Apocalipsis 3
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Nzukọ dị nʼobodo Sardis
1“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya:
Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa.
Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ. 2Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m. 3Ya mere, cheta ihe ndị ahụ ị natara na nke ị nụrụ; rube isi nye ya, chegharịakwa. Ma ọ bụrụ na i tetaghị, aga m abịakwute gị dị ka onye ohi, ị gaghị amatakwa oge m ji bịakwute gị.
4Otu ọ dị, i nwere ụfọdụ mmadụ na Sardis ndị na-emerụbeghị uwe ha. Ha ga-eyiri uwe ọcha ma soro m jee ije nʼihi na ha bụ ndị kwesiri ekwesi. 5Onye ọbụla na-emeri emeri, ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dịka ha. Agaghị m ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, kama aga m ekwupụtakwa aha ahụ nʼihu Nna m na nʼihu ndị mmụọ ozi niile. 6Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ nsọ na-agwa nzukọ niile.
Nzukọ dị nʼobodo Filadelfia
7“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Filadelfia, sị ya:
Ndị a bụ okwu onye dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji ọtụghe igodo Devid, nke o ji emeghepụ ihe onye ọbụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọbụla na-apụghị imeghe.
8Amaara m ọrụ gị niile. Lee, edebela m nʼihu gị ọnụ ụzọ nke e meghere emeghe, nke onye ọbụla na-apụghị imechi. Amaara m na i nwere ike dị ntakịrị, ma i debere okwu m, ị gọnarịkwaghị aha m. 9Aga m eme ka ndị ahụ so na nzukọ ekwensu, bụ ndị na-asị na ha bụ ndị Juu ma ha abụghị, kama ha bụ ndị ụgha, aga m eme ka ha bịa kpọọ isiala nye gị, si otu a ghọta na ahụrụ m gị nʼanya. 10Ebe i sitere na ntachiobi sọpụrụ okwu m niile, aga m ekpuchi gị site nʼoke mkpagbu ahụ, nke ga-abịakwasị ụwa mgbe a ga-anwale ndị niile bi nʼime ya.
11Ana m abịa ọsịịsọ. Jidesienụ ihe unu nwere aka ike, ka onye ọbụla ghara ịnapụ gị okpueze gị. 12Ma onye ọbụla na-emeri emeri, ka m ga-eme ka ọ bụrụ ogidi nʼime ụlọnsọ Chineke m. Ọ gaghị esikwa nʼebe ahụ pụọ apụọ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nʼahụ, na aha obodo nsọ Chineke, nke bụ Jerusalem ọhụrụ ahụ si nʼeluigwe, ebe Chineke nọ na-arịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nʼihu ya. 13Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.
Nzukọ dị nʼobodo Laodisia
14“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Laodisia, sị ya:
Ndị a bụ okwu Amen, onye kwesiri ntụkwasị obi, na onye bụ ezi onyeama, bụrụkwa isi mmalite ihe niile Chineke kere.
15Amaara m ọrụ gị niile, na ị jụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ. Ọ gaara adị nnọọ mma ma asị na ị na-ajụ oyi ma ọ bụkwanụ na-ekpo ọkụ. 16Nʼihi nke a, ebe ị na-ajụghị oyi, i kpoghịkwa ọkụ, ihe ị dị bụ ṅaraṅara. Nʼihi ya, aga m esi nʼọnụ m gbụpụ gị. 17Nʼihi na ị na-asị, ‘abụ m ọgaranya, nwezuo ihe niile. Mkpa ihe ọbụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ. Ị bụ onye e kwesiri imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ. 18Ana m adụ gị ọdụ ka ịzụta ezigbo ọlaedo nʼaka m, bụ ọlaedo a nụchara anụcha nʼime ọkụ. Mgbe ahụ, ị ga-abụkwa ọgaranya nʼezie. Ị gaara esitekwa nʼaka m zụta akwa ọcha na-enweghị ntụpọ ka ị ghara ịgba ọtọ, ka ihere gharakwa ime gị. Ka ị zụrụkwa ezigbo ọgwụ ọrịa anya tee, ka ibido ịhụ ụzọ nke ọma.
19Ndị m hụrụ nʼanya ka m na-abara mba na-enyekwa ha ahụhụ. Ya mere, nwee ịnụ ọkụ nʼobi, chegharịakwa. 20Lee, ana m eguzo nʼọnụ ụzọ na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọbụla anụ olu m ma meghee ụzọ, aga m abata soro ya rikọọ ihe, ya onwe ya ga-esokwa m rie ihe.
21Onye ọbụla na-emeri emeri, ka mụ ga-enye ikike ka o soro m nọdụ nʼocheeze m. Ọ bụladị dịka m meriri sorokwa Nna m nọdụ nʼocheeze ya. 22Onye nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.”

¿Sabías que…?
Cartas a Sardis, Filadelfia y Laodicea
- El capítulo 3 de Apocalipsis reúne cartas a iglesias de tres ciudades de Asia Menor. Sardis, la metrópoli de Lidia, estaba a orillas del río Pactolo, al pie del monte Tmolo. Filadelfia, nombre que significa “amor fraternal”, quedaba a unas veinticinco millas al sureste de Sardis; Laodicea estaba junto al Lico, donde se encuentran Frigia y Lidia, a unas cuarenta millas al este de Éfeso.Fuentes: Sardis · Philadelphia · Laodicea · el propio texto bíblico
- Laodicea se llamó primero Dióspolis y luego Roas. Después recibió el nombre de Laodicea por Laodice, esposa de Antíoco II, rey de Siria, quien la reconstruyó. El Easton's Bible Dictionary (1897) la presenta como una de las ciudades más importantes y prósperas de Asia Menor y como un antiguo centro destacado del cristianismo; en la carta se dice que esa iglesia afirma ser rica, haberse enriquecido y no necesitar nada.Fuentes: Laodicea · el propio texto bíblico
- La carta a Filadelfia habla de una “sinagoga de Satanás” y de personas que dicen ser judías, pero a quienes llama mentirosas. Satanás significa “adversario” o “acusador”, y en el Nuevo Testamento el nombre se usa de manera intercambiable con el diablo.Fuentes: Satan · el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
- Sardis · 38.488, 28.040 · versículos 1, 4
- Philadelphia · Hoy: Alaşehir · 38.350, 28.517 · versículo 7
- Jerusalem · 31.777, 35.234 · versículo 12
- Laodicea · Hoy: Laodicea on the Lycus · 37.836, 29.108 · versículo 14
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org