Nations Bible

1 Samuel 1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Sobre este livro

Sobre 1 Samuel

  • O Dicionário Bíblico de Easton (1897) diz que os livros de Samuel foram provavelmente escritos por Samuel, Gade e Natã. Afirma que Samuel escreveu os primeiros vinte e quatro capítulos do primeiro livro, que Gade, companheiro de Davi, continuou a história, e que Natã a concluiu, provavelmente organizando o conjunto na forma em que se encontra hoje.Fontes: Easton: Samuel, Books of
  • O Dicionário Bíblico de Easton (1897) diz que o primeiro livro abrange um período de cerca de cem anos e coincide quase com a vida de Samuel. Contém a história de Eli (capítulos 1-4), a de Samuel (capítulos 5-12) e a de Saul e de Davi no exílio (capítulos 13-31), e observa que as lacunas frequentes fazem com que não sejam histórias completas dos reinados sucessivos.Fontes: Easton: Samuel, Books of
  • A narrativa começa com Eli, sumo sacerdote em Siló enquanto a arca estava ali, que também julgou Israel durante quarenta anos. Ana consagrou o filho Samuel em Siló como nazireu perpétuo; ele cresceu sob os cuidados de Eli e depois teve sua casa em Ramá, cidade da região montanhosa de Efraim, e recorria a Gilgal entre os lugares onde administrava a justiça.Fontes: Eli · Samuel · Ramah · Gilgal
  • Saul, filho de Quis e da tribo de Benjamim, é descrito como o primeiro rei da nação judaica; Gibeá foi seu lugar de nascimento e continuou sendo sua residência depois que se tornou rei. Davi, oitavo e mais novo filho de Jessé, de Belém, apascentava as ovelhas do pai nas terras altas de Judá, antes do relato de seu exílio longe de Saul.Fontes: Saul · Gibeah · David · Easton: Samuel, Books of
  • Os tradutores da Septuaginta consideraram os livros de Samuel e de Reis uma história contínua, dividida em quatro livros a que chamaram Livros do Reino. A Vulgata seguiu essa divisão, mas os denominou Livros dos Reis; assim, os livros hoje chamados Primeiro e Segundo Samuel nas versões protestantes eram ali o Primeiro e o Segundo Livros dos Reis.Fontes: Easton: Samuel, Books of

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Ọmụmụ Samuel

1O nwere otu nwoke onye Zuf, si na Ramataim, nʼala ugwu ugwu Ifrem. Aha ya bụ Elkena nwa Jeroham, nwa Elihu, nwa Tohu, nwa Zuf, onye Ifrem. 2Elkena lụrụ ndị inyom abụọ, aha nke mbụ bụ Hana, ebe aha nke abụọ bụ Penina. Penina nwere ụmụ, ma Hana enweghị nwa.

3Kwa afọ, nwoke a na-esi nʼobodo ya gaa Shaịlo ife ofufe na ịchụrụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aja. Ọ bụ nʼebe ahụ ka ụmụ ndị ikom abụọ Elayị a na-akpọ Hofni na Finehaz, bụ ndị nchụaja Onyenwe anyị nọ. 4Nʼụbọchị ọbụla Elkena na-achụ aja ya, ọ na-ekenye Penina na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom ọtụtụ oke site nʼanụ o ji chụọ aja. 5Ma ọ na-enye Hana oke mmadụ abụọ, nʼihi na ọ hụrụ ya nʼanya, ọ bụ ezie na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya. 6Ma Penina na-eme ka obi jọọ Hana njọ karịa, site nʼikpasu ya iwe, nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ya. 7Ihe ndị a na-eme kwa afọ. Penina na-akwa Hana emo, na-achị ya ọchị oge niile ha gara nʼụlọ Onyenwe anyị, si otu a na-eme ka ọ na-akwa akwa, gharakwa iri nri. 8Mgbe Hana bidoro ịkwa akwa otu a, Elkena na-ajụ ya sị, “Hana, ọ bụ gịnị mere i ji na-akwa akwa? Gịnị mere ị naghị eri nri? Gịnị mere obi ji ajọ gị njọ? Ọ bụ na mụ adịghị gị mma karịa ụmụ ndị ikom iri nye gị?”

9Otu ụbọchị mgbe ha risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ na Shaịlo, Hana biliri ọtọ. Nʼoge a, Elayị onye nchụaja nọdụrụ ala nʼoche ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ Onyenwe anyị. 10Nʼọnọdụ obi mwute Hana kwara akwa, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. 11O kwere nkwa sị, “O! Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụrụ na ị ga-elekwasị anya na nhụju anya nke ohu gị nwanyị ma cheta m, ghara ichefu ohu gị nwanyị, ma nye ya nwa nwoke, mgbe ahụ, aga m enyeghachi ya Onyenwe anyị ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Agụba agakwaghị aga nʼisi ya mgbe ọbụla.”

12Mgbe ọ nọgidere na-ekpe ekpere nye Onyenwe anyị, Elayị nọ na-ele ya anya nʼọnụ. 13Ka Hana nọ na-ekpe ekpere nʼobi ya, naanị egbugbere ọnụ ya na-emegharị emegharị, ma enweghị onye na-anụ olu ya. Mgbe ahụ, Elayị chere nʼobi ya na ọ bụ nwanyị mmanya na-egbu. 14Elayị sịrị ya, “Ruo ole mgbe ka ị ga-akwụsị ịṅụbiga mmanya oke? Si nʼebe mmanya dị wezuga onwe gị!”

