Nations Bible

1 Tessalonicenses 4

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ibi ndụ na-atọ Chineke ụtọ

1Nʼikpeazụ, ụmụnna anyị, anyị na-arịọ ma na-akwagidekwa unu nʼime Onyenwe anyị Jisọs, dị ka unu mụtara site nʼaka anyị otu unu kwesiri isi bie ndụ, nakwa ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Unu na-eme nke a karịa. 2Nʼihi na unu maara ụdị ndụmọdụ ahụ sị nʼaka Onyenwe anyị Jisọs nke anyị nyere unu.

3Nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke, bụ ị dị nsọ unu. Ka unu wezuga onwe unu site na ịkwa iko, 4ka onye ọbụla nʼime unu mata ido ahụ nke onwe ya nʼugwu na nʼịdị nsọ. 5Ọ bụghị nʼụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị mba ọzọ na-amaghị Chineke. 6Ka onye ọbụla ghara imegbu maọbụ ịghọgbu nwanna ya nʼokwu a. Nʼihi na Onyenwe anyị ga-ata onye na-eme ihe dị otu a ahụhụ, dị ka anyị gwara unu na mbụ, na-adọsikwa unu aka na ntị ike. 7Nʼihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha kama ọ chọrọ ka anyị dịrị nsọ. 8Ya mere, onye ọbụla nke jụrụ ịnara ntụziaka a, ọ bụghị mmadụ ka ọ jụrụ, kama ọ bụ Chineke onye na-enye unu Mmụọ Nsọ ya.

9Ugbu a, ihe gbasara ịhụnanya nke kwesiri ịdị nʼetiti ụmụnna, o kwesighị ka anyị gwa unu ihe ọzọ banyere ya. Nʼihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke kuziri ka unu nwee ịhụnanya nʼebe ibe unu nọ. 10Ma nʼezie, unu na-ahụ ụmụnna anyị niile bi na Masidonia nʼanya. Ma anyị na-arịọsịkwa unu arịrịọ ike sị unu na-ahụkwa ha nʼanya karịa ka unu hụrụ ha ugbu a. 11Nweenụ agụụ ibi ndụ nwayọọ, na-arụkwanụ ọrụ dịịrị unu. Jirikwanụ aka unu na-arụ ọrụ dịka anyị gwara unu, 12nke a ga-eme ka ndụ unu na-ebi kwa ụbọchị wetara unu nsọpụrụ nʼebe ndị na-ekweghị ekwe nọ, meekwa ka unu ghara i dabere nʼonye ọbụla.

Ọbịbịa nke Onyenwe anyị

13Ụmụnna m, anyị chọrọ ka unu mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara nʼụra ọnwụ, ya ewutela unu dịka o si ewute ndị ọzọ ndị na-enweghị olileanya. 14Nʼihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie, nʼotu aka ahụ, anyị kwenyekwara na site na Jisọs, Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ anwụ. 15Nʼihi na okwu nke Onyenwe anyị nke anyị na-akụziri unu bụ nke a, na anyị ndị dị ndụ ruo ọbịbịa Onyenwe anyị agaghị ebu ndị dara nʼụra ọnwụ ụzọ. 16Nʼihi na Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-esi nʼeluigwe rịdata, ọ ga-ewere olu ike kpọọ oku, werekwa olu nke onyeisi ndị mmụọ ozi na ụda opi ike nke Chineke. Mgbe ahụ ndị niile nwụrụ nʼime Kraịst ga-ebu ụzọ bilie. 17Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nʼụwa, ka a ga-eweli anyị na ha elu nʼime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na Onyenwe anyị ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. 18Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

Santidade, amor e esperança pelos que morreram

  • Este capítulo observa que seus leitores já demonstravam amor a todos os irmãos por toda a Macedônia. Nos tempos do Novo Testamento, a Macedônia era uma província romana situada ao norte da Grécia, governada por um propretor com o título de procônsul. Paulo foi chamado por uma visão do "homem da Macedônia" para pregar o evangelho ali.Fontes: o próprio texto bíblico · Macedonia
  • O capítulo fala dos mortos como pessoas que dormem ou adormeceram, e pede aos leitores que não se entristeçam como os demais, que não têm esperança. Porque Jesus morreu e ressuscitou, diz o texto, Deus trará com Jesus os que nele adormeceram; os mortos em Cristo ressuscitarão primeiro, e então os que ainda estiverem vivos serão arrebatados com eles nas nuvens para encontrar o Senhor nos ares.Fontes: o próprio texto bíblico
  • Os leitores são exortados a aspirar a uma vida tranquila, a cuidar dos próprios assuntos e a trabalhar com as próprias mãos, como já lhes havia sido instruído. O capítulo apresenta isso como o modo de se portar corretamente diante dos de fora e de não depender de ninguém.Fontes: o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Macedonia · 41.600, 22.540 · versículo 10

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.