Nations Bible

1 Samuel 15

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Onyenwe anyị ajụ eze Sọl

1Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka Onyenwe anyị zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka Onyenwe anyị bịa. 2Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta. 3Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ”

4Ya mere, Sọl chịkọtara ndị agha ya mee ka ha zukọtaa nʼobodo Telaim. Ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ, ndị agha ji ụkwụ, tinyere puku ndị ikom iri si na Juda. 5Sọl duuru ndị agha ya gaa zoo nʼakụkụ iyi tara ata dị nso nʼobodo ndị Amalek. 6Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha.

7Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt. 8O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile. 9Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri.

10Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị rutere Samuel ntị, 11“Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru. Ya mere, o tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa abalị ahụ niile.

12Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.”

13Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye Onyenwe anyị gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile Onyenwe anyị kwuru!”

14Ma Samuel jụrụ ya sị, “Gịnị bụ ube atụrụ ndị a m na-anụ? Ebee ka ube igwe ehi ndị a si na-ada?”

15Sọl zara sị, “Ndị agha m si nʼetiti ndị Amalek chịta ụfọdụ nʼime atụrụ na ehi ndị mara mma nke ha chọrọ iji chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja. Ma anyị bibiri ihe ndị ọzọ fọdụrụnụ.”

16Mgbe ahụ Samuel gwara Sọl sị, “Ekwukwala ọzọ! Gee ntị nụrụ ihe Onyenwe anyị gwara m nʼabalị!”

Sọl zara ya sị, “Kwuo, gịnị ka ọ gwara gị?”

17Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? Onyenwe anyị tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel. 18Onyenwe anyị ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’ 19Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị?”

20Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m Onyenwe anyị isi. Ejere m ozi ahụ Onyenwe anyị zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile. 21Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ Onyenwe anyị Chineke gị aja na Gilgal.”

22Ma Samuel sịrị,

“Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ

dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta?

Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja

ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule.

23Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa,

mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị.

Nʼihi na ị jụla okwu Onyenwe anyị

ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.”

24Sọl zara Samuel sị ya, “Emehiela m. Nʼezie, enupula m isi na ndụmọdụ gị na nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ bụ nʼihi na m tụrụ egwu ndị Izrel ka m ji mee ihe ha chọrọ. 25Biko, gbaghara m mmehie m ugbu a, bịakwa soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị ofufe.”

26Ma Samuel sịrị ya, “Agaghị m eso gị laghachi azụ. Ebe ị jụrụ okwu Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ajụkwala gị dịka eze ndị Izrel!”

27Mgbe Samuel tụgharịrị ka o si nʼebe ahụ pụọ, Sọl jidere ya nʼọnụ ọnụ uwe ya ime ka ọ lọghachi azụ, ma uwe ahụ dọwara. 28Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa Onyenwe anyị adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma. 29Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!”

30Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee Onyenwe anyị Chineke gị ofufe.” 31Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye Onyenwe anyị.

32Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.”

Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.”

33Ma Samuel kwuru sị,

“Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụ

otu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.”

Samuel gburu Agag nʼihu Onyenwe anyị na Gilgal.

34Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya. 35Site nʼoge ahụ ruo mgbe Samuel nwụrụ, ọ hụkwaghị Sọl anya ọzọ. Ma o rugidere ụjụ nʼihi Sọl oge ndị a niile. O wutekwara Onyenwe anyị na o mere Sọl eze ndị Izrel.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A desobediência e a rejeição de Saul

  • Os amalequitas eram um povo pastoral nômade que habitava as terras áridas entre Havilá e Sur, na fronteira do Egito. O conflito deles com Israel começou quando emboscaram os israelitas após a saída do Egito, o que serve de contexto para o julgamento ordenado neste capítulo.Fontes: o próprio texto bíblico · Amalek · Shur
  • Gilgal era um importante centro religioso e judicial onde Samuel costumava administrar a justiça e oferecer sacrifícios. Saul reuniu-se em Gilgal após a batalha contra Amaleque, tornando esse local o cenário onde Samuel declarou que Deus havia rejeitado Saul como rei de Israel.Fontes: o próprio texto bíblico · Gilgal
  • O nome Agague era um título ou nome hereditário usado pelos reis dos amalequitas. Embora Saul tenha poupado Agague e o melhor do gado contrariando as instruções, Samuel executou o julgamento contra o rei cativo em Gilgal.Fontes: o próprio texto bíblico · Agag · Amalek

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Amalek · 30.648, 34.422 · versículos 2, 3, 5, 8, 20, 32
  • Egypt · 30.129, 31.308 · versículos 2, 6, 7
  • Havilah · Hoje: in the Arabian Peninsula · 23.000, 46.000 · versículo 7

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.