Nations Bible

2 Reis 17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Hoshea eze Izrel nke ikpeazụ

1Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Ehaz, bụ eze Juda, ka Hoshea nwa Elaa ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze afọ itoolu. 2O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị mgbe ọ bụ eze. Ma ọ bụghị dịka ndị eze Izrel ndị ọzọ bu ya ụzọ.

3Shalmanesa eze Asịrịa bịara buso Hoshea agha, nʼihi na Hoshea nọ nʼokpuru ọchịchị eze Asịrịa, bụrụkwa onye na-atụ ụtụ nye ya kwa afọ. 4Ma eze Asịrịa chọpụtara na Hoshea abụghị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihi na Hoshea eze Izrel zipụrụ ndị ozi ya ka ha jekwuru So, eze Ijipt, maka enyemaka. Ọzọkwa, Hoshea kwụsịrị ịtụ ụtụ nye eze Asịrịa dịka ọ na-eme kwa afọ. Nʼihi ya Shalmanesa nwụchiri ya, tinye ya nʼụlọ mkpọrọ. 5Eze Asịrịa wakporo ala ahụ niile nʼagha, gbagoo imegide Sameria, nọchibido ya gburugburu, afọ atọ. 6Nʼafọ itoolu nke ọchịchị Hoshea, eze Asịrịa dọtara Sameria nʼagha, dọkpụrụ ndị Izrel niile buga ha nʼala Asịrịa. O mere ka ha biri nʼobodo Hala, nʼime Gozan nke dị nʼosimiri Hoboa, na nʼime obodo ndị Midia.

Ndọta a dọtara Izrel nʼagha nʼihi mmehie

7Ihe ndị a niile mere nʼihi na ndị Izrel mehiere megide Onyenwe anyị, bụ Chineke ha, onye ahụ mere ka ha site nʼokpuru ike Fero, eze Ijipt pụta. Ha kpọrọ isiala nye chi ndị ọzọ 8gbasoro omenaala niile nke ndị mba ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha. Ha gbasokwara omenaala ọjọọ ndị ahụ niile ndị eze ha webatara. 9Ndị Izrel mere ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị Chineke ha na-adịghị anabata na nzuzo. Ha wuru ebe ịchụ aja nye chi dị iche iche nʼobodo ha niile, e, nʼobodo ukwu ma nʼobodo nta ọbụla. 10Ha manyeere onwe ha ogidi nkume, na ogidi chi Ashera nʼelu ugwu ọbụla, na nʼokpuru osisi ọbụla nwere ndo. 11Ha chụrụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ọbụla dịka mba ndị naara ebi nʼala ahụ si eme, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼala ha, mgbe Izrel bịara biri nʼebe ahụ. Ha mere ihe ọjọọ dị iche iche, nke mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu. 12E, ha fere arụsị dị iche iche ofufe, lefuo anya na Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị sị ha, “Unu emela ihe dị otu a.” 13Mgbe niile ka Onyenwe anyị na-eziga ndị amụma ya, na ndị ọhụ ụzọ, ịdọ Izrel na Juda aka na ntị, sị ha, “Sitenụ nʼajọ ihe unu na-eme chegharịa. Debenụ iwu na ụkpụrụ m, dịka iwu ahụ niile m nyere nna unu ha ka ha debe si dị, nke m sikwa nʼọnụ ndị ozi m bụ ndị amụma nye unu.”

14Ma ndị Izrel jụrụ ige ntị. Kama ha kpachara anya kwesie olu ha ike dịka nna nna ha mere, bụ ndị na-ekwenyeghị na Onyenwe anyị Chineke ha. 15Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.”

16Ha jụrụ idebe iwu niile Onyenwe anyị Chineke ha nyere ha. Ha meere onwe ha ogidi arụsị Ashera, kpụọrọ onwe ha oyiyi ụmụ ehi abụọ. Ha kpọrọ isiala nye Baal, na anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando. 17Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.

18Ya mere, Onyenwe anyị wesoro Izrel iwe nke ukwuu, wezuga ha site nʼihu ya. Ọ dịkwaghị onye o kwere ka ọ fọdụ, karịakwa naanị ebo Juda. 19Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara. 20Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha.

21Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu. 22Ọ dịkwaghị mgbe ụmụ Izrel sitere nʼime mmehie ahụ Jeroboam dubara ha pụta, 23tutu ruo mgbe Onyenwe anyị kpochapụrụ Izrel niile site nʼihu ya, dịka o kwuru na ọ ga-eme, site nʼọnụ ndị amụma na-ejere ya ozi. Ọ bụ nke a mere ndị Izrel ji gaa biri nʼAsịrịa dịka ndị a dọtara nʼagha ruo taa.

