2 Crônicas 26
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ụzaya eze Juda
1Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii. 2Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ.
3Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem. 4O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 5Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ Onyenwe anyị, Chineke nyere ya ọganihu.
6O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia. 7Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim. 8Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu.
9O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike. 10O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu.
11Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha. 12Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600. 13Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya. 14Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ. 15O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike.
16Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja. 17Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja Onyenwe anyị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ. 18Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka Onyenwe anyị Chineke gị.”
19Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu. 20Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na Onyenwe anyị tiri ya ihe otiti.
21Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.
22Ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Ụzaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, onye amụma Aịzaya nwa Emọz deturu ha nʼakwụkwọ. 23Ụzaya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼọhịa ebe a na-eli ozu nke dịịrị ndị eze, maka na ndị mmadụ sịrị, “Ọ bụ onye ekpenta.” Jotam nwa ya, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Você sabia?
A ascensão, o orgulho e a queda do rei Uzias
- Uzias fortificou Jerusalém com torres e equipou um exército com mais de 300 mil homens com armas especializadas. Ele também mandou criar dispositivos engenhosos instalados sobre as muralhas da cidade, capazes de disparar flechas e lançar grandes pedras.Fontes: o próprio texto bíblico · Uzziah
- Quando Uzias se tornou poderoso, tentou orgulhosamente queimar incenso no santuário do templo. O sumo sacerdote Azarias e oitenta sacerdotes corajosos confrontaram o rei, explicando que apenas os descendentes consagrados de Arão tinham o direito de queimar incenso.Fontes: o próprio texto bíblico · Azariah
- Após ser afligido pela lepra dentro do templo, Uzias viveu isolado pelo resto de sua vida e ficou excluído da casa do Senhor. Em razão do confinamento do rei, seu filho Jotão assumiu a administração do palácio real e governou o povo de Judá.Fontes: o próprio texto bíblico · Jotham · Uzziah
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 3, 9, 15
- Ashdod · Hoje: Tel Ashdod · 31.757, 34.658 · versículo 6
- Philistia · 31.664, 34.546 · versículo 6
- Egypt · 30.129, 31.308 · versículo 8
- Angle · Hoje: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 9
- Corner Gate · Hoje: in Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 9
- Shephelah · 31.692, 34.875 · versículo 10
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org