1 Reis 15
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toque num versículo para ver as referências cruzadas.
Ọchịchị eze Abija
1Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat. 2Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
3O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị. 4Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike. 5Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
6Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija. 7Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam. 8Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Asa, eze Juda
9Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda. 10Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
11Asa mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka Devid nna ya mere. 12O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere. 13Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn. 14Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile. 15O webatara nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
16Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile. 17Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda.
18Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị, 19“Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.”
20Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị. 21Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza. 22Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.
23Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi. 24Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Nadab, eze Izrel
25Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ. 26O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
27Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya. 28Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.
29Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo. 30Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.
31Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 32Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile.
Baasha, eze Izrel
33Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ. 34O mere ọtụtụ ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam, jeekwa ije nʼime otu mmehie ahụ nke Jeroboam dubara ndị Izrel ime.

Você sabia?
Reis de Judá e Israel
- Asa, o terceiro rei de Judá, reinou quarenta e um anos em Jerusalém e realizou grandes reformas religiosas. Ele removeu os ídolos pagãos da terra e destituiu sua avó Maaca da posição de rainha-mãe depois que ela fez um poste sagrado detestável, o qual Asa derrubou e queimou no vale de Cedrom.Fontes: o próprio texto bíblico · Asa · Kidron
- Para combater Baasa de Israel, que estava fortificando Ramá para bloquear Judá, o rei Asa enviou ouro e prata do templo e do palácio a Ben-Hadade, rei da Síria em Damasco. Quando Ben-Hadade atacou o norte de Israel, Baasa recuou para Tirza, permitindo que os homens de Asa desmontassem as fortificações de Ramá e usassem os materiais para edificar Geba e Mispá.Fontes: o próprio texto bíblico · Baasha · Ben-hadad · Ramah
- Depois de reinar apenas dois anos, Nadabe, filho de Jeroboão, foi assassinado durante um cerco militar a Gibetom por Baasa, da tribo de Issacar. Ao assumir o trono, Baasa destruiu toda a descendência de Jeroboão, cumprindo a profecia de Aías, o silonita.Fontes: o próprio texto bíblico · Nadab · Baasha
Notas escritas com auxílio de IA a partir de fontes abertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, domínio público) e revisadas antes de publicar.
Lugares deste capítulo
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículos 2, 4, 10
- City of David · 31.774, 35.236 · versículos 8, 24
- Kidron · Hoje: Kidron River · 31.780, 35.240 · versículo 13
- Damascus · 33.511, 36.306 · versículo 18
- Syria · Hoje: Aram · 33.511, 36.306 · versículo 18
- Dan · Hoje: Tel Dan · 33.249, 35.652 · versículo 20
- Shiloh · Hoje: Khirbet Seilun · 32.056, 35.290 · versículo 29
Só aparecem lugares com identificação de alta confiança (90% ou mais segundo as fontes acadêmicas reunidas pelo OpenBible). Mapa da época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa atual: © colaboradores do OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos e licença desta tradução
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fonte: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org