Nations Bible

2 Reis 7

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Ịlaisha zara sị ya, “Nụrụ okwu Onyenwe anyị. Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Nʼoge dịka mgbe a echi, a ga-ere otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, rekwaa akpa nta ọka balị abụọ otu shekel nʼọnụ ụzọ ama obodo Sameria.”

2Ọchịagha ahụ, nke eze na-adabere nʼaka ya, sịrị onye nke Chineke, “Lee, a sịkwarị na Onyenwe anyị emeghee oghere idee nke eluigwe, nke a ọ pụrụ ime?”

Ma Ịlaisha zara ya, “Ị ga-eji anya gị abụọ hụ ya, ma ị gaghị eri site nʼime ya.”

Ọgbaaghara nʼogige agha ndị Sameria

3Nʼoge a, e nwere ndị ekpenta anọ nọ nʼezi mgbidi gbara Sameria gburugburu, nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka anyị nọ nʼebe a na-eme? Ọ bụ ka anyị nọrọ nʼebe a tutu anyị anwụọ? 4Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Anyị ga-abanye nʼime obodo,’ ụnwụ dị nʼebe ahụ, anyị ga-anwụkwa. Ọ bụrụkwanụ na anyị anọgide nʼebe a anyị ga-anwụ. Ya mere ka anyị gafeenụ banye nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram, were onwe anyị nyefee ha nʼaka. Ọ bụrụ na ha edebe anyị ndụ, anyị ga-adị ndụ, ọ bụrụ na ha egbuo anyị, anyị ga-anwụkwa.”

5Nʼoge uhuruchi, ha biliri gaa nʼọmụma ụlọ ikwu ndị agha Aram. Mgbe ha bịarutere nʼọnụ ụlọ ikwu ahụ, o nwekwaghị onye nọ nʼebe ahụ, 6nʼihi na Onyenwe anyị mere ka ndị Aram nụ ụzụ ụgbọ agha na nke ịnyịnya, na nke usuu ndị agha. Nke a mere ka onye ọbụla gwa ibe ya sị, “Lee, eze ndị Izrel egoola ndị agha ndị Het, na ndị eze Ijipt ibuso anyị agha.” 7Ha biliri gbapụ ọsọ nʼabalị ahụ, hapụ ụlọ ikwu ha niile, na ịnyịnya ha niile, na ịnyịnya ibu ha niile, na ihe niile otu o si dịrị, ma gbapụ ọsọ ndụ.

8Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.

9Ma mgbe ahụ ha sịrịtara onwe ha, “Ihe anyị na-eme ezighị ezi. Taa bụ ụbọchị oziọma, ma lee ka anyị na-agba nkịtị. Ọ bụrụ na anyị echere ruo ìhè ụtụtụ, a ga-achọpụta ajọọ omume anyị. Ugbu a bịanụ, ka anyị gaa gwa ndị nọ nʼụlọeze, ihe anyị hụrụ.”

10Ya mere, ha gara kpọkuo ndị nche ọnụ ụzọ obodo ahụ, gwa ha sị, “Anyị banyere nʼogige ndị agha Aram, o nweghị mmadụ ọbụla nọ nʼebe ahụ, ọ dịghị olu mmadụ anyị nụrụ nʼebe ahụ, naanị ịnyịnya na ịnyịnya ibu elibere nʼosisi, na ụlọ ikwu ha a hapụrụ dịka ha dị.” 11Ndị na-eche nche tiri mkpu kọọrọ ndị nọ nʼụlọeze ihe mere.

12Eze biliri nʼabalị ahụ gwa ndịisi ọrụ ya sị, “Ka m gwa unu ihe ndị Aram mere anyị. Ha maara na anyị nọ nʼoke agụụ, nʼihi ya, ha akpacharala anya hapụ ọmụma ụlọ ikwu ha gaa zoo onwe ha nʼime ọhịa. Echiche ha bụ, ‘Ndị a ga-apụtarịrị, mgbe ahụ, anyị ga-ejide ha na ndụ, banyekwa nʼime obodo ha.’ ”

13Ma otu onye nʼime ndịisi agha ya zara sị ya, “Ka ụfọdụ mmadụ duru ịnyịnya ise ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo. Ọ bụrụ na ndị a alọtaghị ọnọdụ ha ga-adị ka nke ndị Izrel niile fọdụrụ nʼebe, e, ha ga-adị ka ndị Izrel niile a gụrụ dịka ndị nwụrụ anwụ. Ya mere, ka anyị zipụ ha ka ha gaa chọpụta ihe mere.”

