Nations Bible

2 Crônicas 31

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

1Mgbe ihe niile a gwụsịrị, ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ pụrụ gaa nʼobodo niile dị na Juda, kurisie ogidi nsọ niile, gbutukwa ogidi Ashera niile. Ha kwatụrụ ebe niile dị elu na ebe ịchụ aja niile dị na Juda, Benjamin, Ifrem na Manase. Mgbe ha lachara ha niile nʼiyi, ndị Izrel niile laghachiri nʼobodo nke aka ha nakwa nʼihe onye ọbụla nwere.

Onyinye maka ife ofufe

2Hezekaya kenyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị nʼusoro ịrụ ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Chineke ụbọchị niile, maka ọrụ ịchụ aja nsure ọkụ na aja udo, na inye ekele, na ito Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ama ebe obibi ya. 3Eze nyekwara ụtụ nke ya site nʼihe nweta ya maka iji chụọ aja nsure ọkụ, nke ụtụtụ na abalị, ya na aja nsure ọkụ nke ụbọchị izuike niile na ọnwa ọhụrụ, na nke mmemme niile a kara aka a na-eme dịka ọ dị nʼiwu Onyenwe anyị. 4O nyekwara ndị bi na Jerusalem iwu ka ha na-ewebatara ndị nchụaja na ndị Livayị oke nke ruuru ha, ka ha nwee ike lebanye anya nke ọma nʼiwu Onyenwe anyị. 5Ngwangwa e kwusara okwu a, ụmụ Izrel niile wetara onyinye ha nʼebe ọ bara ụba. Ha wetara mkpụrụ mbụ nke ọka ha, na mmanya vaịnị ọhụrụ ha, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ, na ihe omume niile nke ubi. Ha wetakwara nʼụba otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile ọzọ ha nwere. 6Ndị Izrel na Juda niile bi nʼobodo Juda bubatakwara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ, na otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe nsọ niile edoro nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke ha. Ha doro ha niile nʼukwu nʼukwu 7Ha bidoro iwebata ihe ndị a site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ruo nʼọnwa nke asaa. 8Mgbe Hezekaya na ndịisi ya bịara hụ ukwu ihe ndị ahụ niile, ha toro Onyenwe anyị, gọziekwa ndị ya bụ Izrel.

9Hezekaya jụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị banyere onyinye ndị ahụ e bubatara. 10Azaraya, onyeisi nchụaja, onye sitere nʼikwu Zadọk zara sị ya; “Lee, kemgbe ndị mmadụ malitere iwebata onyinye ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị o nwebeghị ihe kọrọ anyị. Nʼezie, anyị nwere karịa, nʼihi na Onyenwe anyị agọziela ndị ya. Leekwa ihe dị ukwuu ka fọdụrụ.”

11Hezekaya nyere iwu ka e edozie ụlọ ịchịkọba ihe nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ. Ha mekwara otu a. 12Emesịa, ha jiri ikwesi ntụkwasị obi bubata onyinye ndị ahụ, na onyinye nke otu ụzọ nʼime ụzọ iri, na onyinye e doro nsọ, tifee ha nʼaka Konanaya, onye Livayị. Shimei nwanne ya nwoke bụ onye na-esote ya. 13Jehiel, Azazaya, Nahat, Asahel, Jerimot, Jozabad, Eliel, Ismakaya, Mahat na Benaya, bụ ndị nlekọta ọrụ ndị nọ nʼokpuru Konanaya na Shimei nwanne ya. Ndị a niile bụ ndị eze Hezekaya na Azaraya onye nlekọta ụlọnsọ ukwu Chineke họpụtara.

14Kore nwa Imna, onye Livayị, onye bụkwa onye na-elekọta ọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ, ka e tinyere ọrụ ilekọta onyinye afọ ofufu niile e wetaara Chineke. Ọ bụ ya nwekwa ọrụ ikesa onyinye ndị ahụ niile e bubataara Onyenwe anyị ha na onyinye ndị ọzọ e doro nsọ. 15Ndị na-enyere ya aka bụ Eden, Miniamin, Jeshua, Shemaya, Amaraya na Shekanaya. Ha na-eke onyinye ahụ nye ndị nchụaja niile nʼobodo ahụ, onye ukwu na onye nta, dịka usoro ịrụ ọrụ ha si dị. Ha ji ikwesi ntụkwasị obi na-enyere ya aka.

16Ọzọkwa, ndị ikom niile si nʼezinaụlọ ndị nchụaja, ndị gbara site nʼafọ atọ gbagoo, ndị aha ha dị nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na-eketa oke ihe oriri ha na-eri mgbe ọbụla ha bịara ịrụ ọrụ dịka usoro ọrụ ha si dị. 17Ha na-ekenye ndị nchụaja niile e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ, kenyekwa ndị Livayị niile gbara site iri afọ abụọ gbagoo ihe oriri dịka usoro ọrụ ha si dị. 18Ndị na-esokwa keta oke ndị a bụ ụmụntakịrị, na ndị inyom, na ụmụ ndị ikom na ndị inyom na-etolite etolite, bụ ndị niile e depụtara aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ. Ndị a bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼido onwe ha nsọ.

19A họpụtara ụfọdụ ndị ikom ndị ọrụ ha bụ ike nri nye ndị nchụaja niile bụ ụmụ ụmụ Erọn. Ndị nchụaja a na-ekwu ihe banyere ha nʼebe a bụ ndị ahụ bi nʼala ubi nke gbara obodo ndị nchụaja gburugburu, maọbụ ndị bi nʼobodo ndị ọzọ. Ndị a bụkwa ndị e dere aha ha niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ndị Livayị.

20Ndị a bụ ihe ndị Hezekaya mere nʼime Juda niile, ọ na-eme ihe dị mma, na nke ziri ezi, nʼikwesị ntụkwasị obi nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke ya. 21Nʼime ihe niile o mere, nke metụtara ije ozi nke ụlọ ukwu Chineke, na idebe iwu niile na ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere, Hezekaya ji obi ya niile gbasoo Chineke. O jikwa obi ya niile jee ozi niile o jere. Nke a mekwara ka ihe gaara ya nke ọma.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Ezequias organiza os sacerdotes e as ofertas

  • Após a celebração, os israelitas destruíram os santuários idólatras em Judá, Benjamim, Efraim e Manassés. O rei Ezequias então reorganizou os sacerdotes e levitas em seus turnos, contribuiu com seus próprios bens para os holocaustos regulares e ordenou que o povo entregasse os dízimos para que os ministros pudessem se dedicar à Lei do SENHOR.Fontes: o próprio texto bíblico · Hezekiah
  • O povo trouxe dízimos e primícias tão generosos de cereais, vinho novo, azeite, mel e gado que grandes montes se acumularam entre o terceiro e o sétimo mês. Azarias, o sumo sacerdote da família de Zadoque, relatou que havia fartura de sobra, levando Ezequias a ordenar a preparação de câmaras de armazenamento no templo.Fontes: o próprio texto bíblico · Azariah · Zadok
  • Oficiais como os levitas Conanias, seu irmão Simei e Coré, guarda da Porta Oriental, foram encarregados de administrar e distribuir com fidelidade as contribuições. As porções eram fornecidas não apenas aos ministros no templo de Jerusalém, mas também aos sacerdotes, levitas e suas famílias nas cidades vizinhas, segundo os registros genealógicos.Fontes: o próprio texto bíblico · Cononiah · Shimei

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 4
  • East Gate · Hoje: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 14

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.