ao açude de Gibeão por meio de um combate representativo entre doze guerreiros de Benjamim e doze das forças de Davi. Como todos os vinte e quatro lutadores morreram juntos na luta, o local recebeu o nome de Helcate-Hazurim antes de eclodir a batalha generalizada.Fontes: o próprio texto bíblico · Gibeon
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Hebron · Hoje: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · versículos 1, 3, 4, 11, 32
- Gilead · Hoje: Gilead 1 · 32.187, 35.692 · versículo 9
- Gibeon · Hoje: El Jib · 31.847, 35.183 · versículos 12, 13, 16, 24
- Helkath-hazzurim · Hoje: within 500 m of El Jib · 31.847, 35.183 · versículo 16
- Arabah · 30.417, 35.151 · versículo 29
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 29
- Bethlehem · 31.704, 35.208 · versículo 32
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org