14Ya mere, ha họpụtara ụgbọ agha abụọ na ịnyịnya ndị na-adọkpụ ha. Eze zipụrụ ha ịchụso ndị agha Aram, O nyere ndị na-agba ha iwu sị, “Gaanụ chọpụta ihe mere.” 15Ha sogidere ha ruo nʼosimiri Jọdan. Nʼakụkụ ụzọ niile jupụtara nʼuwe na ngwa agha ndị agha Aram tufuru mgbe ha na-eme ngwangwa. Ndị ahụ e zipụrụ lọghachiri bịa kọọrọ eze ihe ha hụrụ. 16Ndị Izrel niile pụrụ gaa kwakọrọ ihe dị nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Aram. Nke bụ na e rere otu akpa nta ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma otu shekel, rekwaa akpa ọka balị abụọ otu shekel dịka Onyenwe anyị si kwuo.

17Eze họpụtara ọchịagha ahụ, nke ọ na-adabere nʼaka ya, nye ya ọrụ ilekọta ọnụ ụzọ obodo ahụ. Ma ndị si nʼobodo na-enupụta nuturu ya, zọọ ya ụkwụ, zọgbuo ya mgbe ha na-agbapụta. Ọ nwụrụ dịka Ịlaisha onye nke Chineke kwuru mgbe eze bịakwutere ya ụnyaahụ, ijide ya. 18Ihe niile mezuru dịka onye nke Chineke gwara eze okwu sị ya, “A ga-ere akpa nta ọka balị abụọ otu shekel na otu akpa nta ụtụ ọka otu shekel, nʼọnụ ụzọ ama Sameria.”

19Nʼoge ahụ, ọchịagha ahụ na-ejere eze ozi zara sị ya, “Ihe dị otu a agaghị eme, ọ bụladị na Onyenwe anyị emeghee eluigwe mee ka nri zoo, nke a ọ ga-eme?” Ma onye nke Chineke zara ya, “Ị ga-eji anya gị hụ ya, ma ị gaghị eso rie ya.” 20Ọ bụkwa otu a ka o si mee, nʼihi na ndị mmadụ zọgburu ya nʼụkwụ nʼọnụ ụzọ ama, ebe ọ nọ nwụọ.

Você sabia?

O alívio de Samaria e a profecia de Eliseu

  • Durante um severo cerco e fome na capital Samaria, Eliseu anunciou que os cereais se tornariam abundantes e baratos em vinte e quatro horas. Quando um oficial real expressou incredulidade, Eliseu predisse que o oficial veria o suprimento com os próprios olhos, mas não comeria nada dele.Fontes: o próprio texto bíblico · Elisha · Samaria
  • O exército arameu fugiu em pânico após ouvir o som de um grande exército, suspeitando que Israel havia contratado os reis dos heteus e dos egípcios. Quatro homens leprosos descobriram as tendas e provisões abandonadas ao crepúsculo e relataram a notícia aos porteiros de Samaria.Fontes: o próprio texto bíblico · Egypt
  • Depois que batedores confirmaram a retirada até o rio Jordão, a população faminta saiu apressada para saquear o acampamento. No tumulto junto à porta da cidade, o oficial incrédulo que estava de guarda foi pisoteado até a morte, cumprindo a predição de Eliseu.Fontes: o próprio texto bíblico · Jordan

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Samaria · 32.276, 35.195 · versículos 1, 16, 18
  • Syria · Hoje: Aram · 33.511, 36.306 · versículo 5
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 6
  • Jordan · Hoje: Jordan River · 31.761, 35.558 · versículo 15

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.