2 Reis 9
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Jehu na ọnwụ Jezebel
1Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead. 2I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ. 3Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
4Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead. 5Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.”
Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?”
Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
6Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel. 7Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru. 8Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya. 9M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi. 10Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.
11Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?”
Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
12Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.”
Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ”
13Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
Jehu egbuo Joram na Ahazaya
14Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.) 15Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.” 16Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.
17Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.”
Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”
18Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”
Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.”
Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”
19Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”
Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”
20Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
21Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril. 22Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?”
Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”
23Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”
24Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ. 25Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya. 26‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
27Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ. 28Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid. 29Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.
Ọnwụ Jezebel
30Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi. 31Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”
32Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya. 33Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
34Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.” 35Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya. 36Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel. 37Ozu Jezebel ga-adị ka unyi nʼala ubi dị na Jezril, ruo na mmadụ enweghị ike ikwupụta sị, Nke a bụ Jezebel.’ ”

Você sabia?
A unção de Jeú e a queda da casa de Acabe
- Ramote-Gileade era uma cidade fronteiriça a leste do Jordão onde os comandantes de Israel mantinham a defesa contra Hazael, rei de Arã, enquanto o rei Jorão se recuperava em Jezreel. Foi nesse acampamento militar que um discípulo enviado pelo profeta Eliseu ungiu em segredo o comandante Jeú como rei.Fontes: Ramoth-gilead · Jehu · o próprio texto bíblico
- Jeú ordenou que o corpo de Jorão fosse lançado na propriedade de Nabote, o jezreelita. Isso cumpriu a sentença profética contra a linhagem de Acabe devido ao assassinato de Nabote e à tomada de sua vinha ancestral perto do palácio em Jezreel.Fontes: Naboth · Jezreel · o próprio texto bíblico
- Jezabel era filha de Etbaal, rei dos sidônios, antes de se casar com Acabe. Mesmo após ordenar a morte dela, Jeú reconheceu sua linhagem real ao mandar sepultá-la por ser filha de rei.Fontes: Jezebel · o próprio texto bíblico
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Syria · Hoje: Aram · 33.511, 36.306 · versículos 14, 15
- Megiddo · Hoje: Tel Megiddo · 32.585, 35.184 · versículo 27
- City of David · 31.774, 35.236 · versículo 28
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 28
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org