15Ma Hana zara sị ya, “Mba, onyenwe m, aṅụghị m mmanya ọbụla! Kama abụ m nwanyị obi ya dị ilu nke ukwuu. Anọ m na-ekwupụtara Onyenwe anyị ihe dị m nʼobi. 16Biko agụla ohu gị nwanyị dịka onye ajọ omume. Esi m nʼobi mwute na-akwasara Onyenwe anyị ụwa m.”

17Elayị zara sị ya, “Laa nʼudo, ka Chineke Izrel mezuoro gị dịka arịrịọ gị niile si dị.”

18Hana zara sị, “Ka m bụrụ onye si nʼaka gị nata ihuọma.” O jiri obi ụtọ laghachi, malitekwa iri nri ya. Ihu ya agbarụkwaghị ọzọ.

19Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri kpọọ isiala nʼihu Onyenwe anyị, mgbe ahụ, ha laghachiri nʼụlọ ha dị na Rema. Mgbe ha laruru, Elkena bakwuru nwunye ya Hana, Onyenwe anyị chetakwara ya. 20Mgbe oge ruru, o mere ka Hana tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gụrụ ya Samuel, nʼihi na ọ sịrị, “Arịrịọ m Onyenwe anyị maka ya.”

Hana edoo Samuel nsọ

21Mgbe di ya, bụ Elkena na ndị ezinaụlọ ya gara Shaịlo ịchụrụ Onyenwe anyị aja nke afọ ahụ, na ịchụkwa aja metụtara nkwa dị iche nke o kwere Onyenwe anyị, 22Hana esoghị ha, ọ gwara di ya, “Mgbe nwantakịrị a kwụsịrị ịṅụ ara, ka m duru ya ga chee ya nʼihu Onyenwe anyị, ọ ga-ebikwa nʼebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi.”

23Elkena bụ di ya sịrị ya, “Mee ihe ọbụla i chere kwesiri ekwesi. Nọdụ ruo mgbe ọ hapụrụ ịṅụ ara, ma ka Onyenwe anyị mezuo okwu ya.” Hana nọgidere nʼụlọ tutu ruo mgbe ọ zụlitere nwantakịrị ahụ, kwụsị ya ịṅụ ara.

24Mgbe ọ kwụsịrị nwantakịrị ahụ ịṅụ ara, nwantakịrị ahụ ka dị ntakịrị. Ma o duuru ya, jiri oke ehi gbara afọ atọ, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu karama mmanya, gaa nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Shaịlo. 25Mgbe ha ji oke ehi ahụ chụsịa aja, ha kpọtaara Elayị nwantakịrị ahụ. 26Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Onyenwe m, dịka ị si na-adị ndụ, ọ bụ m bụ nwanyị ahụ guzoro onwe ya nso nʼebe ị nọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị. 27Nʼihi nwa a ka m kpere ekpere, Onyenwe anyị emelara m ihe m rịọrọ nʼaka ya. 28Ma ugbu a, ana m enyeghachi ya Onyenwe anyị ka ọ bụrụ nke ya ndụ ya niile.” O fere Onyenwe anyị ofufe nʼebe ahụ.

Ilustração artística — interpretação, não registro histórico.

Você sabia?

A oração de Ana e o santuário em Siló

  • Siló, situada no território de Efraim, servia como o centro de adoração onde o tabernáculo havia sido estabelecido nos dias de Josué. Israelitas fiéis, como Elcana, faziam viagens anuais até lá para oferecer sacrifícios e adorar perante o santuário.Fontes: Shiloh · Hannah · o próprio texto bíblico
  • Elcana vivia em Ramataim-Zofim (também chamada de Ramá), na região montanhosa de Efraim. O distrito estava associado ao seu antepassado Zufe, um levita coatita cuja linhagem familiar havia se estabelecido naquele território.Fontes: Elkanah · Zuph · Ramathaim-zophim · o próprio texto bíblico
  • Eli, que observou Ana orando junto à entrada do santuário, era o sumo sacerdote e julgou Israel por quarenta anos. Ele foi o primeiro sumo sacerdote da linhagem de Itamar, o quarto filho de Arão, e seus filhos Hofni e Fineias também atuavam como sacerdotes em Siló.Fontes: Eli · Hannah · o próprio texto bíblico

Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.

Lugares deste capítulo

  • Shiloh · Hoje: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · versículos 3, 9, 24

Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).

Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
copyright © 2020 Biblica, Inc.
Language: Igbo
Contributor: Biblica, Inc.
This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA.
Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.”
Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows:
‎
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ‭ ‬‬
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
“Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya.
“Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission.‎
‎ You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA).
If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us.
This translation is made available to you under the terms of the
Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0.
You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that:
You include the above copyright and source information.
If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes.
If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original.
Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents.
For other uses, please contact the respective copyright owners.
Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19.
2023-04-12

Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org

Fale com a gente

Conte de onde você lê, como a Bíblia tem te ajudado ou o que podemos melhorar. Lemos todas as mensagens.