2 Samuel 15
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Nzube ọjọọ Absalọm
1Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya. 2Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.” 3Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.” 4Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.”
5Mgbe onye ọbụla bịara ịkpọ isiala nye ya nʼọnọdụ nsọpụrụ, ọ na-eseti aka ya, jide onye ahụ sutu ya ọnụ. 6Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi.
7Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro Onyenwe anyị nkwa m kwere ya. 8Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’ ”
9Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn.
10Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’ ” 11Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla. 12Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.
Mgbapụ Devid
13Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm.
14Mgbe ahụ, Devid gwara ndị ọrụ ya niile ndị ya na ha nọ na Jerusalem, sị, “Bilienụ! Anyị aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị otu a, ọ dịghị onye nʼime anyị ga-agbanarị Absalọm. Anyị ga-ahapụ ugbu a, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eme ngwa gafee anyị wetara anyị mbibi, werekwa mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo a.”
15Ndị na-ejere ya ozi zara sị ya, “Anyị dịnyere gị! Anyị jikekwara ime ihe ọbụla onyenwe anyị eze kwuru.”
16Ya mere, eze na ndị ụlọ ya niile si na Jerusalem pụọ. Ọ dịghị onye ọ hapụrụ karịakwa ndị iko ya nwanyị iri nʼihi ilekọta obieze ahụ. 17Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ. 18Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze.
19Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ. 20Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.”
21Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.”
22Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya.
23Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara.
24Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị.
25Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ. 26Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.”
27Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo. 28Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.” 29Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ.
30Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo. 31Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O Onyenwe anyị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.”
32Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. 33Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m. 34Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel. 35Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze. 36Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”
37Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.

Você sabia?
A rebelião de Absalão e a fuga de Davi
- Absalão minou a autoridade de Davi ao interceptar os cidadãos que buscavam justiça real junto à porta da cidade, prometendo equidade e conquistando a afeição popular. Ele então iniciou sua rebelião a partir de Hebrom, a antiga cidade onde Davi havia sido originalmente coroado rei de Judá.Fontes: o próprio texto bíblico · Absalom · Hebron
- Apesar de ser estrangeiro da cidade filisteia de Gate, Itai, o geteu, permaneceu profundamente leal a Davi, recusando-se a abandonar o monarca em fuga juntamente com seiscentos de seus guerreiros e suas famílias.Fontes: o próprio texto bíblico · Ittai · Gath
- Para neutralizar o formidável conselho estratégico de seu antigo conselheiro Aitofel, Davi enviou a arca da aliança e seu amigo de confiança Husai de volta a Jerusalém. Husai coordenou uma rede de espionagem dentro do palácio ao lado dos sumos sacerdotes Zadoque e Abiatar e seus filhos.Fontes: o próprio texto bíblico · Ahithophel · Hushai · Zadok
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Hebron · Hoje: Tel Rumeida · 31.525, 35.102 · versículos 7, 8, 9, 10
- Aram · 33.511, 36.306 · versículo 8
- Geshur · 32.767, 35.700 · versículo 8
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 8, 11, 13, 14, 29, 34, 37
- Kidron · Hoje: Kidron River · 31.780, 35.240 · versículos 22, 23
- Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 28
- Mount of Olives · 31.778, 35.246 · versículos 30, 32
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org