Ndị ọhụrụ bịara biri na Sameria

24Eze Asịrịa sitere nʼala Babilọn, Kuta, Ava, Hamat na Sefavaim kpọta ndị mmadụ bịara biri nʼobodo Sameria ịnọchi anya ndị Izrel niile e sitere nʼebe ahụ bupụ. Nʼụzọ dị otu a, ha nwetara Sameria birikwa nʼobodo ya niile. 25Ma mgbe ndị Asịrịa malitere ibi nʼebe ahụ, ha atụghị egwu Onyenwe anyị, maọbụ fee ya ofufe. Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ọdụm ndị batara nʼetiti ha gbuo ụfọdụ mmadụ nʼime ha. 26Ya mere, e zigara eze Asịrịa ozi sị ya, “Ndị ahụ i dọtara nʼagha mee ka ha bịa biri nʼobodo Sameria amaghị ihe chi nwe ala ahụ chọrọ. O zitere ọdụm nʼetiti ha, nke na-egbu ha, nʼihi na ndị ahụ amaghị ihe ọ chọrọ.”

27Eze Asịrịa nyere iwu sị: “Ka otu onye nʼime ndị nchụaja e si na Sameria dọta nʼagha laghachi gaa biri nʼebe ahụ, izi ndị bi nʼobodo ahụ ihe chi ala ahụ chọrọ.” 28Ya mere, otu nʼime ndị nchụaja ebuuru site na Sameria gaa ala ọzọ, bịara biri na Betel, kuziere ha otu ha ga-esi na-atụ egwu Onyenwe anyị.

29Nʼagbanyeghị nke a, ndị mba ọbụla meere onwe ha chi nke aka ha nʼobodo ahụ niile ebe ha bi nʼime ya. Ha guzobere chi ndị a nʼụlọ arụsị nke ndị Sameria wuru nʼebe niile dị elu. 30Ndị si Babilọn mere chi ha a na-akpọ Sukọt Benot; ndị si Kut emee Neagal, ebe ndị si Hamat mekwara Ashima. 31Ndị si Ava mekwara Nibaz, na Tatak, ma ndị si Sefavaim na-esure ụmụ ha nʼọkụ dịka aja nye Adramelek na Anamelek, bụ chi ndị Sefavaim. 32Ha tụrụ egwu Onyenwe anyị, ma ha họpụtara ụdị mmadụ dị iche iche site nʼetiti onwe ha, ndị na-ejere ha ozi dịka ndị nchụaja nʼụlọ chi ha dị nʼebe niile dị elu. 33Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị.

34Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel. 35Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha. 36Ma Onyenwe anyị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja. 37Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu chi ndị ọzọ. 38Unu echefula ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. Unu akpọkwala isiala nye chi ndị ọzọ nʼihi egwu. 39Kama, tụọnụ egwu ma fee Onyenwe anyị Chineke unu. Ọ bụ ya ga-anapụta unu site nʼaka ndị iro unu niile.”

40Ma ndị Izrel egeghị ntị, kama, dịka ụzọ ọjọọ ha si dị, ha fere chi ọzọ ofufe. 41Ọ bụ ezie na ndị a na-efe Onyenwe anyị ofufe, ma ha nọgidekwara na-ejere arụsị niile ha ozi. Ruo taa, ụmụ ha, na ụmụ ụmụ ha, gara nʼihu na-emekwa ihe nna nna ha mere.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A Queda do Reino do Norte e o Exílio de Israel

  • O rei Oseias tentou libertar-se do domínio assírio retendo o tributo e buscando uma aliança com o rei Sô do Egito. Em resposta, Salmaneser e o exército assírio cercaram Samaria por três anos, capturando a capital e deportando os israelitas para regiões como Hala, Gozã junto ao rio Habor e cidades dos medos.Fontes: o próprio texto bíblico · Hoshea · Shalmaneser · So
  • Seguindo sua política de transferência de populações, os governantes assírios reassentaram povos de cidades como Babilônia, Cuta, Ava, Hamate e Sefarvaim para habitar as cidades de Samaria no lugar dos israelitas exilados.Fontes: o próprio texto bíblico · Babylon · Hamath · Sepharvaim
  • Quando leões começaram a atacar os novos colonos, o rei da Assíria enviou de volta um sacerdote israelita exilado para habitar em Betel e ensinar aos recém-chegados como adorar o Deus da terra. Isso resultou em uma religião sincretista, na qual os novos habitantes temiam ao Senhor enquanto continuavam servindo aos seus próprios deuses ancestrais.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Samaria · 32.276, 35.195 · versículos 1, 5, 6, 24, 26, 27, 28, 29
  • Assyria · 36.359, 43.153 · versículos 3, 4, 5, 6, 23, 24, 26, 27
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 4, 7, 36
  • Babylon · 32.543, 44.422 · versículos 24, 30
  • Hamath · Hoje: Hama · 35.136, 36.750 · versículos 24, 30

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.