Apocalipsis 14
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ · Toca un versículo para ver sus referencias cruzadas.
Nwa atụrụ ahụ na ndị a gbapụtara
1Elere m anya hụ Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo nʼugwu Zayọn. Ya na narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ahụ, bụ ndị e dekwasịrị aha ya na aha Nna ya nʼegedege ihu ha. 2Anụkwara m olu si nʼeluigwe na-ada dịka ụda mmiri si nʼime nkume na-asọpụta, maọbụ dịka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu m nụrụ dịka olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ. 3Narị puku mmadụ na iri puku mmadụ anọ na anọ ndị ahụ guzo, chee ocheeze ahụ, anụ anọ ahụ dị ndụ, na ndị okenye ahụ ihu, na-abụ abụ, ha na-abụ abụ ọhụrụ. Nke naanị ha bụ ndị a gbapụtara nʼụwa pụrụ ịmụta. 4Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ. 5Ọ dịkwaghị okwu ụgha ọbụla a hụrụ nʼọnụ ha. Ha bụkwa ndị na-enweghị ịta ụta.
Ndị mmụọ ozi atọ
6Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. 7O jiri oke olu kwuo sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto, nʼihi na oge ikpe ya eruola. Kpọọkwanụ isiala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri niile.”
8Mgbe ahụ mmụọ ozi nke abụọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “ ‘Ọ daala! Ọ daala, bụ Babilọn obodo ukwu ahụ,’ bụ nke mere ka mba niile ṅụọ mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.”
9Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọbụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ si nʼime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nʼegedege ihu maọbụ nʼaka ya, 10ha onwe ha, aghaghị isoro ṅụọ mmanya nke oke iwe Chineke, bụ nke a na-agwaghị agwa gbanye nʼime iko ọnụma ya. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nʼihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. 11Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. 12Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume nye ndị nsọ ya, bụ ndị nke Chineke na-erubere iwu ya isi, na-eguzosikwa ike nʼokwukwe ha nʼime Jisọs.”
13Anụkwara m olu nke si nʼeluigwe daa na-asị, dee ihe a nʼakwụkwọ, “Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị nwụrụ nʼime Onyenwe anyị site ugbu a gaa nʼihu.”
“E, ha ga-ezu ike site na ndọgbu niile nke ha dọgburu onwe ha, nʼihi na ọrụ ha rụrụ ga-eso ha,” ka Mmụọ Nsọ na-ekwu.
Oge iwe ihe ubi
14Elere m anya hụ otu igwe ọcha, nke onye nọdụrụ na ya dịka nwa nke mmadụ. O kpu okpueze e jiri naanị ọlaedo mee, jirikwa mma iwe ihe ubi dị nkọ, nʼaka ya. 15Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi sitere nʼụlọnsọ ukwu pụta, tikuo onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha sị, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nʼihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nʼụwa achaala nke ọma.” 16Ya mere, onye ahụ nọkwasịrị nʼigwe ọcha ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼime ụwa, ghọta ihe dị nʼụwa dịka ihe ubi.
17Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ. 18Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.” 19Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha. 20A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.

¿Sabías que…?
El Cordero en Sion, la caída de Babilonia y la cosecha
- En esta visión, el Cordero está de pie en el monte Sion con 144.000 que tienen su nombre y el nombre de su Padre escritos en la frente. El monte Sion era la colina suroriental de Jerusalén, una de las alturas sobre las que se construyó la ciudad; se elevaba 105 pies por encima del monte Moriah y estaba rodeado de valles profundos por todos lados excepto el norte. David se lo quitó a los jebuseos, construyó allí una ciudadela y un palacio, y el lugar llegó a conocerse como la ciudad de David.Fuentes: el propio texto bíblico · Mount Zion
- Un segundo ángel anuncia que ha caído la gran Babilonia, la que hizo beber a todas las naciones el vino de la pasión de su inmoralidad. Babilonia es la forma griega de Babel; el nombre semítico Babilu significa “La puerta de Dios”, y en las tablillas asirias significa “La ciudad de la dispersión de las tribus”. La ciudad estaba junto al Éufrates, unas 200 millas río arriba de la confluencia de ese río con el Tigris.Fuentes: el propio texto bíblico · Babylon
- El capítulo termina con dos cosechas. Uno semejante al Hijo del Hombre, con una corona de oro y sentado en una nube blanca, blande una hoz afilada, porque la cosecha de la tierra está madura. Otro ángel recoge las uvas maduras de la vid de la tierra y las echa en el gran lagar de la ira de Dios, pisado fuera de la ciudad.Fuentes: el propio texto bíblico
Notas escritas con ayuda de IA a partir de fuentes abiertas (Theographic Bible Metadata, CC BY-SA 4.0; Easton’s Bible Dictionary, dominio público) y revisadas antes de publicarse.
Lugares de este capítulo
Solo aparecen lugares identificados con alta confianza (90 % o más según las fuentes académicas reunidas por OpenBible). Mapa de la época: DARE (Digital Atlas of the Roman Empire), CC BY 4.0; mapa actual: © colaboradores de OpenStreetMap; lugares: OpenBible.info (CC BY 4.0).
Créditos y licencia de esta traducción
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ The Holy Bible in the Igbo language of Nigeria: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ copyright © 2020 Biblica, Inc. Language: Igbo Contributor: Biblica, Inc. This work is made available under the Creative Commons Attribution-ShareAlike 4.0 International License (CC BY-SA). To view a copy of this license, visit http://creativecommons.org/licenses/by-sa/4.0 or send a letter to Creative Commons, PO Box 1866, Mountain View, CA 94042, USA. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc., and use of the Biblica® trademark requires the written permission of Biblica, Inc. Under the terms of the CC BY-SA license, you may copy and redistribute this unmodified work as long as you keep the Biblica® trademark intact. If you modify a copy or translate this work, thereby creating a derivative work, you must remove the Biblica® trademark. On the derivative work, you must indicate what changes you have made and attribute the work as follows: “The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.” Notice of copyright must appear on the title or copyright page of the work as follows: Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020 Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. “Biblica” bụ akara e ji mara ụlọ ọrụ a, nke edebanyere dịka iwu si kwado nʼụlọ ọrụ dị nʼobodo United States, ebe a na-enye akara a na ikike maka azụm ahịa ndị Biblica, Inc. Ọ bụ ha ka e nyere ikike idenye ya. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc. Used with permission. You must also make your derivative work available under the same license (CC BY-SA). If you would like to notify Biblica, Inc. regarding your translation of this work, please contact us at https://open.bible/contact-us. This translation is made available to you under the terms of the Creative Commons Attribution Share-Alike license 4.0. You have permission to share and redistribute this Bible translation in any format and to make reasonable revisions and adaptations of this translation, provided that: You include the above copyright and source information. If you make any changes to the text, you must indicate that you did so in a way that makes it clear that the original licensor is not necessarily endorsing your changes. If you redistribute this text, you must distribute your contributions under the same license as the original. Pictures included with Scriptures and other documents on this site are licensed just for use with those Scriptures and documents. For other uses, please contact the respective copyright owners. Note that in addition to the rules above, revising and adapting God's Word involves a great responsibility to be true to God's Word. See Revelation 22:18-19. 2023-04-12
Fuente: http://ebible.org/ibo/ · eBible.org