Nations Bible

1 Samuel 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Sọl agbalịa igbu Devid

1Sọl gwara ndị ohu ya na ọkpara ya, Jonatan, ka ha gbuo Devid. Ma nʼihi na ihe banyere Devid masịrị Jonatan, 2ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ. 3Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.”

4Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu. 5Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. Onyenwe anyị nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?”

6Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, agaghị egbu ya.”

7Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ.

8Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ.

9Ma mmụọ ọjọọ Onyenwe anyị zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara, 10Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ.

11Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ Devid nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma Mikal nwunye Devid gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.” 12Ya mere, Mikal sitere na oghereikuku wetuo Devid, ebe o si gbapụ. 13Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya.

14Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.”

15Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.” 16Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ.

17Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?”

Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ”

18Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt. 19Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,” 20ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma. 21Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ. 22Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?”

Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.”

23Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt. 24O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

As fugas de Davi de Saul

  • Quando Saul enviou mensageiros para matar Davi em casa, Mical, esposa de Davi, o ajudou a escapar por uma janela. Ela então disfarçou um ídolo doméstico na cama com pelos de cabra e roupas para atrasar os mensageiros e dar tempo para Davi fugir.Fontes: o próprio texto bíblico · Michal
  • Davi fugiu para junto do profeta Samuel em Ramá e foi com ele para Naiote. O nome Naiote significa habitações e se refere a um assentamento perto de Ramá onde uma comunidade de profetas vivia sob a liderança de Samuel.Fontes: o próprio texto bíblico · Naioth · Samuel
  • Ao perseguir Davi em direção a Ramá, Saul parou para pedir informações junto à grande cisterna de Seco, um local situado em uma colina entre Gibeá e Ramá.Fontes: o próprio texto bíblico · Secu

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Secu · Hoje: between Gibeah and Ramah · 31.937, 35.145 · versículo 22

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.